bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Samuel 13
2 Samuel 13
Igbo 2006
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 14 →
1
O rue, mb͕e nka gasiri, na Absalom nwa Devid nwere nwa-nne-nwayi mara nma, aha-ya bu Tema; Amnon nwa Devid we hu ya n'anya.
2
O we di Amnon nkpà otú a, na o mere onwe-ya onye aru nādighi ike n'ihi Tema, bú nwa-nne-ya; n'ihi na nwa-ab͕oghọ nāmaghi nwoke ka ọ bu; o we di ike n'anya Amnon ime ya ihe ọ bula.
3
Ma Amnon nwere otù eyì, aha-ya bu Jonadab, nwa Shimea nwa-nne Devid: ma Jonadab bu nwoke mara ihe nke-uku.
4
O we si ya, Gini mere gi onwe-gi nāta aru otú a kwa-ututu, gi nwa eze? ì gaghi-egosim? Amnon we si ya, Tema, bú nwa-nne-nwayi Absalom nwa-nnem, ka mu onwem nāhu n'anya.
5
Jonadab we si ya, Dinakwasi n'ihe-ndina-gi, me onwe-gi onye aru nādighi ike: ma mb͕e nna-gi batara ihu gi, i gāsi ya, Biko, ka Tema, bú nwa-nnem, bata, ka o me kwa ka m'rie nri, ka o dozi kwa ihe-oriri ahu n'anyam, ka m'we hu ya, rie ya n'aka-ya.
6
Amnon we dina, mee onwe-ya onye aru nādighi ike: eze we bata ihu-ya, Amnon we si eze, Biko, ka Tema, bú nwa-nnem, bata, me achicha abua n'anyam, ka m'we rie ha n'aka-ya
7
Devid we zigara Tema ozi n'ulo, si, Biko, je n'ulo Amnon nwa-nne-gi, doziere ya ihe-oriri.
8
Tema we je n'ulo Amnon nwa-nne-ya; ma onye ahu nēdina edina. O we were utu ọka flour agwọrọ agwọ, gwọ ya, me achicha n'anya-ya, sie achicha ahu.
9
O were ite, wupu ha n'iru ya; ma ọ juru iri ha. Amnon we si, Me ka madu ọ bula si n'ebe m'nọ pua. Ha we pua, madu ọ bula, n'ebe ọ nọ.
10
Amnon we si Tema, Bubata ihe-oriri n'ime-ulo, ka m'we rie ya n'aka-gi. Tema we chiri achicha nke o mere, chitara Amnon nwa-nne-ya n'ime-ulo.
11
Ọ chita ha nso ya ka o rie, Amnon we jide ya, si ya, Bia, sorom dina, nwa-nnem.
12
Ọ si ya, É-è nwa-nnem, ewedalam n'ala; n'ihi na adighi-eme otú a n'Israel: emela ihe-nzuzu a.
13
Ma mu onwem, òle ebe m'gēme ka ita-utam la? ma gi onwe-gi, i gādi ka otù onye nime ndi-nzuzu n'israel. Ma ub͕u a, biko, gwa eze okwu; n'ihi na ọ gaghi-eb͕ochim n'ebe i nọ.
14
Ma ọ kweghi ige nti olu-ya: ọ di kwa ike kari ya, ọ we weda ya n'ala, soro ya dina.
15
Amnon we kpọ ya asì, bú ikpọ-asì di uku ri nne; n'ihi na ikpọ-asì ọ kpọrọ ya di uku kari ihu-n'anya ọ huru. Amnon we si ya, Bilie, la.
16
Ọ si ya, Emela otú a, n'ihi na ihe ọjọ uku a n'izilagam jọrọ njọ kari nke-ọzọ nke i merem. Ma o kweghi ige ya nti.
17
O we kpọ nwa-okorọbia-ya nke nejere ya ozi, si, Biko, si n'ebe m'nọ chupu nwayi a n'èzí, kpachie uzọ n'azu ya.
18
Ma uwe-nwudaa nwere aka di n'aru ya: n'ihi na uwe-nwuda di otú a ka umu-ndinyom eze ndi nāmaghi nwoke nēyi. Onye nējere ya ozi we me ka ọ pua n'èzí, we kpachie uzọ n'azu ya.
19
Tema we būru ntu n'isi-ya dọwa uwe-nwuda nwere aka nke di n'aru ya; ọ tukwasi aka-ya n'isi-ya, we la, nēje nēti nkpu.
