bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Kings 23
2 Kings 23
Igbo 2006
← Chapter 22
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 24 →
1
Eze we ziga, ha we chikọta ndi-okenye nile nke Juda na Jerusalem n'ebe ọ nọ.
2
Eze we rigorue ulo Jehova, ya na ndikom nile nke Juda, na ndi nile ndi bi na Jerusalem, na ndi-nchu-àjà, na ndi-amuma, na ndi Juda nile, site n'onye ntà we rue onye uku: o we gua na nti-ha okwu nile nke akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu ahu nke achọtaworo n'ulo Jehova.
3
Eze we guzo n'akuku ogidi, b͕a ndu n'iru Jehova, ijeso Jehova, na iwere obi-ya nile na nkpuru-obi-ya nile debe ihe nile O nyere n'iwu, na ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, ime ka okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu nka nke edeworo n'akwukwọ a guzosie ike: ndi Juda nile we guzo n'ọb͕ub͕a-ndu ahu.
4
Eze we nye Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, na ndi-nchu-àjà nke usoro nke-abua, na ndi nēche nbata-uzọ, iwu, isi n'ulo Jehova weputa ihe nile nke emeworo nye Beal, nye kwa Ashera, nye kwa usu nile nke ihe elu-igwe: o we sure ha ọku n'azu Jerusalem n'ọhia Kidron, būru ntu-ha je Bet-el.
5
O me-kwa-ra ndi-nchu-àjà arusi kwusi, bú ndi-eze Juda doro isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe nile di elu n'obodo Juda nile, na n'ebe di Jerusalem buruburu; o me-kwa-ra ka ndi ahu kwusi, bú ndi nēsurere Beal, na anyanwu, na ọnwa, na kpakpando nējeghari ejeghari, na usu nile nke ihe elu-igwe, ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
6
O si-kwa-ra n'ulo Jehova buputa Ashera je n'azu Jerusalem, rue miri-iyi Kidron, sure ya ọku n'akuku miri-iyi Kidron, supia ya me ka ọ di ka uzuzu, kpofue uzuzu-ya n'elu ílì ndi efu.
7
Ọ kwatu-kwa-ra ulo nile nke ndi edoro nsọ ikwa iko, nke di n'ulo Jehova, ebe ndinyom nākpara Ashera ulo-ikwū.
8
O me-kwa-ra ka ndi-nchu-àjà nile si n'obodo Juda nile bia, o meru-kwa-ra ebe nile di elu ebe ndi-nchu-àjà surere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, site na Geba rue Bia-sheba; ọ kwatu-kwa-ra ebe nile di elu nke ọnu-uzọ-ama nke di n'oghere ọnu-uzọ-ama Joshua, bú onye-isi obodo, nke di n'aka-ekpe madu n'ọnu-uzọ-ama obodo.
9
Nání na ndi-nchu-àjà nke ebe nile di elu adighi-arigo n'ebe-ichu-àjà Jehova nime Jerusalem, ma ha nēri achicha ekoghi-eko n'etiti umu-nne-ha.
10
O meru-kwa-ra Tofet, nke di na ndagwurugwu umu Hinom, ka nwoke ọ bula we ghara ime ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku rue Molek.
11
O me-kwa-ra ka inyinya nile kwusi, bú nke ndi-eze Juda nyere anyanwu, nime nbata ulo Jehova, n'akuku ime-ulo Netan-melek, bú onozi, nke di n'èzí ulo ahu; o sure-kwa-ra ub͕ọ-ala nile nke anyanwu n'ọku.
12
Ebe-ichu-àjà nile nke di n'elu ime-ulo-elu nke Ehaz, nke ndi-eze Juda mere, na ebe-ichu-àjà nile nke Manase mere n'ogige abua nke ulo Jehova, eze kwaturu ha, we si n'ebe ahu b͕a ọsọ, kpofue uzuzu-ha nime miri-iyi Kidron.
13
Ebe nile di elu nke di n'iru Jerusalem, nke di n'aka-nri ugwu nbibi, nke Solomon, bú eze Israel, wuru nye Ashtoret, bú ihe-árú ndi Zaidon, nye kwa Kemosh, bú ihe-árú Moab, nye kwa Milkom, bú ihe-árú umu Amon, eze meru-kwa-ra ha.
14
O tipia-kwa-ra ogidi nile, b͕utu kwa Asherim, were ọkpukpu madu mejue ọnọdu-ha.
15
Ọzọ kwa, ebe-ichu-àjà nke di na Bet-el, na ebe di elu nke Jeroboam nwa Nebat mere, bú onye mere ka Israel mehie, ọbuná ebe-ichu-àjà ahu na ebe ahu di elu ka ọ kwaturu; o sure ebe ahu di elu ọku, supia ya me ka ọ ghọ uzuzu, sure kwa Ashera ọku.
