bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Numbers 4
Numbers 4
Igbo 2006
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 5 →
1
Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,
2
Guta ọnu-ọgugu umu Kohat site n'etiti umu Livai, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,
3
site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ije ozi n'ulo-ikwū nzute.
4
Nka bu òfùfè umu Kohat n'ulo-ikwū nzute, bú ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile:
5
na nbuli-ije nke ọmuma-ulo-ikwū Eron gābà kwa nime, ya na umu-ya ndikom, ha gākwuda ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi ahu, were ya kpuchie ib͕e ihe-àmà ahu,
6
tiye kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal n'elu ya, b͕akwasi kwa ákwà anunu anunu n'elu, tiye kwa nkpa-n'aka-ya abua nime
7
N'elu table nke irum ka ha gāb͕akwasi ákwà anunu, tiye kwa n'elu ya afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na ọkwa-ya nile, na iko nile nke nwusi àjà-ihe-ọṅuṅu: achicha anētiye mb͕e dum gādi kwa n'elu ya:
8
ha gāb͕akwasi kwa n'elu ha ákwà uhie, were kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal kpuchie ya, ha gētiye kwa nkpa-n'aka-ya abua nime.
9
Ha gēwere kwa ákwà anunu, kpuchie ihe-idọba-oriọna nke ihe ahu nēnye ìhè, na oriọna-ya nile, na nkpa-ya nile, na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile, na ihe-manu-ya nile, nke ha were jere ya ozi:
10
ha gētiye kwa ya na ihe-ya nile nime ihe-nkpuchi akpukpọ seal, tukwasi ya n'ihe eji bū ya
11
Ọ bu kwa n'elu ebe-ichu-àjà ọla-edo ahu ka ha gāb͕akwasi ákwà anunu, were kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal kpuchie ya, tiye kwa nkpa-n'aka-ya abua nime:
12
ha gēwere kwa ihe nile nke ije-ozi ahu, nke ha ji je ozi n'ebe nsọ ahu, tiye ha nime ákwà anunu, were kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal kpuchie ha, tukwasi ha n'ihe eji bū ha.
13
Ha gēkpopu kwa ntu n'ebe-ichu-àjà, b͕akwasi n'elu ya ákwa ododo:
14
ha gētiye kwa n'elu ya ihe nile ya, nke ha ji je ozi n'akuku ya, bú ihe-igu-ọku-ya nile, na ndudu-ya nile, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya, ihe nile nke ebe-ichu-àjà ahu; ha gāb͕akwasi kwa n'elu ya ihe-nkpuchi akpukpọ seal, tinye kwa nkpa-n'aka-ya abua nime.
15
Ma mb͕e Eron na umu-ya ndikom kpuchisiri ebe nsọ ahu, na ihe nile nke ebe nsọ ahu, nime nbuli-ije nke ọmuma-ulo-ikwū; emesia, umu Kohat gābia ibū ya: ma ha agaghi-emetu ebe nsọ ahu aka, ha we ghara inwu. Ihe ndia bu ibu umu Kohat n'ulo-ikwū nzute.
16
Ihe-nlekọta Eleeza nwa Eron onye-nchu-àjà bu manu nke ihe nēnye ìhè, na ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na onyinye-inata-iru-ọma anēnye mb͕e dum, na manu nke otite-manu ahu, ihe-nlekọta nke ebe-obibi ahu nile, na nke ihe nile di nime ya, bú nime ebe nsọ ahu na nime ihe-ya nile.
17
Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,
18
Unu ebipula ebo nke ab͕uru nile nke ndi Kohat n'etiti ndi Livai:
19
ma menu ha nka, ka ha we di ndu, ghara inwu, mb͕e ha nābiaru ebe nsọ ahu kachasi ebe nsọ nile nso: Eron na umu-ya ndikom gābata, do ha, nwoke ọ bula n'òfùfè-ya na n'ibu- ya:
20
ma ha agaghi-abata ihu ebe nsọ ahu ọbuná na obere oge, ka ha ghara inwu.
