bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Chronicles 5
2 Chronicles 5
Igbo 2006
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 6 →
1
Ewe jezue ozi nile nke Solomon jere ulo Jehova. Solomon we webata ihe nile Devid, bú nna-ya, doro nsọ; bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile, o tiye ha n'ulo-àkù nke ulo Chineke.
2
Mb͕e ahu Solomon kpọkọtara ndi-okenye Israel, na ndi-isi nile nke ebo nile ha, bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna umu Israel, ibiaru Jerusalem, isi n'obodo Devid, nke ahu bu Zaion, bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova.
3
Ndikom nile nke Israel we kpọkọta onwe-ha biakute eze n'ememe, nke ahu bu ọnwa nke-asa.
4
Ndi-okenye nile nke Israel we bia, ndi Livai we bulie ib͕e ahu.
5
Ha we bugota ib͕e ahu, na ulo-ikwū nzute, na ihe nsọ nile nke di n'Ulo-ikwū ahu; ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, bugotara ha.
6
Eze, bú Solomon, na nzukọ nile nke Israel, bú ndi nēzukọta n'ebe ọ nọ, nọ n'iru ib͕e ahu, nāchu n'àjà ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, nke anādighi-agu ha ọnu, nke anādighi-aguta kwa ha n'ihi iba-uba-ha.
7
Ndi-nchu-àjà we bubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova n'ebe-ya, nime ime-ime-ulo nke ulo ahu, rue ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, rue n'okpuru nkù cherubim.
8
N'ihi na cherubim nāb͕asa nkù-ha n'elu ebe ib͕e ahu, cherubim ahu we nēkpuchi ib͕e ahu na nkpa-n'aka-ya abua n'elu.
9
Nkpa-n'aka di ogologo, ewe hu isi nkpa-n'aka site n'ib͕e ahu n'iru ime-ime-ulo ahu; ma adighi-ahu ha n'èzí: o we di n'ebe ahu, rue ta.
10
Ọ dighi ihe di n'ib͕e ahu, ọ bu nání mbadamba nkume abua nke Moses tiyere nime ha na Horeb, mb͕e Jehova na umu Israel b͕ara ndu, mb͕e ha siri n'Ijipt puta.
11
O rue, mb͕e ndi-nchu-àjà siri n'ebe nsọ puta, (n'ihi na ndi-nchu-àjà nile ahuru doro onwe-ha nsọ, ọ dighi onye ọ bula idebe ihe n'òkè n'òkè;
12
ọzọ, ndi Livai, bú ndi-ọbù-abù, ọbuná ha nile, bú Esaf na Himan, na Jedutun, na umu-ha ndikom, na umu-nne-ha, nēguzo kwa n'akuku ọwuwa-anyanwu nke ebe-ichu-àjà ahu, yiri ezi ákwà ọcha, chiri kwa ájà na une na ubọ-akwara, ọgu ndi-nchu-àjà isi ndi nāfù opi so-kwa-ra ha:)
13
o we rue, mb͕e ndi nāfù opì na ndi-ọbù-abù di ka otù onye, ime ka anu otù olu n'ito na n'ikele Jehova, mb͕e ha were kwa opì na ájà, na ihe abù, na otuto eji to Jehova, welie olu-ha elu, si, N'ihi na Ọ di nma: n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na igwe-oji juputara ulo ahu, bú ulo Jehova,
14
ndi-nchu-àjà we ghara inwe ike iguzo ije ozi n'ihi igwe-oji ahu: n'ihi na ebube Jehova juputara ulo Chineke.
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 6 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36