bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Samuel 23
2 Samuel 23
Igbo 2006
← Chapter 22
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 24 →
1
Ma ndi a bu okwu ikpe-azu nke Devid. Ihe nke si n'ọnu Devid nwa Jesi puta, Na ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, bú onye emere ka o bilie, Bayere onye nke Chineke Jekob etere manu, Na onye nwere olu di utọ n'ibù abù ọma Israel:
2
Mọ nke Jehova kwuru site n'ọnum, Okwu-Ya di kwa n'irem.
3
Chineke Israel siri, Mu ka Oké Nkume Israel gwara okwu: Onye nāchi madu bu onye ezi omume, Ọ nāchi n'egwu Chineke
4
Ọ di kwa ka ìhè ututu, mb͕e anyanwu nāwa, Bú ututu igwe-oji nādighi; Mb͕e ahihia ndu nēpuputa n'ala, Site n'ọmumu-anyanwu, site na miri-ozuzo.
5
N'ihi na ọ bughi otú a ka ulom di n'ebe Chineke nọ; N'ihi na ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka Ọ b͕aworo nyem, Bú ọb͕ub͕a-ndu edoworo n'usoro n'ihe nile, nke edebewo-kwa-ra: N'ihi na nzọputam nile, na ihe-utọ nile, N'ezie Ọ gaghi-eme ka o pute.
6
Ma ndi jọb͕uru onwe-ha di ka ogwu anēkopu ekopu, ha nile, N'ihi na ọ bughi aka ka eji ewere ha:
7
Ma nwoke nke nēmetu ha aka Gēnweju ígwè na osisi ube aka: Agēwere kwa ọku suresia ha n'ọnọdu-ha.
8
Ndia bu aha ndi-dike, ndi Devid nwere; Josheb-bashebet onye-Tahkemonait, onye-isi nke ndi-ọchi-agha; onye ahu bu Adino onye-Eznait: onye nēmegide nnù ndikom abua eb͕uru n'otù ub͕ò.
9
Nke so ya bu Eleeza nwa Dodai nwa onye Ahoa, bú otù onye n'etiti ndi-dike atọ ahu ndi ha na Devid nọ mb͕e ha rara onwe-ha nye rue ọnwu n'etiti ndi Filistia ndi chikọtara onwe-ha n'ebe ahu ibu agha, ma ndikom Israel rigoro:
10
onye ahu biliri, tib͕u ndi Filistia rue mb͕e ike gwuru aka-ya, aka-ya we rapara na mma-agha: Jehova we zọputa nzọputa uku n'ubọchi ahu; ndi Israel we laghachi soro ya n'azu nání iyipu ihe di n'aru ndi eb͕uru eb͕u.
11
Nke so ya bu Shama nwa Agi onye-Hararait. Ndi Filistia we chikọta onwe-ha n'usu, ma òkè ubi di n'ebe ahu juputara na lentil; ma ndi Israel b͕apuru n'iru ndi Filistia.
12
O we guzo onwe-ya n'etiti òkè ahu, naputa ya, tib͕ue ndi Filistia: Jehova we zọputa nzọputa uku.
13
Ndikom atọ n'etiti orú ndi-isi na iri ahu we rida, biakute Devid n'owuwe-ihe-ubi rue ọb͕à Adulam; ma usu ndi Filistia amawo ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Refaim.
14
Ma Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike mb͕e ahu, ma ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di na Bet-lehem mb͕e ahu.
15
Devid we chọsie ike, si, Ònye gēme ka m'ṅua miri sitere n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama:
16
Ndi-dike atọ ahu we wapue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, sere miri n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama, ha we būru ya, kutere Devid: ma o kweghi iṅu ya, o we wusiere ya Jehova.
17
Ọ si, Ya burum ihe-árú, Jehova, ime ihe a: #m'gāṅu ọbara ndikom ahu ndi ji ndu-ha n'aka-ha nēje? o kweghi kwa iṅu ya. Ihe ndia ka ndi-dike atọ ahu mere.
18
Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, nwa Zeruaia, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu. Onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n'etiti ndikom atọ ahu.
19
Àdighi-asọpuru ya kari ndikom atọ ahu? o we ghọrọ ha onye-isi: ma o rughi ndikom atọ mbu ahu.
20
Benaia kwa, nwa Jehoiada, nwa nke nwoke bu dìnkpà nke Kabzeel, onye di uku n'ime ihe, onye ahu tib͕uru umu-ndikom abua nke Ariel nke Moab: onye ahu rida-kwa-ra tib͕ue ọdum n'etiti olùlù n'ubọchi snow nēzò.
21
Onye ahu tib͕u-kwa-ra nwoke ahu, bú onye Ijipt, bú nwoke mara nma ile anya: ube di kwa n'aka onye Ijipt ahu; ma o ji nkpa-n'aka ridakuru ya, napu ube ahu n'aka onye Ijipt n'ike, were ube-ya b͕ue ya.
22
Ihe ndia ka Benaia nwa Jehoiada mere, we nwe aha n'etiti ndi-dike atọ ahu.
23
Anāsọpuru ya kari orú ndikom na iri ahu, ma o rughi ndikom atọ mbu ahu. Devid we do ya ibà n'etiti ndi nānu okwu-ya.
24
Asahel nwa-nne Joab bu otù onye n'etiti orú ndikom na iri ahu; Elhanan nwa Dodo nke Bet-lehem;
25
Shama onye Harod, Elika onye Harod;
26
Hilez onye-Paltait, Ira nwa Ikesh onye Tekoa;
27
Abieza onye Anatot, Mebunai onye Husha;
28
Zalmon onye Ahoa, Maharai onye Netofa;
29
Hileb nwa Beana onye Netofa, Itai nwa Ribai nke Gibea umu Benjamin;
30
Benaia onye Piraton, Hidai nke miri-iyi Gaash;
31
Abi-albon onye Araba, Azmavet onye Bahurim;
32
Eliahba onye Shaalabin, nke umu Jashen, Jonatan;
33
Shama onye-Hararait, Ahiam nwa Shara onye-Ararait;
34
Elifelet nwa Ahasbai, nwa onye Meakat, Eliam nwa Ahitofel onye Gailo;
35
Hezro onye Kamel, Paarai onye Arab;
36
Igal nwa Netan nke Zoba, Bani onye Gad;
37
Zelek onye Amon, Naharai onye Beirot, onye nēbu ihe-agha Joab nwa Zeruaia;
38
Ira onye Jeta, Gareb onye Jeta;
39
Uraia onye Het: ha nile di orú ndikom na iri na asa.
← Chapter 22
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 24 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24