bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Chronicles 32
2 Chronicles 32
Igbo 2006
← Chapter 31
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 33 →
1
Mb͕e ihe ndia na ezi-okwu a gasiri, Senakerib, bú eze Asiria, biara, ba nime Juda, we ma ulo-ikwū-ya imegide obodo nile ewusiri ike, si na o gētipú ha nye onwe-ya.
2
Hezekaia we hu na Senakerib abiawo, che iru ibuso Jerusalem agha,
3
o we me ndi-isi-ya na ndi-dike-ya ka ha dua ya ọdu, ib͕ochi miri nke isi-iyi nile nke di n'azu obodo; ha we yere ya aka.
4
Ewe chikọta ndi di ọtutu, ha we b͕ochie isi-iyi nile, na miri-iyi ahu nke nērùsi ike n'etiti ala-ha, si, N'ìhi gini ka ndi-eze Asiria gābia, hu ọtutu miri?
5
O we me onwe-ya ka ọ di ike, we wuzie mb͕idi nile nke etipúru etipú, o we wulie ya rue ulo-elu-ya nile, wu kwa mb͕idi ọzọ n'azu, me ka Milo, nke di n'obodo Devid, di ike, o me-kwa-ra ihe-agha na ọta n'uba.
6
O we do ndi-ọchi-agha ka ha buru ndi-isi ndi-ya, o we chikọta ha n'ebe ọ nọ n'amá nke ọnu-uzọ-ama obodo, gwa ha okwu nābà n'obi-ha, si,
7
Dinu ike nwe kwa ume, unu atula egwu atu-kwa-la ujọ n'ihi eze Asiria, ma-ọbu n'ihi ìgwè ahu nile nke nọyere ya: n'ihi na nke nọyere ayi di ọtutu kari nke nọyere ya:
8
nke nọyere ya bu ogwe-aka nke anu-aru; ma Nke nọyere ayi bu Jehova, Chineke-ayi, iyere ayi aka na ibu agha nile ayi. Ndi Juda we dabere onwe-ha n'elu okwu nile nke Hezekaia, bú eze Juda.
9
Mb͕e nka gasiri, Senakerib, bú eze Asiria, zigara ndi-orù-ya na Jerusalem, (ma ya onwe-ya nānọchigide Lekish n'agha, ya na ndi nile ọ nāchi,) jekuru Hezekaia, bú eze Juda, jekuru kwa Juda nile ndi nọ na Jerusalem, si,
10
Otú a ka Senakerib, bú eze Asiria, siri, N'ìhe gini ka unu onwe-unu nātukwasi obi, unu we nānọdu n'ebe ewusiri ike, bú nime Jerusalem?
11
Hezekaia, ọ̀ dighi-akpali unu, ira unu nye ka unu nwua site n'oké unwu, site kwa n'akpiri-ikpọ-nku, si, Jehova, bú Chineke-ayi, gānaputa ayi n'ọbu-aka eze Asiria?
12
Ọ̀ bughi Hezekaia ahu wezugara ebe-Ya nile di elu na ebe-ichu-àjà-Ya nile, gwa Juda, gwa kwa Jerusalem, si, Ọ bu n'iru otù ebe-ichu-àjà ka unu gākpọ isi ala, ọ bu kwa n'elu ya ka unu gēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ?
13
Ùnu amaghi ihe m'mere ndi nile nke ala ọzọ nile, mu onwem na nnam-hà? chi mba nile nke ala ọzọ nile, hà puru inaputa ala-ha n'akam ma-ọli?
14
Ọ̀ bu onye n'etiti chi nile nke mba ndia, bú ndi nnam-hà wezugara ka ebibie ha, nke puru inaputa ndi-ya n'akam, na Chineke-unu puru inaputa unu n'akam?
15
Ma ub͕u a unu ekwela Hezekaia rafue unu, kpali kwa unu otú a, unu ekwe-kwa-la ya: n'ihi na ọ dighi chi ọ bula nke mba ọ bula ma-ọbu ala-eze ọ bula puru inaputa ndi-ya n'akam, ma-ọbu n'aka nnam-hà: n'ezie Chineke-unu agaghi-anaputa kwa unu n'akam.
