bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Numbers 3
Numbers 3
Igbo 2006
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 4 →
1
Ma ndia bu osuso-ọmumu nile nke Eron na Moses n'ubọchi Jehova gwara Moses okwu n'ugwu Sainai.
2
Ndia bu kwa aha umu-ndikom Eron;ọkpara-ya, bú Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.
3
Ndia bu aha nke umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà ndi etere manu, ndi ọ mejuru aka ibu ndi-nchu-àjà.
4
Nedab na Abaihu we nwua n'iru Jehova, mb͕e ha wetara nso ọku ala ọzọ n'iru Jehova n'ọzara Sainai, ha enweghi kwa nwa; Eleeza na Itama we buru ndi-nchu-àjà n'iru Eron, bú nna-ha.
5
Jehova we gwa Moses okwu, si,
6
Me ka ebo Livai biaru nso, guzo kwa ha n'iru Eron, bú onye-nchu-àjà, ka ha we jere ya ozi.
7
Ha gēdebe kwa ihe-ndebe-ya na ihe-ndebe nke nzukọ Israel nile n'iru ulo-ikwū nzute, ifè òfùfè nke ebe-obibim.
8
Ha gēdebe kwa ihe nile nke ulo-ikwū nzute, na ihe-ndebe nke umu Israel, ifè òfùfè nke ebe-obibim.
9
I gēwere kwa ndi Livai nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom: ndi enyesiworo aha ha nile site n'etiti umu Israel ka ha bu.
10
I gēwere kwa Eron na umu-ya ndikom ka ha buru ndi-nlekọta, ha gēdebe kwa ọlu-nchu-àjà-ha: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.
11
Jehova we gwa Moses okwu, si,
12
Ma Mu onwem, le, esiwom n'etiti umu Israel were ndi Livai n'ọnọdu nwa ọ bula eburu uzọ mu nke nēmeghe àkpà nwa n'etiti umu Israel; ndi Livai gābu kwa ihe M'nwere:
13
n'ihi na Mu nwe nwa ọ bula eburu uzọ mu; n'ubọchi M'tib͕uru umu nile eburu uzọ mu n'ala Ijipt ka M'doro umu nile eburu uzọ mu n'Israel nsọ nye onwem, ma madu ma anumanu: nkem ka ha bu; Mu onwem bu Jehova.
14
Jehova we gwa Moses okwu n'ọzara Sainai, si,
15
Gukọta umu Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ab͕uru nile ha si di; nwoke ọ bula site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru ka i gāgukọta ha.
16
Moses we gukọta ha n'okwu-ọnu Jehova, dika enyere ya iwu.
17
Ndia bu kwa umu-ndikom Livai n'aha-ha; Giashon, na Kohat, na Merari.
18
Ndia bu kwa aha umu-ndikom Giashon dika ab͕uru nile ha si di; Libni na Shimai.
19
Umu-ndikom Kohat kwa dika ab͕uru nile ha si di; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel.
20
Umu-ndikom Merari kwa dika ab͕uru nile ha si di; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru ndi Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.
21
Nke Giashon bu ab͕uru ndi Libni, na ab͕uru ndi Shimai: ndia bu ab͕uru ndi Giashon.
22
Ndi-ha agukọtara agukọta, n'ọnu-ọgugu ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, ndi-ha águkotara agukọta di nnù iri-na-asatọ na ọgu iri-na-ise.
23
Ab͕uru abua nke ndi Giashon nāma ulo-ikwū-ha n'azu ebe-obibi ahu chere iru n'Ọdida-anyanwu.
24
Onye-isi ulo nna ndi Giashon nwere bu Eliasaf nwa Lael.
25
Ihe-ndebe nke umu-ndikom Giashon n'ulo-ikwū nzute bu ebe-obibi na Ulo-ikwū, na ihe-nkpuchi-ya, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute,
26
na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ ogige, nke di n'akuku ebe-obibi, na n'akuku ebe-ichu-àjà buruburu, na udọ̀-ya nile bayere òfùfè-ya nile.
27
Nke Kohat bu ab͕uru ndi Amram, na ab͕uru ndi Izha, na Ab͕uru ndi Hebron, na aburu ndi Uziel: ndia bu ab͕uru ndi Kohat.
