bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Chronicles 6
2 Chronicles 6
Igbo 2006
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 7 →
1
Mb͕e ahu Solomon siri, Jehova asiwo na O gēbi n'oké ọchichiri.
2
Ma mu onwem ewuworo Gi ulo obibi, bú ọnọdu guzosiri ike ebe I gēbi rue mb͕e ebighi-ebi.
3
Eze we chigharia iru-ya, gọzie nkpọkọta nile nke Israel: nkpọkọta nile nke Israel nēguzo kwa.
4
Ọ si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye were ọnu-Ya gwa Devid, bú nnam, okwu, were kwa aka-Ya abua mezue ya, si,
5
Site n'ubọchi mb͕e M'mere ka ndim si n'ala Ijipt puta, arọputaghm obodo n'ebo nile nke Israel iwu ulo, ka aham we di n'ebe ahu; arọputaghkwam nwoke ọ bula ibu onye-ndú ndim, bú Israel:
6
ma arọputaram Jerusalem, ka aham we di n'ebe ahu; arọputa-kwa-ram Devid ibu onye-isi ndim, bú Israel.
7
O we di n'obi Devid, bú nnam, iwuru aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo.
8
Jehova we si Devid, bú nnam, N'ihi na ọ di n'obi-gi iwuru aham ulo, i mere nke-ọma na ọ di n'obi-gi:
9
otú ọ di gi onwe-gi agaghi-ewu ulo ahu; kama, nwa-gi nwoke nke nēsi n'úkwù-gi puta, onye ahu gēwuru aham ulo.
10
Jehova emewo kwa ka okwu-Ya nke O kwuru guzosie ike; m'we bilie n'ọnọdu Devid, bú nnam, nọkwasi n'oche-eze Israel, dika Jehova kwuru, m'we wuere aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo,
11
dọba ib͕e ahu n'ebe ahu, bú ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu Jehova di n'ebe ahu, bú ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na umu Israel b͕ara.
12
O we guzo n'iru ebe-ichu-àjà Jehova n'iru nkpọkọta nile nke Israel, we b͕asa ọbu-aka-ya abua:
13
(n'ihi na Solomon mere ebe-nguzo di elu nke ọla-cubit ise ka ogologo-ya di, cubit ise ka obosara-ya di kwa, cubit atọ ka idi-elu, ya di kwa, o we tiye ya n'etiti ogige; o we guzo n'elu ya, b͕u ikperè-ya n'ala n'iru nkpọkọta nile nke Israel, b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe elu-igwe di:)
14
ọ si, Jehova, bú Chineke Israel, ọ dighi Chineke dika Gi, n'elu-igwe, ma-ọbu n'uwa; I nēdebere ndi-orù-Gi ọb͕ub͕a-ndu na ebere, bú ndi were obi-ha nile nējeghari n'iru Gi:
15
I debeworo orù-Gi Devid, bú nnam, ihe I gwara ya: I we were ọnu-Gi kwue, were kwa aka-Gi mezue ya, otú ọ di ta.
16
Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, debere orù-Gi Devid, bú nnam, okwu nke I gwaworo ya, si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n'irum n'inọkwasi n'oche-eze Israel; nání ọ buru na umu-gi elezi uzọ-ha anya, ijeghari n'iwum dika i jeghariworo n'irum.
17
Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, ka okwu-Gi kwesi ntukwasi-obi, nke I gwara orù-Gi, bú Devid.
18
Ma ọ̀ bu ezie na Chineke gēbiyere madu n'elu uwa? le, elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe agaghi-anagide Gi; ulo a nke m'wuworo, ò gēsi kwa aṅa rue inagide Gi?
19
Ma che iru n'ekpere orù-Gi, na n'aririọ-amara-ya, Jehova, bú Chinekem, ige nti iti-nkpu na ekpere orù-Gi nēkpe n'iru Gi:
20
ka anya-Gi abua we nāsaghe n'ebe ulo a di ehihie na abali, bú n'ebe ebe ahu di nke I siworo na I gētiye aha-Gi n'ebe ahu; ige nti ekpere nke orù-Gi gēkpe n'ebe ebe a di.
21
Ge kwa nti aririọ-amara nile nke orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, mb͕e ha nēkpe ekpere n'ebe ebe a di: Gi onwe-gi si kwa n'ebe obibi-Gi, bú site n'elu-igwe, nuru; mb͕e I nuworo, Gi b͕aghara kwa.
22
Ọ buru na nwoke emehie megide madu-ibe-ya, ewe tukwasi ya iyi ime ka ọ ṅua, iyi ahu we bia n'iru ebe-ichu-àjà-Gi n'ulo a:
23
Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe nuru, me kwa, kpe ndi-orù-gi ikpe, inyeghachi onye ikpe mara, itukwasi uzọ-ya n'isi-ya; na igu onye ezi omume n'onye ezi omume, inye ya dika ezi omume-ya si di.
