bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Samuel 15
2 Samuel 15
Igbo 2006
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 16 →
1
O rue, mb͕e nka gasiri, na Absalom doziri onwe-ya ub͕ọ-ala na inyinya, na ọgu ndikom abua na iri ndi nāb͕a ọsọ n'iru ya.
2
Absalom we bilie n'isi-ututu, guzo n'akuku uzọ ọnu-uzọ-ama: o rue, mb͕e nwoke ọ bula nwere okwu nke gēru eze nti ka o we kpe ya, na Absalon kpọro ya, si, Òle obodo gi onwe-gi si bia? Ọ si, Otú nime ebo Israel ka orù-gi si bia.
3
Absalom we si ya, Le, okwu-gi nile di nma, zi kwa ezi; ma ọ dighi onye nēge gi nti site n'ebe eze nọ.
4
Absalom we si, Ònye gēdom onye-ikpe n'ala nka, ka nwoke ọ bula nke nwere okwu ma-ọbu ikpé we biakutem, m'we kpọ ya onye ezi omume!
5
O rue, mb͕e nwoke ọ bula biaruru ya nso ikpọ isi ala nye ya, na o setiri aka-ya, jide ya, sututu ya ọnu.
6
Absalom we mere Israel nile dika okwu a si di, bú ndi biakutere eze ka ekpe ha ikpe: Absalom we zuru obi ndikom Israel n'ori.
7
O rue, n'ọgwugwu ọgu arọ abua, na Absalom siri eze, Biko, ka m'je kwughachi nkwam, nke, m'kwere Jehova, nime Hebron.
8
N'ihi na orù-gi kwere nkwa mb͕e m'biri na Geshua nime Siria, si, Ọ buru na Jehova eme ka m'laghachi na Jerusalem n'ezie, m'gēfè kwa Jehova òfùfè.
9
Eze we si ya, Je n'udo. O we bilie, jerue Hebron.
10
Absalom we ziga ndi-nledo n'ebo nile nke Israel, si, Mb͕e unu nuru olu opì-ike, unu gāsi kwa, Absalom bu eze na Hebron.
11
Ọgu ndikom iri we si na Jerusalem soro Absalom je, bú ndi akpọrọ, ha we nēje n'izu-okè obi-ha; ma ha amaghi ihe ọ bula.
12
Absalom we zipu Ahitofel onye Gailo, bú onye nādu Devid ọdu, n'obodo-ya, bú Gailo mb͕e ọ nāchu àjà. Nkekọta ahu we di ike; ndi Israel nāba kwa uba nēje n'iru n'iru n'aka Absalom.
13
Onye nēgosi ihe we biakute Devid, si, Obi ndikom Israel di iso Absalom n'azu.
14
Devid we si ndi-orù-ya nile, ndi ya na ha nọ na Jerusalem, Bilienu, ka ayi b͕apu; n'ihi na ayi enweghi nb͕apu n'iru Absalom: menu ngwa ije, ka o we ghara ime ngwa rue ayi aru, me ka ihe ọjọ kwagide ayi, were ọnu mma-agha tib͕ue obodo a.
15
Ndi-orù eze we si eze, Dika ihe nile si di nke onye-nwem, bú eze, garọputa, le, ndi-orù-gi.
16
Eze we pua, ya na ulo-ya nile ndi soro ya n'ukwu n'ukwu. Eze we rapu ndinyom iri, bú ndi-iko-ya nwayi, iche ulo.
17
Eze we pua, ya na ndi-ya nile ndi soro ya n'ukwu n'ukwu; ha we nọdu na Bet-meahak.
18
Ndi-orù-ya nile we nāgabiga n'akuku ya; ndi Keret nile, na ndi Pelet nile, na ndi Gat nile, bú nnù ndikom na ọgu iri ndi siri na Gat bia, soro ya n'ukwu n'ukwu, nāgabiga kwa n'iru eze.
19
Eze we si Itai, bú onye Gat, N'ìhi gini ka gi onwe-gi nēso kwa ayi je? laghachi, soro eze nọdu: n'ihi na onye ala ọzọ ka i bu, onye rapuru ala-ya ka i bu kwa; laghachi n'ebe-gi.
