bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Chronicles 8
2 Chronicles 8
Igbo 2006
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 9 →
1
O rue, n'ọgwugwu orú arọ, nke Solomon wuru ulo Jehova na ulo-ya nime ha,
2
na obodo nile nke Huram nyere Solomon, Solomon we wue ha, me ka umu Israel biri n'ebe ahu.
3
Solomon we jerue Hemat-zoba, were ya.
4
O we wue Tadmoa n'ọzara, na obodo nile nke nchikọbata-ihe, nke o wuru na Hemat.
5
O wu-kwa-ra Bet-horon di n'elu, na Bet-horon di n'okpuru, bú obodo ewusiri ike, nke nwere mb͕idi, na ibo-ọnu-uzọ-ama siri ike, na nkpọrọ;
6
na Bealat, na obodo nile nke nchikọbata-ihe nke Solomon nwere, na obodo nile nke ub͕ọ-ala-ya, na obodo nile nke ndi-inyinya-ya, na ihe nile di Solomon ezi nma n'obi, bú nke di ya ezi nma n'obi iwu na Jerusalem, na nime Lebanon, na n'ala nile ọ nāchi.
7
Ma ndi nile fọduru n'etiti ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, ndi nēsiteghi n'Israel;
8
site n'umu-ha ndi fọduru inọchi ha n'ala, ndi umu Israel nēmeghi ka ha gwusia, Solomon we si nime ha weputa usu ndi nēfè òfùfè, rue ta.
9
Ma Solomon emeghi ndi-orù site n'umu Israel ije ozi-ya; kama ndi ahu bu ndikom agha, na ndi-isi ndi-ọchi-agha-ya, na ndi-isi ub͕ọ-ala-ya na ndi-inyinya-ya.
10
Ndia bu kwa ndi-isi nke ndi ahu edoro ndi-isi, ndi Solomon nwere, ọgu madu iri-na-abua na iri, ndi nwere ike n'aru ndi ahu.
11
Solomon we me ka nwa-nwayi Fero si n'obodo Devid rigorue ulo ahu nke o wuru nye ya: n'ihi na ọ siri, Nwunye m'nwere agaghi-ebi n'ulo Devid, bú eze Israel, n'ihi na ebe nile di nsọ, bú nke ib͕e Jehova bataworo nime ha.
12
Mb͕e ahu Solomon surere àjà-nsure-ọku nye Jehova n'elu ebe-ichu-àjà Jehova, nke O wuru n'iru uzọ-nbata,
13
ọbuná dika ihe ubọchi si di n'ubọchi-ya, n'isure àjà-nsure-ọku dika ihe Moses nyere n'iwu si di, n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na na mb͕e nile akara àkà, ub͕ò atọ n'arọ, bú n'ememe achicha ekoghi-eko, na n'ememe nke izù asa nke ubọchi asa, na n'ememe ulo-ntu.
14
Dika ikpé Devid, bú nna-ya, si di, o we guzo òkè nile nke ndi-nchu-àjà bayere òfùfè-ha, na ndi Livai bayere ihe-ndebe nile ha, ito Chineke, na ije ozi n'iru ndi-nchu-àjà, ime ihe ubọchi n'ubọchi-ya: o guzo-kwa-ra ndi-ọnu-uzọ-ama n'òkè nile ha n'ọnu-uzọ-ama ọ bula: n'ihi na otú a ka ihe si di nke Devid, bú onye nke Chineke, nyere n'iwu.
15
Ma ha ewezugaghi onwe-ha n'ihe eze nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai n'iwu bayere ihe ọ bula, baye-kwa-ra àkù nile.
16
Ewe dozie ije-ozi nile nke Solomon rue ubọchi atọrọ ntọ-ala ulo Jehova, ru kwa mb͕e ewubìri ya. Ewuzuru ulo Jehova.
17
Mb͕e ahu Solomon jeruru Ezion-geba, ru kwa Ilot, n'usọ oké osimiri, n'ala Edom.
18
Huram we zitere ya ub͕ọ na ndi-orù ndi mara oké osimiri n'aka ndi-orù-ya; ha na ndi-orù Solomon we biarue Ofia, si n'ebe ahu weta nnù talent ọla-edo na ọgu abua na iri, wetara eze, bú Solomon.
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 9 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36