bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Kings 16
2 Kings 16
Igbo 2006
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 17 →
1
N'arọ nke-iri-na-asa nke Peka nwa Remalaia ka Ehaz nwa Jotam, bú eze Juda, malitere ibu eze.
2
Orú arọ ka Ehaz b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: ma o meghi ihe ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-ya, dika Devid nna-ya.
3
Ma o jere ije n'uzọ ndi-eze Israel. Ọzọ kwa, o mere ka nwa-ya nwoke gabiga nime ọku, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.
4
Ọ chua àjà, sure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe nile di elu, na n'elu ugwu ntà nile, na n'okpuru osisi ndu ọ bula.
5
Mb͕e ahu Rezin, bú eze Siria, na Peka nwa Remalaia, bú eze Israel, rigoruru Jerusalem ibu agha: ha we nọchigide Ehaz n'agha, ma ha apughi ibu agha.
6
Na mb͕e ahu ka Rezin, bú eze Siria, weghachiri Ilat nye Siria, chupu ndi-Ju n'Ilot: ndi Siria we ba n'Ilat, biri n'ebe ahu, rue ta.
7
Ehaz we zigara Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, ndi-ozi, si, Orù-gi na nwa-gi ka m'bu: rigota, zọputam n'aka eze Siria na n'aka eze Israel, ndi nēbili imegidem.
8
Ehaz we chiri ọla-ọcha na ọla-edo anāchọta n'ulo Jehova, na n'àkù nile nke ulo eze, zigara eze Asiria ka ọ buru ihe-iri-ngo.
9
Eze Asiria we ge ya nti: eze Asiria we rigorue Damaskọs, were ya, me ka ndi-ya je biri na Kia, o me-kwa-ra ka Rezin nwua.
10
Eze, bú Ehaz, we je izute Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, na Damaskọs, we hu ebe-ichu-àjà nke di na Damaskọs: eze, bú Ehaz, we zigara Uraija, bú onye-nchu-àjà, oyiyi ebe-ichu-àjà ahu, na ihe-atù-ya, dika ọlu nile aluru ya si di.
11
Uraija, bú onye-nchu-àjà, we wue ebe-ichu-àjà ahu: dika ihe nile si di nke eze, bú Ehaz, siri na Damaskọs zite, otú a ka Uraija, bú onye-nchu-àjà, mere, rue mb͕e eze, bú Ehaz, siri na Damaskọs bia.
12
Eze we si na Damaskọs bia, eze we hu ebe-ichu-àjà ahu: eze we biarue ebe-ichu-àjà ahu nso, sure àjà-nsure-ọku n'elu ya.
13
Ọ we sure àjà-nsure-ọku-ya ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, sure kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, wusi kwa àjà-ihe-ọṅuṅu-ya, wusa kwa ọbara àjà-udo-ya nile, n'elu ebe-ichu-àjà ahu.
14
Ma ebe-ichu-àjà ọla ahu, nke di n'iru Jehova, o si n'iru ulo ahu, si n'etiti ebe-ichu-àjà-ya na ulo Jehova, bute ya nso, tiye ya n'akuku Ugwu ebe-ichu-àjà-ya.
15
Eze, bú Ehaz, we nye Uraija, bú onye-nchu-àjà, iwu, si, N'elu ebe-ichu-àjà uku ahu ka i gēsure àjà-nsure-ọku ututu ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi, na àjà-nsure-ọku nke eze, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, ha na àjà-nsure-ọku nke ndi nile nke ala nka, na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha; ọbara nile nke àjà-nsure-ọku, na ọbara nile nke àjà, n'elu ya ka i gāwusa kwa ya: ma ebe-ichu-àjà ọla ahu gādirim iji ju ase.
16
Uraija, bú onye-nchu-àjà, we me ya, dika ihe nile si di nke eze, bú Ehaz, nyere ya n'iwu.
17
Eze, bú Ehaz, we bipu ihe-njikọ nile nke ihe-ndọkwasi nile, si n'elu ha wezuga ite ọsisa-miri: o si-kwa-ra n'elu ehi ọla nke di n'okpuru ya weda oké osimiri ahu, tiye ya n'elu pavement nkume.
18
Ma uzọ ekpuru ekpu nke ubọchi-izu-ike nke ha wuru n'ulo ahu, na nbata eze nke di n'èzí, ọ b͕anwere ha rue ulo Jehova, n'ihi eze Asiria.
19
Ma ihe Ehaz nile nke fọduru nke o mere, èdeghi ihe ahu n'akukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?
20
Ehaz we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Hezekaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 17 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25