bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Numbers 16
Numbers 16
Igbo 2006
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 17 →
1
Ma Kora, nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livai, ya na Detan na Abairam, umu Eliab, na On, nwa Pelet, bú umu Reuben, chiri ndikom:
2
ha we bilie n'iru Moses, ha na ndikom ufọdu ndi sitere n'umu Israel, ọgu ndi isi nzukọ iri-na-abua na iri, ndi akpọrọ ibia na nzute, ndikom amara aha-ha:
3
ha we kpọkọta onwe-ha imegide Moses na imegide Eron, si ha, O zuworo unu, n'ihi na nzukọ Israel nile, ha nile n'otù n'otù, di nsọ, ọ bu kwa n'etiti ha ka Jehova nọ: ọ̀ bu kwa gini mere unu nēbuli onwe-unu kari nkpọkọta nke Jehova?
4
Moses we nu ya, we da kpue iru-ya n'ala:
5
o we gwa Kora, gwa kwa nzukọ-ya nile, okwu, si, N'ututu Jehova gēme ka amara ndi O nwere, na onye di nsọ, na onye Ọ gēme ka ọ biarue nso Ya: Onye Ọ gārọputa, onye ahu ka Ọ gēme kwa ka ọ biarue nso Ya.
6
Menu nka; chirinu n'onwe-unu ihe-igu-ọku, Kora, na nzukọ-ya nile;
7
tiye-kwa-nu ọku nime ha, tukwasi kwa n'elu ha ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova echi: ọ gēru kwa na nwoke ahu nke Jehova gārọputa, onye ahu bu onye nsọ: o zuworo unu, umu Livai.
8
Moses we si Kora, Biko, nurunu, umu Livai:
9
Ọ̀ bu unu ihe ntà na Chineke nke Israel akpawo ókè n'etiti unu na nzukọ Israel, ime ka unu biarue nso Ya; ifè òfùfè nke ebe-obibi Jehova, na iguzo n'iru nzukọ ahu ijere ha ozi;
10
Ọ we me ka i biarue nso, gi na umu-nne-gi niile, bú umu Livai? ùnu nācho kwa ọlu nchu-àjà?
11
N'ihi ya gi onwe-gi na nzukọ-gi nile bu ndi nēzukọ imegide Jehova: ma Eron, gini ka ọ bu na unu nātamu ntamu megide ya?
12
Moses we ziga ikpọ Detan na Abairam, bú umu Eliab: ha we si, Ayi agaghi-arigo:
13
ọ̀ bu ihe ntà na i mewo ka ayi si n'ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya rigoputa, ime ka ayi nwua n'ọzara nka, ma i ghaghi ime kwa onwe-gi onye-isi-ayi?
14
Ọzọ kwa, ọ bughi ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nēru nime ya ka i meworo ka ayi ba, i nyeghi kwa ayi ihe-nketa, bú ubi na ubi-vine: ì gārukpọ anya ndikom ndia? ayi agaghi-arigo.
15
Moses we we iwe di ọku nke-uku, ọ we si Jehova, Echela onyinye-inata-iru-ọma-ha iru: ọ dighi otù inyinya-ibu m'naraworo n'aka-ha, ọ dighi kwa otù onye nime ha M'mejọworo.
16
Moses we si Kora, Gi onwe-gi na nzukọ-gi nile nọ n'iru Jehova, gi, na ha, na Eron, echi:
17
chiri-kwa-nu, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, tiye kwa ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ha, weta kwa-nu ha nso n'iru Jehova, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, ọgu ihe-igu-ọku iri-na-abua na iri; gi onwe-gi kwa, na Eron, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya.
18
Ha we chiri, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, tiye ọku n'elu ha, tukwasi kwa ha ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, we guzo n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ha na Moses na Eron.
19
Kora we kpọkọta nzukọ Israel nile megide ha rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute: ewe me ka nzukọ ahu nile hu ebube Jehova anya.
20
Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,
21
Kewapunu onwe-unu n'etiti nzukọ nka, ka M'we me ka ha gwusia dika n'otù ntabi-anya.
22
Ha we da kpue iru-ha n'ala, si, Chineke, bú Chineke nke mọ nile na anu-aru nile, bú madu, nwere, asi na otú nwoke emehie, Ì gēwesa kwa nzukọ a nile iwe?
23
Jehova we gwa Moses okwu, si,
24
Gwa nzukọ Israel okwu, si, Sinu na buruburu ebe-obibi nke Kora na Detan na Abairam rigo.
25
Moses we bilie, jekuru Detan na Abairam; ndi-okenye Israel we so ya.