21
Jehova we gwa Moses okwu, si,
22
Guta kwa ọnu-ọgugu umu Giashon. ha onwe-ha, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ab͕uru nile ha si di;
23
site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri ka i gāgukọta ha; onye ọ bula nke nābà ibu agha, ifè òfùfè n'ulo-ikwū nzute.
24
Nka bu òfùfè nke ab͕uru nile nke ndi Giashon, ifè òfùfè na ibū ibu:
25
ha gēbu kwa ákwà-nkwuba nile nke ebe-obibim, na ulo-ikwū nzute, ihe-nkpuchi-ya, na ihe-nkpuchi akpukpọ seal nke dikwasiri ya n'elu, na ákwà-nkwuchi di n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute;
26
na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ákwà-nkwuchi di n'onu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke ogige ahu, nke di n'akuku ebe-obibi ahu na n'akuku ebe-ichu-àjà buruburu, na udọ̀ nile ha, na ihe nile nke òfùfè-ha, na ihe ọ bula agēmere ha, ha gēfè kwa òfùfè nime ya.
27
N'okwu-ọnu Eron na umu-ya ndikom ka òfùfè nile nke umu ndi Giashon gādi, n'ibu-ha nile, na n'òfùfè-ha nile: unu gēme kwa ka ha nēlekọta ibu-ha nile n'ihe-ndebe-ha.
28
Nka bu òfùfè nke ab͕uru nile nke umu ndi Giashon n'ulo-ikwū nzute: ihe-ndebe-ha gādi n'aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà.
29
Umu Merari, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ka i gāgukọta kwa ha;
30
site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri ka i gāgukọta ha, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè nke ulo-ikwū nzute.
31
Nka bu kwa ihe-ndebe nke ibu-ha, dika òfùfè-ha nile si di n'ulo-ikwū nzute; ibo nile nke ebe-obibim, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile;
32
na ide nile nke ogige ahu buruburu, na ukwu nile ha, na ǹtú nile ha, na udọ̀ nile ha, tiyere ihe-ha nile, tiyere kwa òfùfè-ha nile: n'aha n'aha ka unu gāgukọta ihe nke ihe-ndebe nke ibu-ha.
33
Nka bu òfùfè nke ab͕uru nile nke umu Merari, dika òfùfè-ha nile si di, n'ulo-ikwū nzute, n'aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà.
34
Moses na Eron na ndi-isi nzukọ Israel we gukọta umu ndi Kohat dika ab͕uru nile ha si di, na dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,
35
site n'onye b͕ara orú arọ na iri gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè n'ulo-ikwū nzute:
36
ndi-ha agukọtara agukọta, dika ab͕uru nile ha si di, di nnù isi na ọgu iri-na-asa na iri.
37
Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile nke ndi Kohat, onye ọ bula nke nēfè òfùfè n'ulo-ikwū nzute, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses.
38
Ndi agukọtara agukọta nke umu Giashon, dika ab͕uru nile ha si di, na dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,
39
site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè n'ulo-ikwū nzute,
40
ọbuná ndi-ha agukọtara agukọta, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, di nnù isi na ọgu iri-na-otù na iri.
41
Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile nke umu Giashon, onye ọ bula nke n-efè òfùfè n'ulo-ikwū nzute, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova.
42
Ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile nke umu Merari, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,
43
site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè n'ulo-ikwū nzute,
44
ọbuná ndi-ha agukọtara agukọta, dika ab͕uru nile ha si di, di nnù asatọ.
45
Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile umu Merari, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses.
46
Ndi nile agukọtara agukọta nke ndi Livai, ndi Moses na Eron na ndi-isi Israel gukọtara, dika ab͕uru nile ha si di, na dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,
47
site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābà ifè òfùfè, na òfùfè nke ibu n'ulo-ikwū nzute,
48
ọbuná ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù na otù nnù na ọgu iteghete.
49
N'okwu-ọnu Jehova ka agukọtara ha n'aka Moses, nwoke ọ bula dika ibu-ya si di: bú ndi-ya agukọtara agukọta, dika Jehova nyere Moses iwu.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36