bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Kings 5
2 Kings 5
Igbo 2006
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 6 →
1
Ma Neaman, bú onye-isi usu-ndi-agha eze Siria, bu nwoke di uku n'iru onye-nwe-ya, buru kwa onye anāhu iru-ọma, n'ihi na ọ bu n'aka-ya ka Jehova nyere Siria nzọputa: nwoke ahu bu kwa dike nke bu dìnkpà, ma ọ bu onye-ekpenta.
2
Ndi Siria apuwo nēje n'usu ndi nāpunara madu ihe, we si n'ala Israel dọta otù nwa-ob͕ọghọ ntà n'agha; o we nọ n'iru nwunye Neaman.
3
Ọ si nwayi-nwe-ya, Ọ gādim nọ̄ nma, ma asi na onye-nwem nọ n'iru onye-amuma nke nọ na Sameria! mb͕e ahu ọ gēme ka o si n'ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta.
4
Otù onye we ba, gosi onye-nwe-ya, si, Otú a na otú a ka nwa-ab͕ọghọ ahu nke sitere n'ala Israel kwuru.
5
Eze Siria we si, Je, ba, ka m'ziga-kwa-ra eze Israel akwukwọ. O we je, chiri n'aka-ya talent ọla-ọcha iri, na nnù ọla-edo iri-na-ise, na uwe nb͕anwe iri.
6
O were akwukwọ ahu biakute eze Israel, si, Ma ub͕u a, mb͕e akwukwọ a biakutere gi, le, ezìwom Neaman, bú orùm, biakute gi, ka i we me ka o si n'ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta.
7
O rue, mb͕e eze Israel guru akwukwọ ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile, si, Ọ̀ bu Chineke ka m'bu, ime ka madu nwua na ime ka madu di ndu, na nwoke a nēziterem ozi ime ka nwoke si n'ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta? ma otú ọ di, biko, maranu hu kwa na ya onwe-ya nāchọ uzọ isi megidem.
8
O rue, mb͕e Elaisha bú onye nke Chineke, nuru na eze Israel dọwara uwe-ya nile, o we zigara eze ozi, si, N'ìhi gini ka i dọwara uwe-gi nile? biko, ka ọ biakutem, ọ gāmara kwa na onye-amuma di n'Israel.
9
Neaman we bia, ya na inyinya-ya nile na ub͕ọ-ala-ya, o guzo n'ọnu-uzọ ulo Elaisha nwere.
10
Elaisha we zigara ya onye-ozi, si, Je, sa aru ub͕ò asa nime Jọdan, anu-aru-gi gālaghachikute kwa gi, i gādi kwa ọcha.
11
Ma Neaman were iwe, laba, si, Le, m'siri, Ọ ghaghi ipukutem, guzo, kpọkue aha Jehova, bú Chineke-ya, fufe aka-ya n'elu ebe ahu, me ka onye-ekpenta di ọcha soro ndi-ya zukọta.
12
Abana na Fapa, bú osimiri Damaskọs, hà adighi nma kari miri Israel nile? #m'gaghi-asa aru nime ha, di ọcha? O we chigharia, laba n'ọnuma.
13
Ndi-orù-ya we biarue nso, gwa ya okwu, si, Nnam, asi na ọ bu ihe uku onye-amuma gwara gi me, ì gaghi-eme ya? ì gēsi kwa aṅa ghara ime ya mb͕e ọ siri gi, Sa aru, di kwa ọcha?
14
O we rida, suye onwe-ya nime Jọdan ub͕ò asa, dika okwu onye nke Chineke si di: anu-aru-ya we laghachi dika anu-aru nwa-okoro ntà, o we di ọcha.
15
O we laghachikute onye nke Chineke, ya onwe-ya na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, bia, guzo n'iru ya, si, Biko, le, amawom na ọ dighi Chineke di n'uwa nile, ọ bu nání n'Israel: ma ub͕u a, biko, nara ihe-ngọzi n'aka orù-gi.
16
Ọ si, Jehova nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, m'gaghi-anara ihe ọ bula ma-ọli. O we rugide ya inara ya; ma ọ juru aju.
17
Neaman we si, Ọ buru na i naghi, biko, ka enye orù-gi ibu ájá nke inyinya mule abua gēbu; n'ihi na orù-gi agaghi-emere chi ọzọ àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà ọzọ site n'ub͕u a, ma ọ bu náni Jehova.
18
Ka Jehova b͕aghara orù-gi ihe a; mb͕e onye-nwem nābà n'ulo Rimon ikpọ isi ala n'ebe ahu, mb͕e ya onwe-ya nādabere kwa n'akam, m'we kpọ isi ala n'ulo Rimon, mb͕e m'kpọrọ isi ala n'ulo Rimon, biko, ka Jehova b͕aghara orù-gi n'ihe a.
19
Ọ si ya, La n'udo. O we si n'ebe ọ nọ je n'uzọ-ya nwantī.
20
Ma Gihezi, bú nwa-okorọbia Elaisha onye nke Chineke, siri, Le, onye-nwem eb͕ochiwo onwe-ya n'ebe Neaman onye Siria nka nọ, n'ighara inara n'aka-ya ihe o wetara: Jehova nādi ndu, n'ezie m'gāb͕aso ya, nara ihe ufọdu n'aka-ya.
21
Gihezi we chuso Neaman. Neamam we hu otù onye nāb͕aso ya, o we si n'ub͕ọ-ala-ya rida izute ya, si, Ùdo di kwa?
22
Ọ si, Udo di. Onye-nwem ezitewom, si, Le, ọbuná ub͕u a umu-okorọbia abua nime umu ndi-amuma esiwo n'ugwu Efraim biakutem; biko, nye ha otù talent ọla-ọcha, na uwe nb͕anwe abua.
23
Neaman we si, Kwere, nara talent abua. O rugide ya, ke talent ọla-ọcha abua n'akpa abua, chiri uwe nb͕anwe abua, nye umu-okorọbia-ya abua; ha we būru ha ga n'iru ya.
24
Ọ biarue ugwu ntà ahu, nara ha n'aka-ha, tiye ha n ulo: o zilaga ndikom ahu, ha we la.
25
Ma ya onwe-ya bara nime, guzo n'akuku onye-nwe-ya. Elaisha we si ya, Òle ebe i si bia, Gihezi? Ọ si, Orù-gi ejeghi ebe ọ bula.
26
Ọ si ya, Òbim ejesoghi gi, mb͕e nwoke ahu siri n'ub͕ọ-ala-ya chigharia izute gi? ọ̀ bu mb͕e inara ego, na inara uwe, na ubi-olive na ubi-vine, na ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na ndi-orù ndikom na ndinyom nēje ozi?
27
Ekpenta Neaman gārapara kwa n'aru gi, na n'aru nkpuru-gi rue mb͕e ebighi-ebi. Ọ we si n'iru ya pua, buru onye-ekpenta nēnwu dika snow.
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 6 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25