bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Chronicles 11
2 Chronicles 11
Igbo 2006
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 12 →
1
Rehoboam we biarue Jerusalem, kpọkọta ulo Juda na Benjamin, orú nnù ndikom orú uzọ na abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, ndi nēbu agha, ibuso Israel agha, iweghachiri Rehoboam ala-eze:
2
Okwu Jehova we rue Shemaia nti, bú onye nke Chineke, si,
3
Gwa Rehoboam nwa Solomon, bú eze Juda, gwa kwa Israel nile di na Juda na Benjamin, okwu, si,
4
Otú a ka Jehova siri, Unu arigola, unu ebuso-kwa-la umu-nne-unu agha: laghachinu, nwoke ọ bula n'ulo-ya; n'ihi na n'ebe M'nọ ka ihe a siteworo. Ha we nu okwu Jehova, si n'ije imegide Jeroboam laghachi.
5
Rehoboam we biri na Jerusalem, wue obodo ufọdu ib͕ochi agha nime Juda.
6
O wue Bet-lehem, na Itam, na Tekoa,
7
na Bet-zua, na Soko, na Adulam,
8
na Gat, na Marisha, na Zif,
9
na Adoraim, na Lekish, na Azeka,
10
na Zora, na Ajalon, na Hebron, nke di na Juda na Benjamin, bú obodo ewusiri ike.
11
Ọ we me ka ebe nile ewusiri ike di ike, tiye ndi-ndú nime ha, na àkù, bú ihe-oriri, na manu, na manya-vine.
12
O tiye-kwa-ra ọta na ube n'obodo nile ọ bula, we me ka ha di ike ri nne. O we nwe Juda na Benjamin.
13
Ndi-nchu-àjà na ndi Livai ndi nọ n'Israel nile we si n'ókè-ala-ha nile guzo onwe-ha n'akuku ya.
14
N'ihi na ndi Livai rapuru ebe-ita-nri-anu nile ha na ihe-onwunwe-ha, we jerue Juda, jeru kwa Jerusalem: n'ihi na Jeroboam na umu-ya ndikom juru ha, ka ha ghara iburu Jehova ndi-nchu-àjà:
15
ọ we guzoro onwe-ya ndi-nchu-àjà idiri ebe di elu, na idiri nkpi, na idiri umu-ehi, nke o mere.
16
Site n'ebo nile nke Israel ndi nēnye obi-ha ichọ Jehova, bú Chineke Israel, so-kwa-ra ha bia na Jerusalem ichuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, àjà.
17
Ha we me ka ala-eze Juda di ike, ha b͕a kwa Rehoboam nwa Solomon ume, arọ atọ: n'ihi na ha jere ije n'uzọ Devid na Solomon arọ atọ.
18
Rehoboam we lutara onwe-ya nwunye, bú Mahalat nwa-nwayi Jerimot nwa Devid, na Abihail nwa-nwayi Elaiab nwa Jesi,
19
o we muara ya umu-ndikom; Jeush, na Shemaria, na Zaham.
20
Mb͕e ọ lusiri ya ọ luta-kwa-ra Meaka nwa-nwayi Absalom; o we muara ya Abaija, na Atai, na Ziza, na Shelomit.
21
Rehoboam we hu Meaka nwa Absalom n'anya kari ndinyom-ya nile na iko-ya ndinyom nile: (n'ihi na ndinyom iri na asatọ ka ọ lutara, nwe kwa ọgu iko-ndinyom atọ, o we mua orú umu-ndikom na asatọ na ọgu umu-ndinyom atọ).
22
Rehoboam we guzo Abaija nwa Meaka ibu onye-isi, ọbuná ibu onye-ndú n'etiti umu-nne-ya: n'ihi na ọ di n'obi-ya ime ya eze.
23
O nwe-kwa-ra nghọta, we me ka ufọdu nime umu-ya ndikom nile b͕asa rue ala nile nke Juda na Benjamin, rue obodo ọ bula ewusiri ike: o we nye ha nri n'uba. O we chọ ìgwè ndinyom.
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 12 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36