bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Kings 11
2 Kings 11
Igbo 2006
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 12 →
1
Mb͕e Atalaia, bú nne Ehazaia, huru na nwa-ya nwoke anwuwo, o bilie, me ka nkpuru nile ndi nwe ala-eze la n'iyì.
2
Ma Jehosheba, nwa-nwayi eze, bú Joram, nwa-nne-nwayi Ehazaia, were Joash nwa-nwoke Ehazaia, zupu ya n'etiti umu-ndikom eze ndi anēme ka ha nwua, o were ya na nwayi nēnye ya ara, tiye ha n'ime-ulo nke ihe-ndina; ha we zopu ya n'iru Atalaia, ewe ghara ime ka ọ nwua.
3
O we nọ n'aka-ya n'ulo Jehova nēzo onwe-ya arọ isi: Atalaia we buru eze ala ahu.
4
Ma n'arọ nke-asa Jehoiada zigara chita ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, ndi diri ndi-Karait, na ndi diri ndi-ọb͕a-ọsọ, o me ka ha bakute ya n'ulo Jehova; ya na ha we b͕a ndu, o me ka ha ṅua iyi n'ulo Jehova, o me kwa ka ha hu nwa eze.
5
O we nye ha iwu, si, Nka bu ihe unu gēme: otù uzọ n'uzọ atọ nime unu, bú ndi nābà nime n'ubọchi-izu-ike, ganēdebe kwa ihe-ndebe ulo eze;
6
otù uzọ n'uzọ atọ gādi kwa n'ọnu-uzọ-ama Sua; otù uzọ n'uzọ atọ gādi kwa n'ọnu-uzọ-ama n'azu ndi-ọb͕a-ọsọ: unu gēdebe kwa ihe-ndebe nke ulo a, buru ihe-nb͕ochi.
7
Ma usu abua ahu nime unu, bú ndi nile nāpu apu n'ubọchi-izu-ike, ha gēdebe kwa ihe-ndebe ulo Jehova buruburu eze.
8
Unu gānọ kwa eze buruburu, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n'aka-ya; ma onye nābata nime akuku-unu, ka eme ka ọ nwua: unu nọye-kwa-ra eze mb͕e ọ nāpu n'èzí, na mb͕e ọ nābà nime.
9
Ndi-isi usu ọgu ndikom ise we me dika ihe nile si di nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, nyere n'iwu: ha we chiri, nwoke ọ bula ndikom-ya, bú ndi nābà nime n'ubọchi-izu-ike, ha na ndi nāpu apu n'ubọchi-izu-ike, ha we biakute Jehoiada, bú onye-nchu-àjà.
10
Onye-nchu-àjà we nye ndi-isi usu ọgu ndikom ise ube na ọta nke eze, bú Devid, nwereri, nke di n'ulo Jehova.
11
Ndi-ọb͕a-ọsọ we guzo, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n'aka-ya, site n'akuku aka-nri ulo rue akuku aka-ekpe ulo ahu, n'akuku ebe-ichu-àjà na n'akuku ulo, n'akuku eze buruburu.
12
O we me ka nwa eze puta, o kpube ya okpu-eze, nye ya ihe-àmà; ha we me ya eze, te ya manu, kua aka-ha, si, Ka eze di ndu.
13
Atalaia we nu olu ndi-ọb͕a-ọsọ na nke ndi Juda, o we biakute ndi ahu n'ulo Jehova:
14
ọ hu, ma, le, eze nēguzo n'akuku ogidi, dika ikpé si di, ndi-isi na opì-ha di kwa n'akuku eze; ndi nile nke ala ahu ṅuri-kwa-ra ọṅu, fùa opì. Atalaia we dọwa uwe-ya nile, kpọ, si, Nkekọta imegide eze, nkekọta imegide eze.
15
Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we nye ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise iwu, bú ndi-nlekọta usu-ndi-agha, si ha, Menu ka ọ pua ba n'etiti akuku; ma onye nābiaso ya n'azu, werenu mma-agha me ka ọ nwua: n'ihi na onye-nchu-àjà siri, Ka aghara ime ka ọ nwua n'ulo Jehova.
16
Ha we doro ya onwe-ha n'akuku abua; o we si uzọ nbata inyinya ba n'ulo eze: ewe me ka ọ nwua n'ebe ahu.
17
Jehoiada we me ọb͕ub͕a-ndu nke di n'etiti Jehova na eze na ndi Juda, na ha gābu ndi Jehova nwere; na n'etiti eze na ndi Juda.
18
Ndi nile nke ala ahu we ba n'ulo Beal, kwatue ya; ebe-ichu-àjà-ya nile na onyinyo-ya nile, ha tupiara ha nke-ọma, ha b͕u-kwa-ra Matan, bú onye-nchu-àjà Beal, n'iru ebe-ichu-àjà ahu. Onye-nchu-àjà we do ndi-nkekọta ilekọta ulo Jehova.
19
Ọ we chiri ndi-isi usu ọgu ndikom ise, na ndi-Karait, na ndi-ọb͕a-ọsọ, na ndi nile nke ala ahu; ha we me ka eze si n'ulo Jehova rida, ha we si uzọ ọnu-uzọ-ama ndi-ọb͕a-ọsọ ba n'ulo eze. O we nọkwasi n'oche ndi-eze.
20
Ndi nile nke ala ahu we ṅuria ọṅu, obodo ahu di-kwa-ra jū: ha we were mma-agha me ka Atalaia nwua n'ulo eze.
21
Jehoash b͕ara arọ asa mb͕e ọ malitere ibu eze.
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 12 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25