bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Numbers 32
Numbers 32
Igbo 2006
← Chapter 31
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 33 →
1
Ma umu Reuben na umu Gad nwere ọtutu anu-ulo, ha riri nne nke-uku: ha we hu ala Jeza, na ala Gilead, ma, le, ebe ahu bu ebe anu-ulo;
2
umu Gad na umu Reuben we bia, gwa Moses, gwa kwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gwa kwa ndi-isi nzukọ Israel, okwu, si,
3
Atarot, na Dibon, na Jeza, na Nimra, na Heshbon, na Eleale, na Seban, na Nebo, na Beon,
4
bú ala nke Jehova tib͕uru n'iru nzukọ Israel, ala anu-ulo ka ọ bu, ma ndi-orù-gi nwere anu-ulo.
5
Ha si kwa, Ọ buru na ayi ahutawo amara n'iru gi, ka enye ndi-orù-gi ala nka ibu ihe-onwunwe; emela ka ayi gabiga Jọdan.
6
Moses we si umu Gad na umu Reuben, Umu-nne-unu, hà gābà n'agha ahu, unu onwe-unu ewe nọdu n'ebe a?
7
Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu nēme ka obi umu Israel ju igabiga ba n'ala ahu Jehova nyeworo ha?
8
Otú a ka nna-unu-hà mere, mb͕e m'siri n'ala Kedesh-banea ziga ha ihu ala ahu.
9
Ha we rigorue ndagwurugwu Eshkol, hu ala ahu, we me ka obi umu Israel si, É-è, si na ha agaghi-abà n'ala ahu nke Jehova nyere ha-ri.
10
Iwe Jehova we di ọku n'ubọchi ahu, Ọ we ṅua iyi, si,
11
Ndikom ahu ndi nēsi n'ala Ijipt rigoputa, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ha agaghi-ahu ala ahu ma-ọli nke M'ṅuru Abraham, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, iyi inye ha; n'ihi na ha esozughm n'azu:
12
ma ọ bu nání Keleb nwa Jefune, bú onye Kenizait, na Joshua nwa Nun: n'ihi na ha esozuwo Jehova n'azu.
13
Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we me ka ha nāṅaghari n'ọzara ọgu arọ abua, rue mb͕e ọb͕ọ ahu nile, nke nēme ihe ọjọ n'anya Jehova, gwusiri.
14
Ma, le, unu ebiliwo n'ọnọdu nna-unu-hà, nmuba nke ndikom, bú ndi-nmehie, iwere idi-ọku ọzọ tukwasi n'idi-ọku iwe Jehova megide Israel.
15
Mb͕e unu gēsi n'iso Ya n'azu laghachi, Ọ gārapu kwa ha n'ọzara nka; unu gēbibi kwa ndi nka nile.
16
Ha we biakute ya nso, si, Ogige ìgwé ewu na aturu ka ayi gēwuru anu-ulo-ayi n'ebe a, wu-kwa-ra umu-ntakiri-ayi obodo:
17
ma ayi onwe-ayi gējikere onwe-ayi je ọsọsọ n'iru umu Israel, rue mb͕e ayi gēme ka ha ba n'ebe-ha: ma umu-ntakiri-ayi gēbi n'obodo ndia ewusiri ike n'ihi ndi bi n'ala ahu.
18
Ayi agaghi-alata n'ulo-ayi, rue mb͕e umu Israel ketaworo, nwoke ọ bula ihe-nketa-ya.
19
N'ihi na ayi agaghi-esoro ha keta si n'ofè Jọdan we gaba n'iru, n'ihi na ihe-nketa-ayi abiaruwo ayi aka n'ofè Jọdan nka n'uzọ ọwuwa-anyanwu.
20
Moses we si ha, Ọ buru na unu eme ihe a; ọ buru na unu ejikere onwe-unu n'iru Jehova ibu agha,
21
ọ buru kwa na onye ọ bula nime unu nke ejikere agabiga Jọdan n'iru Jehova, rue mb͕e Ọ gānapu ndi-iro-Ya ala-ha n'iru Ya,
22
ewe buda ala ahu n'iru Jehova: emesi kwa unu gālata, we buru ndi ikpe nāmaghi site n'aka Jehova, site kwa n'aka Israel; ala nka ewe buru unu ihe-onwunwe n'iru Jehova.
23
Ma ọ buru na unu emeghi otú a, le, unu emehiewo megide Jehova: mara-kwa-nu nmehie-unu, na ọ gāchọputa unu.
24
Unu wuere onwe-unu obodo ufọdu ebe umu-ntakiri-unu gēbi, wu-kwa-ra ìgwé ewu na aturu-unu ogige; me-kwa-nu ihe nēsi n'ọnu-unu puta.
25
Umu Gad na umu Reuben we gwa Moses okwu, si, Ndi-orù-gi gēme dika onye-nwem nēnye iwu.
26
Umu-ntakiri-ayi, na ndinyom-ayi, na anumanu-ayi, na anu-ulo-ayi nile, gānọ n'ebe ahu n'obodo nile nke Gilead:
27
ma ndi-orù-gi gāgabiga, onye ọ bula nke ejikere iso usu-ndi-agha, n'iru Jehova ibu agha, dika onye-nwem nēkwu.
28
Moses we nye Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi nke ndi bu nna ebo nile nke umu Israel, iwu bayere ha.
29
Moses we si ha, Ọ buru na umu Gad na umu Reuben eso unu gabiga Jọdan, onye ọ bula nke ejikere ibu agha, n'iru Jehova, ewe buda ala ahu n'iru unu; unu gēnye kwa ha ala Gilead ahu, ibu ihe-onwunwe:
30
ma ọ buru na ha esoghi unu gabiga na njikere, ha gēketa kwa ala n'etiti unu n'ala Kenean.
31
Umu Gad umu Reuben we za, si, Okwu nke Jehova gwaworo ndi-orù-gi, otù a ka ayi gēme
32
Ayi onwe-ayi gāgabiga na njikere n'iru Jehova ba n'ala Kenean, ọ bu kwa n'aka-ayi ka ihe-onwunwe nke ihe-nketa-ayi gādi n'ofè Jọdan.
33
Moses we nye ha, bú umu Gad, na umu Reuben, na nkera ebo Manase nwa Josef, ala-eze Saihon, bú eze ndi-Amorait, na ala-eze Og, bú eze Beshan, ala ahu, dika obodo-ya nile si di n'ókè-ala nile ha, bú obodo nile nke ala ahu buruburu.
34
Umu Gad we wue Dibon, na Atarot, na Aroea;
35
na Atrot-shofan, na Jeza, na Jọgbeha;
36
na Bet-nimra, na Bet-haran: bú obodo ewusiri ike, na ogige ìgwè ewu na aturu.
37
Umu Reuben wu-kwa-ra Heshbon na Eleale, na Kiriataim;
38
na Nebo, na Beal-meon, (ma ab͕anwere aha-ha,) na Sibma: ha we were aha kpọkwasi obodo ha wuru aha.
39
Umu Makia nwa Manase we je Gilead, were ya, napu ya n'aka ndi-Amorait ndi bi nime ya.
40
Moses we were Gilead nye Makia nwa Manase; ọ we biri nime ya.
41
Jaia nwa Manase we je were ebe-obibi nile ha, we kpọ ha Havot-jaia.
42
Noba we je were Kenat, na umu-obodo-ya, we kpọ Noba, n'aha nke ya.
← Chapter 31
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 33 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36