bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Chronicles 31
2 Chronicles 31
Igbo 2006
← Chapter 30
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 32 →
1
Ma mb͕e emere ka ihe a nile gwusia, Israel nile ndi ahuru n'ebe ahu puru jerue obodo nile nke Juda, titue ogidi nile, b͕utu kwa Asherim, kwatu kwa ebe di elu nile na ebe-ichu-àjà nile, me ka ha pua na Juda na Benjamin nile, n'Efraim kwa na Manase, rue mb͕e emere ka ha gwusia. Umu Israel nile we laghachi, nwoke ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, rue obodo-ha.
2
Hezekaia we guzo òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, dika òkè nile ha si di, nwoke ọ bula dika òfùfè-ya si di, ma ndi-nchu-àjà ma ndi Livai, ichu àjà-nsure-ọku na àjà-udo, ije ozi, na ikele ekele, na ito Chineke n'ọnu-uzọ-ama nile nke ọmuma-ulo-ikwū Jehova.
3
O guzo-kwa-ra òkè eze sitere n'àkù-ya iji chu àjà-nsure-ọku, bú àjà-nsure-ọku nke ututu na nke anyasi, na àjà-nsure-ọku anāchu n'ubọchi-izu-ike nile, na nke anāchu n'ọnwa ọhu nile, na nke anāchu na mb͕e nile akara àkà, dika edeworo ya n'iwu Jehova.
4
O we si ndi Juda, bú ndi bi na Jerusalem, ka ha nye òkè ndi-nchu-àjà na ndi Livai, ka ha we di ike n'iwu Jehova.
5
Ma mb͕e ekwusara okwu ahu, umu Israel nyere nkpuru mbu nke ọka, na nke manya-vine ọhu, na nke manu, na nke manu-aṅu, na nke ihe-ọmume nile nke ubi, n'uba; otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nile ka ha bubatara n'uba.
6
Umu Israel na Juda, ndi bi n'obodo Juda nile, ndi ahu bubata-kwa-ra otù uzọ n'uzọ iri nke ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nsọ nke edoro nsọ nye Jehova, bú Chineke-ha, ha we tinye aha n'obo n'obo.
7
N'ọnwa nke-atọ ka ha malitere itọ ntọ-ala nke obo ahu, n'ọnwa nke-asa ka ha tubìri ha.
8
Hezekaia na ndi-isi we bia hu obo nile, gọzie Jehova, na ndi-Ya, bú Israel.
9
Hezekaia we jua ndi-nchu-àjà na ndi Livai ajuju bayere obo ahu.
10
Azaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, nke ulo Zedok, we gwa ya, si, Site na mb͕e ha malitere ibubata àjà-nbuli n'ulo Jehova, ayi erijuwo afọ, rifọ kwa ihe n'uba: n'ihi na Jehova agọziwo ndi-Ya; ma nke fọduru bu ọtutu ihe nile a.
11
Hezekaia we si ka edozie ime-ulo n'ulo Jehova; ha we dozie.
12
Ha we bubata àjà-nbuli, na otù uzọ n'uzọ iri, na ihe nsọ nile, n'ikwesi-ntukwasi-obi: ma otù onye-ndú nāchi ha bu Konanaia onye Livai, Shimai nwa-nne-ya bu kwa nke-abua.
13
Na Jehiel, na Azazaia, na Nehat, na Asahel, na Jerimot, na Jozabad, na Eliel, na Ismakia, na Mehat, na Benaia, bú ndi-nlekọta n'okpuru aka Konanaia na Shimai nwa-nne-ya, site n'otú Hezekaia, bú eze, na Azaraia, bú onye-ndú ulo Chineke, mere ha ndi-nlekọta.
14
Kore nwa Imna, bú onye Livai, onye-ọnu-uzọ-ama n'akuku ọwuwa-anyanwu, bu onye-isi onyinye-afọ-ofufo Chineke, inye àjà-nbuli Jehova na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile.
15
Iden, na Miniamin, na Jeshua, na Shemaia, na Amaraia, na Shekanaia, nọ kwa n'aka-ya, n'obodo ndi-nchu-àjà, n'ọnọdu-ha, bú nke ndi kwesiri ntukwasi-obi, inye umu-nne-ha ihe n'òkè, bú inye onye ntà otú anēnye onye uku:
16
nāgughi ndi di n'akwukwọ-osuso-ọmumu-ha nke ndikom, site na ndi b͕ara arọ atọ we ga n'iru, bú onye ọ bula nke nābà n'ulo Jehova, ilu ọlu ubọchi n'ubọchi-ya, ifè òfùfè-ha n'ihe-ndebe nile ha dika òkè nile ha si di;
17
na ndi di n'akwukwọ-osuso-ọmumu nke ndi-nchu-àjà dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, na ndi Livai site na ndi b͕ara orú arọ we ga n'iru, n'ihe-ndebe nile ha n'òkè nile ha;
18
na ndi di n'akwukwọ-osuso-ọmumu n'etiti umu-ntakiri-ha nile, na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ha ndinyom, nime nkpọkọta Israel nile: n'ihi na n'ọnọdu-ha, bú nke ndi kwesiri ntukwasi-obi, ka ha doro onwe-ha nsọ n'idi-nsọ:
19
umu Eron kwa, bú ndi-nchu-àjà, ndi nọ n'ọhia nke ebe-ita-nri obodo-ha, n'obodo nile ọ bula, ha nwere ndikom ndi akpọrọ n'aha n'aha, inye ndikom nile n'etiti ndi-nchu-àjà òkè-ha, inye kwa ndi nile ndi di n'akwụkwọ-osuso-ọmumu n'etiti ndi Livai.
20
Hezekaia we me otú a nime Juda nile; o we me ezi ihe na nke ziri ezi na ezi-okwu n'iru Jehova, bú Chineke-ya.
21
Ma n'ọlu ọ bula nke ọ malitere n'òfùfè nke ulo Chineke, na n'iwu, na n'ihe nile enyere n'iwu, ichọ Chineke, ọ bu obi-ya nile ka o ji me ya, ihe we gara ya nke-ọma.
← Chapter 30
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 32 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36