20
Absalom, bú nwa-nne-ya, we si ya, Amnon nwa-nne-gi, ò sorowo gi dina? ma ub͕u a, nwa-nnem, b͕a nkiti: nwa-nne-gi ka ọ bu; atukwasila obi-gi n'ihe a. Tema we nọdu dika nwayi arapuru nání ya, n'ulo Absalom nwa-nne-ya.
21
Ma eze, bú Devid, nuru ihe ndia nile, iwe-ya we di ọku nke-uku.
22
Ma Absalom agwaghi Amnon okwu ọ bula ma ọ bu nke di njọ ma-ọbu nke di nma: n'ihi na Absalom kpọrọ Amnon asì. n'ihi na ọ wedara Tema nwa-nne-ya n'ala.
23
O rue, mb͕e arọ abua zuru ezu gasiri, na Absalom nwere ndi nākpacha aji anu na Beal-hezoa, nke di n'akuku Efraim: Absalom we kpọ umu-ndikom eze nile.
24
Absalom we biakute eze, si, Biko, le, Orù-gi nwere ndi nākpacha aji anu; biko, ka eze na ndi-orù-ya soro orù gi je.
25
Eze we si Absalom, É-è, nwam, biko, emela ka ayi nile je, ka ayi we ghara ibu edi arọ́ n'isi gi. O rugid ya: ma o kweghi ije, ma ọ gọziri ya.
26
Absalom we si, Ma ọ buru na i jeghi, biko, ka Amnon nwa-nnem soro ayi je. Eze we si ya, Nìhi gini ka ọ gēsoro gi je?
27
Absalom we rugide ya, o we zie Amnon na umu-ndikom eze nile ka ha soro ya je.
28
Absalom we nye ndi-orù-ya iwu, si, Biko, lezienu anya. mb͕e obi Amnon di nma na manya-vine; mb͕e m'si kwa unu, Tibuenu Amnon, menu ka ọ nwua, unu atula egwu: ọ̀ bughi na mu onwem enyewo unu iwu? dinu ike, buru-kwa-nu ndi-dìnkpà.
29
Umu-okorọbia Absalom we me Amnon dika Absalom nyere iwu. Umu-ndikom eze nile we bilie, rikwasi, nwoke ọ bula n'elu inyinya mule-ya, ha we b͕alaga.
30
O rue, mb͕e ndi ahu nọ n'uzọ, na akukọ ahu biaruru Devid nti, si, Absalom eb͕uwo umu-ndikom eze nile, ọ dighi kwa otù onye fọduru nime ha.
31
Eze we bilie, dọwa uwe-ya nile, dina n'ala; ndi-oru-ya nile nēguzo kwa, ha na uwe-ha dọwara adọwa.
32
Jonadab, nwa Shimea nwa-nne Devid, we za, si, Ka onye-nwem ghara isi na emewo ka umu-okorọbia nile, bú umu eze, nwua; n'ihi na Amnon, nání ya, nwuru anwu: n'ihi na edoro nka n'okwu-ọnu Absalom site n'ubọchi o wedara Tema nwa-nne-ya n'ala.
33
Ma ub͕u a ka onye-nwem, bú eze, ghara ido okwu a n'obi-ya, si, Umu-ndikom eze nile anwuwo, n'ihi na Amnon, nání ya, nwuru anwu.
34
Absalom we b͕alaga. Nwa-okorọbia nke nēche nche we welie anya-ya hu, ma, le, ndi riri nne nābia site n'uzọ akuku ugwu di n'azu ya.
35
Jonadab we si eze, Le, umu-ndikom eze abiawo: dika okwu orù-gi kwuru, otú a ka ọ di.
36
O rue na, mb͕e o kwubìri okwu, le, umu-ndikom eze biara, welie olu-ha, kwa ákwá: ọzọ kwa eze na ndi-orù-ya nile kwara ákwá di uku ri nne.
37
Ma Absalom b͕alagara jekuru Talmai nwa Amihua, eze Geshua. Devid we nēru újú nwa-ya ubọchi nile.
38
Absalom we b͕alaga, jerue Geshua, nọ n'ebe ahu arọ atọ.
39
Agu nāgusi nkpuru-obi Devid, bú eze, ike ipukuru Absalom: n'ihi na akasiri ya obi bayere Amnon, n'ihi na ọ nwuwo.
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 14 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24