16
Josaia we chigharia onwe-ya, hu ílì nile nke di n'ebe ahu n'ugwu ahu; o we zìe, chipu ọkpukpu n'ílì nile, sure ha ọku n'elu ebe-ichu-àjà ahu, merua ya, dika okwu Jehova si di nke onye nke Chineke ahu kpọsara, bú onye kpọsara ihe ndia.
17
O we si, Gini bu ihe-iriba-ama ahu nke mu onwem nāhu? Ndikom obodo ahu we si ya, Ọ bu ílì onye nke Chineke, onye siri na Juda bia, kpọsa ihe ndia nke i meworo megide ebe-ichu-àjà Bet-el.
18
Ọ si, Ya nọduru onwe-ya; ka nwoke ọ bula ghara ichipu ọkpukpu-ya. Ha we rapu ọkpukpu-ya, ha na ọkpukpu onye-amuma ahu nke siri na Sameria bia.
19
Ọzọ kwa, ulo nile nke ebe nile di elu, nke di n'obodo nile nke Sameria, nke ndi-eze Israel mere ikpasu Jehova iwe, ha ka Josaia wezugara, me kwa ha dika omume nile si di nke o mere na Bet-el.
20
O b͕ue ndi-nchu-àjà nile nke ebe nile di elu nke di n'ebe ahu, n'elu ebe-ichu-àjà nile, o sure-kwa-ra ọkpukpu madu n'elu ha; o we laghachi na Jerusalem.
21
Eze we nye ndi Juda nile iwu, si, Merenu Jehova, bú Chineke-unu, ememe ngabiga, dika edeworo ya n'akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu nka.
22
N'ezie emeghi ememe ngabiga dika ememe ngabiga nka site n'ubọchi ndi-ikpe ndi kpere Israel, ọbuná ubọchi nile nke ndi-eze Israel, na nke ndi-eze Juda;
23
ma ọ bu n'arọ nke-iri-na-asatọ nke eze, bú Josaia, ka emere ememe ngabiga nka nye Jehova nime Jerusalem.
24
Ọzọ kwa, ndi nāju mọ ihe, na ndi-dibia-afa, na teraphim, na arusi nile, na ihe-árú nile nke ahuru n'ala Juda, na nime Jerusalem, ndia ka Josaia tkpochapuru, ka o we me ka okwu nile nke iwu guzosie ike, bú nke edeworo n'akwukwọ nke Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, chọtara n'ulo Jehova.
25
Ọ dighi eze nke buru ya uzọ di ka ya, onye were obi-ya nile, were kwa nkpuru-obi-ya nile, were kwa ike-ya nile, chigharikute Jehova, dika iwu nke Moses si di; ọ dighi kwa onye ọzọ dika ya biliri mb͕e ọ nwusiri.
26
Otú ọ di, Jehova esighi n'idi-ọku iwe uku Ya laghachi, nke iwe-Ya ji di ọku megide Juda, n'ihi nkpasu-iwe nile nke Manase kpasuru Ya.
27
Jehova we si, M'gēsi kwa n'irum wezuga Juda, dika M'wezugara Israel, M'gāju kwa obodo a nke M'rọputaworo, bú Jerusalem, na ulo ahu nke M'siri, Aham gādi n'ebe ahu.
28
Ma okwu Josaia nile nke fọduru, na ihe nile nke o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?
29
N'ubọchi-ya ka Fero-neko, bú eze Ijipt, rigoro imegide eze Asiria rue osimiri Yufretis: eze, bú Josaia, we je izute ya; o we me ka ọ nwua na Megido, mb͕e ọ huru ya.
30
Ndi-orù-ya we si na Megido buru ya nime ub͕ọ-ala mb͕e ọ nwuru anwu, ha we bubata ya na Jerusalem, lìe ya n'ílì-ya. Ndi ala ahu we kuru Jehoahaz nwa Josaia, te ya manu, me ya eze n'ọnọdu nna-ya.
31
Jehoahaz b͕ara orú arọ na atọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọnwa atọ nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hamutal nwa Jeremaia nke Libna.
32
O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke nna-ya-hà mere.
33
Fero-neko we ke ya ab͕u nime Ribla n'ala Hemat, ka o we ghara ibu eze nime Jerusalem; o we tukwasi ala ahu nra, bú ọgu talent ọla-ọcha ise, na otù talent ọla-edo.
34
Fero-neko we me Elaiakim nwa Josaia eze n'ọnọdu Josaia nna-ya, gugharia ya aha Jehoiakim: ma o wepuru Jehoahaz; ọ biarue Ijipt, nwua n'ebe ahu.
35
Jehoiakim we nye Fero ọla-ọcha na ọla-edo ahu; nání na ọ ruru ala ọnu inye ego n'okwu-ọnu Fero: o were ihe-ike nara ndi ala ahu ọla-ọcha na ọla-edo, nwoke ọ bula dika ọ̀rùrù-ọnu-ya si di, inye ya Fero-neko.
36
Jehoiakim b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: aha nne-ya bu Zebida nwa Pedaia nke Ruma.
37
O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke nna-ya-hà mere.
← Chapter 22
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 24 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25