16
Ndi-orù-ya kwu-kwa-ra okwu ọzọ imegide Jehova, bú Chineke, na imegide orù-Ya, bú Hezekaia.
17
Ọ de-kwa-ra akwukwọ, ita Jehova, bú Chineke Israel, uta, na ikwu okwu megide Ya, si, Dika chi mba nile nke ala ọzọ nile, ndi nānaputaghi ndi-ha n'akam, otú a Chineke Hezekaia agaghi-anaputa ndi-ya n'akam.
18
Ha we were oké olu kpọ ndi Jerusalem ndi nọ n'elu mb͕idi òkù n'asusu ndi-Ju, ime ka ha tua egwu, na ime ka ha ma jijiji; ka ha we were obodo-ha.
19
Ha we kwue okwu bayere Chineke Jerusalem, dika ha si ekwu okwu bayere chi nile nke ndi uwa, bú ọlu aka madu.
20
Hezekaia, bú eze, na Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma, we kpe ekpere bayere ihe a, we tikue elu-igwe.
21
Jehova we ziga mọ-ozi, o we kpochapu ndi-dike nile bu dìnkpà, na ndi-ndú na ndi-isi, n'ọmuma-ulo-ikwū nke eze Asiria. O we were ihere iru laghachi n'ala-ya. O we ba n'ulo chi-ya, ndi siri na ngiri-afọ-ya we were mma-agha me ka ọ da nwua n'ebe ahu.
22
Jehova we zọputa Hezekaia na ndi bi na Jerusalem n'aka Senakerib, bú eze Asiria, na n'aka madu nile, we nēdu ha buruburu.
23
Ọtutu madu nēbute-kwa-ra Jehova onyinye-inata-iru-ọma, rue Jerusalem, ha nēbute-kwa-ra Hezekaia, bú eze Juda, ihe di oké ọnu-ahia: ewe bulie ya elu n'anya mba nile mb͕e ihe ndia gasiri.
24
Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria rue inwu: o we kpere Jehova; O we gwa ya okwu, nye ya ihe-ebube.
25
Ma ọ bughi dika nmeso emesoro ya ka Hezekaia nyeghachiri; n'ihi na obi-ya di elu: iwe we dikwasi ya, dikwasi kwa Juda na Jerusalem.
26
Hezekaia we ruru ala n'ihi idi-elu nke obi-ya, ya onwe-ya na ndi bi na Jerusalem, iwe Jehova abiakwasighi kwa ha n'ubọchi Hezekaia.
27
Hezekaia we nwe àkù na nsọpuru riri nne nke-uku: o we mere onwe-ya ulo-àkù idebe ọla-ọcha, na idebe ọla-edo, na idebe nkume di oké ọnu-ahia, na idebe uda di iche iche, na idebe ọta, na idebe ihe nile anāchọsi ike;
28
o me-kwa-ra ulo nchikọbata-ihe idebe omume ọka na manya-vine ọhu na manu; na ulo anu nile ọ bula di iche iche, na ìgwè aturu n'ulo-anu.
29
O we mere onwe-ya obodo di iche iche, na ihe-nnweta, bú ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, n'uba: n'ihi na Chineke nyere ya àkù bara uba nke-uku.
30
Hezekaia nka b͕ochi-kwa-ra isi-iyi miri Gaihon di n'elu, we me ka miri ahu rùdazie n'akuku Ọdida-anyanwu obodo Devid. Ihe nāga-kwa-ra Hezekaia nke-ọma n'ọlu-ya nile.
31
Otú ọ di, n'okwu ndi-ukọ nke ndi-isi Babilon, ndi zitere ya ozi iju ajuju bayere ihe-ebude nke mere n'ala, Chineke rapuru ya inwa ya, ka O we mara ihe nile di n'obi-ya.
32
Ma ihe nile Hezekaia mere nke fọduru, na ọlu-ebere-ya nile, le, edewo ha n'ọhù Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma, n'akwukwọ ndi-eze Juda na Israel.
33
Hezekaia we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'ebe-nrigo nke ílì umu Devid. Juda nile na ndi bi na Jerusalem we mere ya ihe-nsọpuru n'ọnwu-ya. Manase nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
← Chapter 31
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 33 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36