bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Kings 13
2 Kings 13
Igbo 2006
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 14 →
1
N'arọ nke-orú-na-atọ nke Jọash nwa Ehazaia, bú eze Juda, ka Jehoahaz nwa Jihu malitere ibu eze Israel nime Sameria arọ iri na asa.
2
O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, jeso nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o jiri me ka Israel mehie; o sighi nime ya wezuga onwe-ya.
3
Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O nye ha n'aka Hazael, bú eze Siria, na n'aka Ben-hedad nwa Hazael, ubọchi nile.
4
Jehoahaz we chọ ime ka iru Jehova dajua, Jehova we ge ya nti: n'ihi na Ọ huru nmeb͕u Israel, n'ihi na eze Siria meb͕uru ha.
5
(Jehova we nye Israel onye-nzọputa, ha we pua n'okpuru aka Siria: umu Israel we biri n'ulo-ikwū-ha, dika na mb͕e gara aga.
6
Otú ọ di, ha esighi na nmehie nile nke ulo Jeroboam wezuga onwe-ha, bú nke o jiri me Israel ka ha mehie, ma Jehoahaz nējeghari nime ya: ọzọ kwa, Ashera guzoro na Sameria.)
7
N'ihi na ọ kweghi ka ndi Israel ọ bula fọduru Jehoahaz, ọ bu nání ọgu ndi-inyinya abua na iri, na ub͕ọ-ala iri, na orú nnù ndikom na nnù ise ndi ji ukwu eje; n'ihi na eze Siria mere ka ha la n'iyì, me kwa ha ka ha di ka ájá izọkwasi ukwu.
8
Ma okwu Jehoahaz nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ nke ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?
9
Jehoahaz we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya na Sameria: Joash nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
10
N'arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke Joash, bú eze Juda, ka Jehoash nwa Jehoahaz malitere ibu eze Israel; nime Sameria arọ iri na isi.
11
O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, bú nke o jiri me ka Israel mehie, wezuga onwe-ya: kama o jeghariri nime ya.
12
Ma okwu Joash nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya nke o jiri buso Amazaia, bú eze Juda, agha, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?
13
Joash we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; Jeroboam we nọkwasi n'oche-eze-ya: ewe lìe Joash nime Sameria n'ebe elìri ndi-eze Israel.
14
Ma Elaisha nāria ọria nke ọria-ya ahu nke ọ nwuru nime ya: Joash, bú eze Israel, we ridakuru ya, kwa ákwá n'iru ya, si, Nnam, nnam, ub͕ọ-ala Israel, na ndi-inyinya-ya!
15
Elaisha we si ya, Chiri uta na àkú: o we chiri uta na àkú n'aka-ya.
16
Ọ si eze Israel, Tukwasi aka-gi n'uta: o we tukwasi aka-ya. Elaisha we tukwasi aka-ya abua n'aka abua nke eze.
17
Ọ si, Meghe window n'akuku Iru-anyanwu: o we meghe. Elaisha we si, B͕a: o we b͕a. Ọ si, Àkú nzọputa Jehova nwere, bú àkú nzọputa imegide Siria: i gētib͕u kwa Siria n'Efek, rue mb͕e i gēme ka ha gwusia.
18
Ọ si, Chiri àkú: o we chiri ha. Ọ si eze Israel, Tida n'ala: o we tie ub͕ò atọ, guzo.
19
Onye nke Chineke ahu we wesa ya iwe, si, Asi na i tiri ub͕ò ise ma-ọbu ub͕ò isi; mb͕e ahu i gēti Siria rue mb͕e i gēme ka ọ gwusia: ma ub͕u a i gēti Siria nání ub͕ò atọ.
20
Elaisha we nwua, ha we lìe ya. Ma usu ndi nāpunara madu ihe nke ndi Moab batara n'ala mb͕e arọ ọhu biara.
21
O rue, mb͕e ha nēli otù nwoke, le, ha huru usu ndi nāpunara madu ihe; ha we tubà nwoke ahu n'ílì Elaisha: nwoke ahu we da, metu ọkpukpu Elaisha aru, we di ndu, bilie guzo n'ukwu-ya abua.
22
Ma Hazael, bú eze Siria, meb͕uru Israel ub͕ochi nile nke Jehoahaz.
23
Jehova we mere ha amara, nwe obi-ebere n'aru ha, che ha iru, n'ihi ọb͕ub͕a-ndu-Ya nke Ya na Abraham na Aisak na Jekob mere, O kweghi kwa ibibi ha, O sighi kwa n'iru Ya chupu ha rue ub͕u a.
24
Hazael, bú eze Siria, we nwua; Ben-hedad nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
25
Jehoash nwa Jehoahaz we naghachi n'aka Ben-hedad nwa Hazael obodo nile nke ọ nara n'aka Jehoahaz nna-ya n'agha. Ub͕ò atọ ka Joash tib͕uru ya, we weghachi obodo nile nke Israel.
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 14 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25