26
o we gwa nzukọ Israel okwu, si, Biko, sinu n'ulo-ikwū ndikom ndia, bú ndi nēmebi iwu, wezuga onwe-unu, unu emetu-kwa-la ihe ọ bula ha nwere, ka ewe ghara ikpochapu unu nime nmehie-ha nile.
27
Ha we si n'ebe-obibi nke Kora na Detan na Abairam buruburu rigo: Detan na Abairam we puta, guzo onwe-ha n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ha, ha na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ntakiri-ha.
28
Moses we si, Na nka ka unu gāmara na Jehova ezitewom ime omume ndia nile; n'ihi na ha esiteghi n'obim.
29
Ọ buru na ọnwu dika ọnwu madu nile ka ndia gānwu, ọ buru kwa na ọ bu nleta madu nile ka aga eleta ha; Jehova eziteghm.
30
Ma ọ buru na ihe-òkìkè ọhu ka Jehova gēkè, ala ewe saghepu ọnu-ya, loda ha, ha na ihe nile ha nwere, ha we rida na ndu rue ala-mọ; unu gāmara kwa na ndikom ndia elelìwo Jehova.
31
O rue, mb͕e o kwubiri okwu ndia nile, na ala nke di n'okpuru ha b͕awara:
32
ala we saghe ọnu-ya, loda ha, na ulo nile ha, na madu nile Kora nwere, na àkù-ha nile.
33
Ha we rida na ndu rue ala-mọ, ha onwe-ha na ihe nile ha nwere: ala we mechie n'elu ha, ha we si n'etiti nkpọkọta ahu la n'iyì.
34
Israel nile ndi nọ ha buruburu we b͕alaga n'olu ákwá-ha: n'ihi na ha siri, Ka ala we ghara iloda ayi.
35
Ọku we si n'ebe Jehova nọ puta, ripia ọgu ndikom iri-na-abua na iri ahu nēweta nso ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
36
Jehova we gwa Moses okwu, si,
37
Gwa Eleeza nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, ka o si n'etiti nsure-ọku ahu chilie ihe-igu-ọku ahu, gi kposa kwa ọku ahu n'akuku ahu; n'ihi na ha di nsọ;
38
bú ihe-igu-ọku nke ndi-nmehie ndia ndi megidere nkpuru-obi-ha, ka ewere kwa ha kpu mbadamba ihe ibu ihe-nmachita diri ebe-ichu-àjà: n'ihi na ha wetara ha nso n'iru Jehova, ha di kwa nsọ: ha gābu-kwa-ra umu Isael ihe-iriba-ama.
39
Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we chiri ihe-igu-ọku ọla ahu, nke ndi ahu esurere ọku wetara nso, ha we tisa ha ka ha buru ihe-nmachita diri ebe-ichu-àjà:
40
iburu umu Israel ihe-ncheta, ka nwoke ala ọzọ onye nēsiteghi na nkpuru Eron, we ghara ibia nso isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova; ka ọ ghara idi ka Kora, di kwa ka nzukọ-ya: dika Jehova gwara ya okwu n'aka Moses.
41
Ma nzukọ nile nke umu Israel tamuru ntamu n'echi-ya megide Moses megide kwa Eron, si, Unu onwe-unu emewo ka ndi nke Jehova nwua.
42
O rue, mb͕e akpọkọtara nzukọ ahu megide Moses megide kwa Eron, na ha chere iru n'ulo-ikwū nzute: ma, le, igwe-oji ahu kpuchiri ya, ewe hu ebube Jehova.
43
Moses na Eron we bia n'iru ulo-ikwū nzute.
44
Jehova we gwa Moses okwu, si,
45
Sinu n'etiti nzukọ a bilie, ka M'we me ka ha gwusia dika n'otù ntabi-anya. Ha we da kpue iru-ha n'ala.
46
Moses we si Eron, Were ihe-igu-ọku-gi, tiye ọku n.elu-ya sitere n'elu ebe-ichu-àjà, tukwasi kwa ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, būru ya jekuru nzukọ Israel ngwa ngwa, kpuchiere ha nmehie-ha; n'ihi na iwe ahu esiwo n.iru Jehova puta; ihe-otiti ahu amalitewo.
47
Eron we were dika Moses kwuru, b͕abà n'etiti nkpọkọta ahu; ma, le, ihe-otiti ahu amalitewo n'etiti ndi Israel: ọ we tiye ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ, we kpuchiere ndi ahu nmehie-ha.
48
Ọ we guzo n'etiti ndi nwuru anwu na ndi di ndu, ewe b͕ochie ihe-otiti ahu.
49
Ma ndi nwuru anwu n'ihe-otiti ahu di orú nnù na nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-ise, nāgughi ndi nwuru anwu n'okwu Kora.
50
Eron we laghachikuru Moses rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute: ewe b͕ochie ihe-otiti ahu.
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 17 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36