bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Kings 6
2 Kings 6
Igbo 2006
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 7 →
1
Umu ndi-amuma we si Elaisha, Biko, le, ebe ayi onwe-ayi nēbi n'iru gi adikara ayi nkpa.
2
Biko, ka ayi jerue Jọdan, si kwa n'ebe ahu were, nwoke ọ bula otù ntuhie, mere onwe-ayi otù ebe n'ebe ahu, ibiri n'ebe ahu. Ọ si, Jenu.
3
Otù onye we si, Biko, kwere, soro ndi-orù-gi je. Ọ si, Mu onwem gēje.
4
O we so ha je. Ha we biarue Jọdan, b͕utue osisi.
5
O rue, mb͕e otù onye nēb͕utu ntuhie-ya, na anyu-ike dabàra na miri: o we tie nkpu, si, Ewó, onye-nwem! nke ahu bu ihe ariọtara ariọta.
6
Onye nke Chineke we si, Òle ebe ọ dara? Ọ we me ka ọ hu ebe ahu. O we b͕utue otù osisi, tubà ya n'ebe ahu, me ka anyu-ike se n'elu miri.
7
O si, Weliere onwe-gi. O we setia aka-ya, were ya.
8
Ma eze Siria nēbuso Israel agha; o we me ka ndi-orù-ya dua ya ọdu, si, N'ebe di otú a otú a ka ọmuma-ulo-ikwūm gādi.
9
Onye nke Chineke we zigara eze Israel ozi, si, Lezie onwe-gi anya, ka i ghara igabiga ebe ahu; n'ihi na n'ebe ahu ka Siria nāridata.
10
Eze Israel we ziga ozi n'ebe ahu nke onye nke Chineke siri ya dọ kwa ya aka na nti bayere ya; ewe debe ya ndu n'ebe ahu, ọ bughi otù ub͕ò, ọ bughi kwa ub͕ò abua.
11
Ma obi eze Siria anọghi n'otù ebe n'ihi ihe a; o we kpọ ndi-orù-ya, si ha, Ùnu agaghi-egosim onye nime ayi diri eze Israel?
12
Otù onye nime ndi-orù-ya we si, É-è, onye-nwem eze: kama Elaisha, bú onye-amuma nke nọ n'Israel, o nēgosi eze Israel okwu nile nke i nēkwu n'ime-ulo-ndina-gi.
13
Ọ si, Jenu, hu ebe ya onwe-ya nọ, ka m'we ziga kuta ya. Ewe gosi ya, si, Le, ọ nọ na Dotan.
14
O we ziga inyinya na ub͕ọ-ala na oké usu-ndi-agha n'ebe ahu: ha we bia n'abali, je obodo ahu buruburu.
15
Onye nējere onye nke Chineke ozi we bilie n'isi-ututu, pua, ma, le, usu-ndi-agha nāb͕a obodo ahu buruburu, ha na inyinya na ub͕ọ-ala. Nwa-okorọbia-ya we si ya, Ewó, onye-nwem! àyi gēme aṅa?
16
Ọ si, Atula egwu: n'ihi na ndi ayi na ha nọ di ọtutu kari ndi ha na ha nọ.
17
Elaisha we kpe ekpere, si, Jehova, biko, saghe anya-ya abua, ka ọ we hu. Jehova we saghe anya nwa-okorọbia ahu; o we hu: ma, le, ugwu ahu juputara n'inyinya na ub͕ọ-ala ọku buruburu Elaisha.
18
Ha we ridakute ya, Elaisha we kpere Jehova, si, Biko, were ìsì tie mba nka. O we were ìsì tie ha dika okwu Elaisha si di.
19
Elaisha we si ha, Nka abughi uzọ, nka abughi kwa obodo; sonum je, m'gēme kwa ka unu jekuru nwoke ahu onye unu nāchọ. O we me ka ha je Sameria.
20
O rue, mb͕e ha bara na Sameria, na Elaisha siri, Jehova, saghe anya ndikom ndia, ka ha we hu. Jehova we saghe anya-la, ha we hu; ma, le, ha nọ n'etiti Sameria.
21
Eze Israel we si Elaisha, mb͕e ọ huru ha, Nnam, #m'gētib͕u ha? #m'gētib͕u ha?
22
Ọ si, Etib͕ula ha: ì gētib͕u ndi i wereworo mma-agha-gi, were kwa uta-gi, dọta n'agha? dọba nri na miri n'iru ha, ka ha we rie, ṅu kwa, lakuru onye-nwe-ha.
23
O we mere ha oké oriri: ha we rie, ṅu kwa, o we zilaga ha, ha we lakuru onye-nwe-ha. Ma usu ndi nāpunara madu ihe nke Siria abataghi ọzọ n'ala Israel.
24
O rue, mb͕e nka gasiri, na Ben-hedad, bú eze Siria, chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, rigo, nọchigide Sameria n'agha.
25
Oké unwu uku we di na Sameria: ma, le, ha nānọchigide ya n'agha, rue mb͕e anēre isi inyinya-ibu ọgu ọla-ọcha anọ na otù uzọ n'uzọ anọ nke otù kab ǹsí nduru ọla-ọcha ise.
26
O rue, mb͕e eze Israel nāgabiga n'elu mb͕idi, na otù nwayi tikuru ya nkpu, si, Zọputa, onye-nwem eze.
27
Ọ si, Ọ buru na Jehova azọputaghi gi, òle ebe m'gēsi zọputa gi? ọ̀ bu site n'ebe-nzọcha-ọka, ma-ọbu site n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine?
28
Eze we si ya, Gini nēme gi? Ọ si, Nwayi a sirim, Nye nwa-gi nwoke, ka ayi we rie ya ta, nwam nwoke ka ayi gēri kwa echi.
29
Ayi we sie nwam nwoke, rie ya: m'we si ya n'ubọchi soro ya, Nye nwa-gi nwoke, ka ayi we rie ya: ma o zowo nwa-ya nwoke.
30
O rue, mb͕e eze nuru okwu nile nke nwayi ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile; (ma ya onwe-ya nāgabiga n'elu mb͕idi;) ndi Israel we le anya, ma, le, ákwà-nkpe dikwasi n'anu-aru-ya n'okpuru uwe-ya.
31
O we si, Ka Chineke mem otú a, ka O me kwa ihe ọzọ otú a, ma ọ buru na isi Elaisha nwa Shefat gēguzo n'aru ya ta.
32
Ma Elaisha nānọdu n'ulo-ya, ndi-okenye nānọdu kwa n'ebe ọ nọ: eze we ziga otù nwoke site n'iru ya: ma tutu onye-ozi ahu abiakute ya, ya onwe-ya siri ndi-okenye, Ùnu ahuwo na nwa ob͕u-madu a ezitewo iwezuga isim? hunu, mb͕e onye-ozi ahu nābia, mechienu uzọ, were ibo-uzọ kwagide ya: òlu ukwu abua nke onye-nwe-ya adighi n'azu ya?
33
Mb͕e ọ nọ nākpayere ha uka, le, onye-ozi ahu nāridakuru ya: ọ si, Le, ihe ọjọ a sitere n'aka Jehova; gini mere m'nēle anya Jehova ọzọ?
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 7 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25