bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Samuel 5
2 Samuel 5
Igbo 2006
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 6 →
1
Ebo Israel nile we biakute Devid rue Hebron, kwue, si, Le, ọkpukpu-gi na anu-aru-gi ka ayi bu.
2
Na mb͕e gara aga, mb͕e Sọl bu eze-ayi, gi onwe-gi bu onye nēdupu na onye nēdubata Israel: Jehova we si gi, Gi onwe-gi gāzù ndim, bú Israel onwe-gi gābu kwa onye-ndú Israel.
3
Ndi-okenye nile nke Israel we biakute eze rue Hebron; ha na eze, bú Devid, we b͕a ndu nime Hebron n'iru Jehova: ha we te Devid manu ibu eze Israel.
4
Onye b͕ara orú arọ na iri ka Devid bu mb͕e ọ malitere ibu eze, ọgu arọ abua ka ọ bu eze.
5
Na Hebron ka ọ bu eze Juda arọ asa na ọnwa isi: na Jerusalem ka ọ bu kwa eze Israel na Juda nile orú arọ na iri na atọ.
6
Eze na ndikom-ya we jerue Jerusalem jekuru ndi Jebus, bú ndi bi n'ala ahu: ha we gwa Devid okwu, si, I gaghi-abata n'ebe a, kama ndi-ìsì na ndi-ngwurọ gēme ka i wezuga onwe-gi: nāsi, Devid agaghi-abata n'ebe a.
7
Devid we were ebe ewusiri ike nke Zaion; nke ahu bu obodo Devid.
8
Devid we si n'ubọchi ahu, Onye ọ bula nke netib͕u ndi Jebus, ya jerue ebe miri si aga, we tib͕ue ndi-ngwurọ na ndi-ìsì, bú ndi nkpuru-obi Devid nākpọ asì. N'ihi nka ka ha nāsi, Ndi-ìsì na ndi-ngwurọ nọ; ọ gaghi-abà n.ulo.
9
Devid we biri n'ebe ahu ewusiri ike, o we kpọ ya obodo Devid. Devid we wue obodo gburugburu site na Milo we rue n'ime-ya.
10
Devid we nāga n'iru, nēje nādi uku; Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, nọye-kwa-ra ya.
11
Hairam, bú eze Taia, we zigara Devid ndi-ozi, na osisi cedar, na ndi-ọ̀kà n'osisi, na ndi-ọ̀kà na nkume: ha we wuere Devid ulo.
12
Devid we mara na Jehova emewo ya ka o guzosie ike ibu eze Israel, ọ ma-kwa-ra na O buliwo ala-eze-ya n'elu n'ihi ndi-Ya, bú Israel.
13
Devid we si na Jerusalem kuru ndi-iko nwayi na ndinyom ọzọ, mb͕e o siri na Hebron biasi: ewe muara Devid umu-ndikom na umu-ndinyom ọzọ
14
Ndia bu kwa aha ndi amuru ya na Jerusalem; Shamua, na Shobab, na Netan, na Solomon,
15
na Ibha, na Elishua; na Nefeg, na Jafia;
16
na Elishama, na Eliada, na Elifelet.
17
Ndi Filistia we nu na ha tere Devid manu ibu eze Israel, ndi Filistia nile we rigo ichọ Devid; Devid we nu ya, rida n'ebe ahu ewusiri ike.
18
Ma ndi Filistia biara, b͕asa onwe-ha na ndagwurugwu Refaim.
19
Devid we jua Jehova ase, si, M'gārigokuru ndi Filistia? Ì gēnye ha n'akam? Jehova we si Devid, Rigo: n'ihi na aghaghm inye ndi Filistia n'aka-gi.
20
Devid we biarue Beal-perazim, Devid we tib͕ue ha n'ebe ahu; o we si, Jehova ekwopuwo megide ndi-irom n'irum, dika nkwopu miri. N'ihi nka ka ọ kpọrọ aha ebe ahu Beal-perazim.
21
Ha we rapu arusi nile ha n'ebe ahu, Devid na ndikom-ya we chiri ha.
22
Ndi Filistia we rigo kwa ọzọ, b͕asa onwe-ha na ndagwurugwu Refaim.
23
Devid we jua Jehova ese, O si, Arigola: ga gburugburu rue n'azu ha, biakute ha na ncherita-iru osisi balsam.
24
O gēru kwa, mb͕e i nuru olu ikiti-ukwu n'elu osisi balsam ahu, mb͕e ahu ka i gēme ngwa: n'ihi na mb͕e ahu ka Jehova puworo n'iru gi itib͕u ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia.
25
Devid we me otú a, dika Jehova nyere ya iwu; o we tib͕ue ndi Filistia site na Geba rue ebe i nāba Gezea.
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 6 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24