bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Kings 4
2 Kings 4
Igbo 2006
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 5 →
1
Ma otù nwayi n'etiti ndinyom umu ndi-amuma tikuru Elaisha nkpu, si, Orù-gi, bú dim, anwuwo: ma gi onwe-gi amawo na orù-gi nātu egwu Jehova: ma onye-nbinye-ego abiawo ichiri n'onwe-ya umum abua ka ha buru orù.
2
Elaisha we si ya, Gini ka m'gēmere gi? gosim; gini ka i nwere n'ulo? Ọ si, Ọ dighi ihe ọ bula orù-gi nwayi nwere n'ulo, ọ bu nání ite manu.
3
Ọ si, Je, riọtara onwe-gi ihe n'èzí n'aka ndi-ab͕ata-obi-gi nile, bú ihe ihe nādighi nime ha; ha abula ole-na-ole.
4
I gābà kwa n'ulo, mechibido onwe-gi, mechibido kwa umu-gi ndikom, uzọ, b͕aye manu di n'ite ahu n'ihe ahu nile, buzuga nke juru eju.
5
O we si n'ebe ọ nọ la, mechibido onwe-ya, mechibido kwa umu-ya ndikom, uzọ; ha onwe-ha nēbutere ya ihe ahu nso, ma ya onwe-ya nāb͕aye ab͕aye.
6
O rue, mb͕e ihe nile juru, na ọ siri nwa-ya, Buterem nso ihe ọzọ. Ọ si ya, Ọ dighi ihe ọzọ di. Manu ahu we kwusi.
7
O we bia, gosi onye nke Chineke. Ọ si, Je, re manu ahu, kwua ugwọ-gi, gi onwe-gi na umu-gi ndikom were nke fọduru di ndu.
8
Ubọchi we rue, na Elaisha gabigara rue Shunem, ma otù nwayi uku nọ n'ebe ahu; o rugide ya ka o rie nri. O rue, mb͕e ọ bula ọ nāgabiga, na o wezugara onwe-ya ba n'ebe ahu iri nri.
9
Nwayi ahu we si di-ya, Biko, le, amawom na onye di nsọ nke Chineke ka ọ bu, bú onye a nagabiga n'akuku ayi mb͕e nile.
10
Biko, ka ayi me ime-ulo-elu ntà nke mb͕idi; ka ayi dọba-kwa-ra ya n'ebe ahu ihe-ndina, na table, na oche, na ihe-idọba-oriọna: o gēru kwa, mb͕e ọ biakutere ayi, na ọ gēwezuga onwe-ya ba n'ebe ahu.
11
Ubọchi we rue, na ọ biara n'ebe ahu, wezuga onwe-ya ba n'ime-ulo-elu ahu, dina n'ebe ahu.
12
Ọ si Gihezi, bú nwa-okorọbia-ya, Kpọ nwayi Shunem nka. O we kpọ ya, o we guzo n'iru ya.
13
Elaisha we si Gihezi, Biko, si ya, Le, i werewo ncheb͕u a nile cheb͕u onwe-gi bayere ayi; gini ka agēmere gi? ọ̀ bu igwa eze okwu bayere gi, ma-ọbu igwa onye-isi usu-ndi-agha? Ọ si, N'etiti ndim ka mu onwem nēbi.
14
Ọ si, Gini kwa ka agēmere ya? Gihezi we si, N'ezie ọ nweghi nwa-nwoke, di-ya aghọwo kwa agadi.
15
Ọ si, Kpọ ya. O we kpọ ya, nwayi ahu we guzo n'ọnu-uzọ.
16
Ọ si, Na mb͕e nka akara àkà, dika mb͕e a aka-nile, gi onwe-gi ganāb͕aku nwa-nwoke. Ọ si, É-è, onye-nwem, gi onye nke Chineke, agwala orù-gi nwayi okwu-ugha.
17
Nwayi ahu we turu ime, mua nwa-nwoke na mb͕e ahu akara àkà, dika mb͕e ahu aka-nile, otú Elaisha gwara ya.
18
Nwata ahu we toputa, ubọchi we rue, na ọ pukuru nna-ya jekuru ndi nēbì ọka.
19
Ọ si nna-ya, Isim, isim. O we si nwa-okorọbia-ya, Kuru ya bakuru nne-ya.
20
O kuru ya, me ka ọ biakute nne-ya, ọ nọkwasi n'ikperè nne-ya rue etiti-ehihie, we nwua.
21
Ọ rigo, tọb͕ọ ya n'ihe-ndina onye nke Chineke ahu, mechibido ya uzọ, pua.
22
Ọ kpọ di-ya, si, Biko, ziterem otù nime umu-okorọbia, na otù nime nne-inyinya-ibu, ka m'we b͕akuru onye nke Chineke, lata kwa.