28
N'ọnu-ọgugu ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, ha di orú nnù na otù nnù ọgu iri, nēdebe ihe-ndebe nke ebe nsọ ahu.
29
Ab͕uru nile nke umu Kohat nāma ulo-ikwū-ha n'isi ebe-obibi ahu chere iru na Ndida.
30
Onye-isi ulo nna ab͕uru ndi Kohat nwere bu Elizafan nwa Uziel.
31
Ihe-ndebe-ha bu ib͕e ahu, na table ahu, na ihe-idọba-oriọna, na ebe-ichu-àjà abua, na ihe nile nke ebe nsọ ahu nke ha ji je ozi na ákwà-nkwuchi ahu, na òfùfè-ya nile.
32
Onye-isi nke ndi-isi nke ndi Livai bu Eleeza nwa Eron onye-nchu-àjà, ọ nwere nlekọta ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe nsọ ahu.
33
Nke Merari bu ab͕uru ndi Mahli, na ab͕uru ndi Mushi: ndia bu ab͕uru Merari.
34
Ndi-ha agukọtara agukọta, n'ọnu-ọgugu ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, di nnù iri-na-ise na ọgu iri.
35
Onye-isi ulo nna nke ab͕uru abua Merari nwere bu Zuriel nwa Abihail: ha nāma ulo-ikwū-ha n'isi ebe-obibi ahu chere iru n'Ugwu.
36
Nlekọta nke ihe-ndebe nke umu Merari bu ibo nile nke ebe-obibi ahu, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na akwa ya nile, na ihe-ya nile, na òfùfè-ya nile:
37
na ide nile nke ogige ahu buruburu, na ukwu nile ha, na ǹtú nile ha, na udọ̀ nile ha.
38
Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'iru ebe obibi ahu chere iru n'Iru-anyanwu, n'iru ulo-ikwū nzute chere iru n'ọwuwa-anyanwu, bu Moses, na Eron na umu-ya ndikom, nēdebe ihe-ndebe nke ebe nsọ ahu, bú ihe-ndebe nke umu Israel; onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.
39
Ndi nile agukọtara agukọta nke ndi Livai, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova, dika ab͕uru nile ha si di, ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na ise.
40
Jehova we si Moses, Gukọta umu-ndikom nile eburu uzọ muru umu Israel, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, guta kwa ọnu-ọgugu aha-ha.
41
I gēwe-kwa-ram ndi Livai (Mu onwem bu Jehova) n'ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel; na anu-ulo ndi Livai n'ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n'etiti anu-ulo umu Israel.
42
Moses we gukọta umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel, dika Jehova nyere ya iwu.
43
Ndikom nile eburu uzọ mu, n'onu-ọgugu aha, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-ise na ọgu iri-na-atọ na iri na atọ.
44
Jehova we gwa Moses okwu, si,
45
Were ndi Livai n'ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel, were kwa anu-ulo ndi Livai n'ọnọdu anu-ulo-ha: ndi Livai gābu kwa ihe M'nwere; Mu onwem bu Jehova
46
Ma ndi anāb͕aputa, bú ọgu madu iri-na-atọ na madu iri na atọ ahu sitere na ndi eburu uzọ mu nke umu Israel, ndi eji ka ndi Livai n'ọnu-ọgugu,
47
n'aka-ha ka i gānara shekel ise shekel ise n'isi n'isi; dika shekel nke ebe nsọ ahu si di ka i gēwere ha (shekel bu orú gerah):
48
i gēnye kwa Eron, nye kwa umu-ya ndikom, ego ahu ewere b͕aputa ndi ahu eji ka ndi Livai n'ọnu-ọgugu
49
Moses we nara ego nb͕aputa ahu n'aka ndi fọduru n'ọnu-ọgugu ndi ahu ndi Livai b͕aputara:
50
n'aka umu eburu uzọ mu nke umu Israel ka ọ nara ego ahu; nnù shekel atọ na ọgu asatọ na ise, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di;
51
Moses we nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom, ego ndi ab͕aputara, n'okwu-ọnu Jehova, dika Jehova nyere Moses iwu.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36