24
Ọ buru kwa na etib͕ue ndi-Gi, bú Israel, n'iru onye-iro, n'ihi na ha nēmehie megide gi; ọ buru kwa na ha alaghachi, kwuputa aha-Gi, kpe ekpere, riọ amara n'iru Gi n'ulo a:
25
Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe nuru, b͕aghara nmehie ndi-Gi, bú Israel, me ka ha lata n'ala nke I nyere ha, nye kwa ndi bu nna-ha.
26
Mb͕e eb͕ochiri elu-igwe, mb͕e miri-ozuzo nādighi kwa, n'ihi na ha nēmehie megide Gi; ọ buru na ha ekpe ekpere n'ebe ebe a di, kwuputa aha-Gi, si na nmehie-ha laghachi, n'ihi na I nēweda ha n'ala:
27
Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, b͕aghara nmehie ndi-orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, n'ihi na I nēzí ha ezi uzọ nke ha ganēje ije nime ya; Gi me kwa ka miri zokwasi ala-Gi, nke I nyeworo ndi-Gi ibu ihe-nketa.
28
Mb͕e oké unwu gādi n'ala, mb͕e ajọ ọria nke nēfe efe gādi, mb͕e nchakpọ gādi, ma-ọbu ọmuma-ebu, ma-ọbu igurube, ma-ọbu ọbubu; mb͕e ndi-iro-ha gānọchigide ha n'agha n'ala nke ọnu-uzọ-ama nile ha; ihe-otiti ọ bula, ma-ọbu ọria ọ bula;
29
ekpere ọ bula, aririọ-amara ọ bula, nke gādiri madu ọ bula, ma-ọbu nke gādiri ndi-Gi nile, bú Israel, ndi gāmara, nwoke ọ bula ihe-otiti-ya na ihe-nb͕u-ya, o we b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe ulo a di:
30
Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe, bú ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, nuru, b͕aghara, nye nwoke ọ bula dika uzọ-ya nile si di, onye I mara obi-ya; (n'ihi na Gi onwe-gi amawo obi umu madu, nání Gi;)
31
ka ha we tua egwu Gi, ije ije n'uzọ-Gi nile, ubọchi nile nke ha onwe-ha nēbi n'elu ala ahu nke I nyere nna-ayi-hà.
32
Ọzọ kwa, ihe bayere onye ala ọzọ, nke ọ bughi na ndi-Gi, bú Israel, ka o sitere, ma o siwo n'ala di anya bia n'ihi aha uku Gi, na aka-Gi di ike, na ogwe-aka-Gi esetiri eseti; mb͕e ha gābia kpe ekpere n'ebe ulo a di:
33
Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe, site n'ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, nuru, me dika ihe nile si di nke onye ala ọzọ ahu nākpọku Gi; ka ndi nile nke uwa we mara aha-Gi, itu egwu Gi, dika ndi-Gi, bú Israel, si eme, na imara na akpọkwasiri aha-Gi n'ulo a nke M'wuworo.
34
Mb͕e ndi-Gi gāpu ibuso ndi-iro-ha agha, n'uzọ ọ bula I gēziga ha, ha we kpere Gi n'uzọ obodo ahu nke I rọputaworo, na n'ebe ulo a di nke m'wuworo aha-Gi:
35
Gi si kwa n'elu-igwe nuru ekpere-ha na aririọ-amara-ha, mezie ikpé-ha.
36
Mb͕e ha gēmehie megide Gi, (n'ihi na ọ dighi madu ọ bula nke nādighi-emehie,) I we wesa ha iwe, rara ha nye n'iru onye-iro-ha, ndi nādọta ha n'agha ewe dọta ha n'agha je n'ala di anya ma-ọbu nke di nso;
37
ha we chègharia n'obi-ha n'ala ebe adọtara ha n'agha, we chigharia, riọ Gi amara n'ala ndọta-n'agha-ha, si, Ayi emehiewo, me ajọ omume, mebie iwu-Gi;
38
ọ buru kwa na ha ewere obi-ha nile, were kwa nkpuru-obi-ha nile, laghachikute Gi n'ala ndọta-n'agha-ha, bú ebe ha dọtara ha n'agha, we kpe ekpere n'uzọ ala-ha, nke I nyere ndi bu nna-ha, na obodo ahu nke I rọputaworo, na n'ebe ulo nke m'wuworo aha-Gi di:
39
Gi si kwa n'elu-igwe, bú site n'ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, nuru ekpere-ha na aririọ-amara nile ha, mezie ikpé-ha; b͕aghara ndi-Gi ndi mehieworo megide Gi.
40
Ub͕u a, Chinekem, biko, ka anya-Gi abua nāsaghe, ka nti-Gi abua nāṅa kwa nti, n'ekpere nke ebe a.
41
Ma ub͕u a, bilie, Jehova, bú Chineke, ba n'ebe-izu-ike-Gi, Gi onwe-gi na ib͕e nke ike-Gi: Jehova, bú Chineke, ka ndi-nchu-àjà-Gi yiri nzọputa dika uwe, ka ndi-ebere-Gi ṅuri kwa ọṅu n'idi-nma.
42
Jehova, bú Chineke, echigharila iru onye-Gi etere manu; cheta ebere nile nke Devid, bú orù-Gi.
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 7 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36