23
Ọ si, Gini mere gi onwe-gi nējekuru ya ta? ọ bughi ọnwa ọhu, ọ bughi kwa ubọchi-izu-ike. Ọ si, Udo.
24
O we jikwa inyinya-ibu, si nwa-okorọbia-ya, Nēdu, nēje kwa; eb͕ochilaram inyinya-ibu n'ibum b͕a ọsọ, ma ọ buru na asighm i.
25
O we je, biakute onye nke Chineke ahu, rue ugwu Kamel. O rue, mb͕e onye nke Chineke huru ya site na ncherita-iru ya, na ọ siri Gihezi, bú nwa-okorọbia-ya, Le, nwayi Shunem ahu:
26
biko, b͕a ọsọ izute ya ub͕u a, si ya, Ì nọ n'udo? di-gi, ọ̀ nọ n'udo? nwa-gi, ọ̀ nọ n'udo? Ọ si, Ayi nọ n'udo.
27
O we biakute onye nke Chineke rue ugwu ahu, jide ya n'ukwu-ya abua. Gihezi we biarue nso inupu ya; ma onye nke Chineke siri, Ra ya aka: n'ihi na nkpuru-obi-ya di ilu nime ya; ma Jehova ezonariwom ya, O gosighkwam ya.
28
O we si, Àriọrọm nwa-nwoke n'aka onye-nwem? àsighm, Arafulam?
29
O we si Gihezi, Ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, were kwa nkpa-n'akam n'aka-gi, je: mb͕e i zutere nwoke ọ bula, ekelela ya; mb͕e nwoke ọ bula gēkele gi, azala ya: tukwasi nkpa-n'akam n'iru nwa-okoro ahu.
30
Nne nwa-okoro ahu we si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. O we bilie, jeso ya.
31
Gihezi we gabiga n'iru ha, tukwasi nkpa-n'aka ahu n'iru nwa-okoro ahu; ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa ọṅuṅa-nti di. O we jeghachi izute ya, gosi ya, si, Nwa-okoro ahu etetaghi.
32
Elaisha we bata n'ulo ahu, ma, le, nwa-okoro ahu anwuwo, atọb͕ọ-kwa-ra ya n'ihe-ndina-ya.
33
O we ba, mechibido ha abua uzọ kpere Jehova.
34
Ọ rigo, dina n'elu nwata ahu, tukwasi ọnu-ya n'ọnu-ya, na anya-ya abua n'anya-ya abua, na ọbu-aka-ya abua n'ọbu-aka-ya abua, ruru ala n'elu ya: anu-aru nwata ahu we di ọku.
35
O we biaghachi, jegharia iru na azu n'ulo otù ub͕ò; ọ rigo, ruru kwa n'elu ya: nwa-okoro ahu we ze uzere rue ub͕ò asa, nwa-okoro we saghe anya-ya abua.
36
Ọ kpọ Gihezi, si, Kpọ nwayi Shunem nka. Ọ kpọ ya. Nwayi ahu we bakute ya, ọ si, Kuru nwa-gi.
37
O we ba nime, da n'ala n'ukwu-ya, kpọ isi ala, kuru nwa-ya, pua.
38
Ma Elaisha biaghachiri rue Gilgal: ma oké unwu di n'ala ahu; umu ndi-amuma nānọdu kwa ala n'iru ya: o we si nwa-okorọbia-ya, Tukwasi ite uku n'ọku, siere umu ndi-amuma ofé.
39
Otù onye we pua ba n'ọhia ichikọta akwukwọ nri, ọ huta osisi vine ọhia, chikọta afufa-ọhia nime ya nju uwe-ya, bia, biye ha n'ite ofé: n'ihi na ha amaghi ha.
40
Ha we wuputara ndikom ahu, ka ha rie. O rue, mb͕e ha nēri ofé ahu, na ndi ahu tiri nkpu, si, Ọnwu di n'ite, gi onye nke Chineke. Ha apughi kwa iri ya.
41
O we si, Weta-kwa-nu utu ọka. O we tiye ya n'ite ahu, si, Wuputara ndi-ayi, ka ha we rie. Ihe ọjọ adighi kwa n'ite ahu.
42
Ma otù nwoke siri na Beal-shalisha bia, butere onye nke Chineke achicha nke nkpuru mbu, orú ob͕e achicha barley, na ọka nke ubi n'akpa-ya. Ọ we si, Nye ndi-ayi, ka ha we rie.
43
Onye nējere ya ozi we si, Gini, M'gēche nka n'iru ọgu ndikom ise? Ọ si, Nye ndi-ayi, ka ha we rie; n'ihi na otú a ka Jehova siri, Ha gēri, rifọ kwa.
44
O we che ya n'iru ha, ha we rie, rifọ kwa, dika okwu Jehova si di.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25