20
nyahuru bu ọbibia-gi, ọ̀ bu ta ka m'gēme gi ka i ṅagharia n'iso ayi je, n'ihi na mu onwem nēje ebe mu onwem nēje? gi laghachi, me kwa ka umu-nne-gi laghachi; ka ebere na ezi-okwu diyere gi.
21
Itai we za eze, si, Jehova nādi ndu, onye-nwem, bú eze, nādi kwa ndu, n'ezie n'ọnọdu ebe onye-nwem, bú eze, gānọ, ma-ọbu inwu ọnwu ma-ọbu idi ndu, n'ezie n'ebe ahu ka orù-gi gānọ kwa.
22
Devid we si Itai, Je gabiga. Itai onye Gat we gabiga, ya na ndikom-ya nile, na umu-ntakiri nile nke di n'aka-ya.
23
Ala ahu nile nākwa ákwá n'oké olu, ndi ahu nile nāgabiga kwa: eze nāgabiga kwa miri-iyi Kidron, ndi-ya nile nāgabiga kwa, n'iru uzọ ọzara.
24
Ma, le, Zedok bia-kwa-ra, ya na ndi Livai nile, nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke; ha we dọba ib͕e Chineke, Abaiata we rigo, rue mb͕e ndi ahu nile siri n'obodo gabigasia.
25
Eze we si Zedok Bughachi ib͕e Chineke n'obodo; o buru na ahutam amara n'iru Jehova, Ọ gēweghachim, me ka m'hu ya na ebe-obibi-Ya:
26
ma ọ buru na Ọ si otú a, Ihe-gi atọghm utọ; lem, Ya mem otú ọ di nma n'anya-Ya.
27
Eze we si Zedok, bú onye-nchu-àjà, Ọ̀ bughi onye-ọhu-uzọ ka i bu? laghachi n'obodo n'udo, unu na Ahimaaz nwa-gi, na Jonatan nwa Abaiata, bú umu-unu abua.
28
Lenu, mu onwem ganānọgide na ngabiga-miri nke ọzara, rue mb͕e okwu gēsi n'ebe unu nọ bia igosim ka ihe si di.
29
Zedok na Abaiata we bughachi ib͕e Chineke na Jerusalem: ha we nọdu n'ebe ahu.
30
Ma Devid nārigo na nrigo ugwu Olive, nārigo nākwa ákwá; ekpuchi-kwa-ra isi-ya, ya onwe-ya nēje kwa b͕ara ukwu efu: ndi nile ndi soro ya je kpuchi-kwa-ra, nwoke ọ bula isi-ya, ha we rigo, nārigo nākwa ákwá.
31
Otú onye we gosi Devid, si, Ahitofel di n'etiti ndi-nkekọta ahu ndi nēso Absalom. Devid we si, Biko, Jehova, me ka idu-ọdu Ahitofel ghọ ihe-nzuzu.
32
O rue, na mb͕e Devid biaruru elu nrigo ahu, ebe ọ nākpọ isi ala nye Jehova, le, Hushai, bú onye-Akait, biara izute ya, ya na uwe-ya adọwara adọwa, na ájá n'elu isi-ya.
33
Devid we si ya, Ọ buru na i sorom gabiga, i gābu-kwa-ram ibu:
34
ma ọ buru na i laghachi n'obodo, we si Absalom, Orù-gi ka m'bu, eze; dika mu onwem bu orù nna-gi na mb͕e gara aga, ub͕u a mu onwem gābu kwa orù-gi: i gēmebi-kwa-ram idu-ọdu Ahitofel.
35
Gi na ha anọghi kwa n'ebe ahu, bú Zedok na Abaiata ndi-nchu-àjà? o gēru kwa, na okwu ọ bula i gānu site n'ulo eze, i gēgosi ya Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà.
36
Le, ha na umu-ha ndikom abua nọ n'ebe ahu, bú Ahimaaz nwa Zedok, na Jonatan nwa Abaiata; site n'aka-ha ka unu gēzite-kwa-ram okwu ọ bula unu gānu.
37
Hushai, bú eyi Devid, we ba n'obodo; Absalom ba-kwa-ra nime Jerusalem.
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 16 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
Recommended Reading
Commentary
2 Samuel Commentaries
→
Devotional
2 Samuel Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→