bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Samuel 20
2 Samuel 20
Igbo 2006
← Chapter 19
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 21 →
1
Ma ọ dabatara otù nwoke jọb͕uru onwe-ya inọ n'ebe ahu, aha-ya bu Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin: o we fùa opì-ike, si, Ayi enweghi òkè nime Devid, ayi enweghi kwa ihe-nketa nime nwa Jesi: nwoke ọ bula, ya la n'ulo-ikwū-ya, Israel.
2
Ndikom nile nke Israel we si n'iso Devid rigo, so Sheba nwa Bikri: ma ndikom Juda rapara n'aru eze-ha, site na Jọdan we rue Jerusalem.
3
Devid we biarue ulo-ya na Jerusalem; eze we chiri ndinyom iri ahu, bú ndi-iko-ya, ndi o mere ka ha nọdu iche ulo, o we tiye ha n'ulo-ndebe, nāzu ha, ma ọ bakurughi ha. Ha we buru ndi emechibidoworo uzọ rue ubọchi ọnwu-ha, nādi ndu dika ndinyom di-ha nwuru.
4
Eze we si Amasa, Kpọkọtaram ndikom Juda n'ubọchi atọ, gi onwe-gi guzo kwa n'ebe a.
5
Amasa we je ikpọkọta Juda: ma ọ nọrọ ọdù kari mb͕e akara àkà nke ọ kaworo ya.
6
Devid we si Abishai, Ub͕u a Sheba nwa Bikri gēmejọ ayi kari Absalom: gi onwe-gi chiri ndi-orù onye-mwe-gi, chua ya n'azu, ka o we ghara ichọtara onwe-ya obodo ufọdu ewusiri ike, we naputa onwe-ya n'anya-ayi.
7
Ndikom Joab we soro ya pua, ha na ndi Keret na ndi Pelet, na ndi-dike nile: ha we si na Jerusalem pua, ichu Sheba nwa Bikri n'azu.
8
Mb͕e ndi ahu nọ n'akuku nkume uku nke di na Gibeon, Amasa biara n'iru ha. Ma ekeworo Joab ihe-ọkiké, uwe-nwuda-ya ka o yikwasiri, ihe-ọkiké di kwa n'elu ya, ya na mma-agha ekekọtara n'úkwù-ya n'ọbọ-ya; ma mb͕e Joab putara mma-agha we dapu.
9
Joab we si Amasa, Ọ̀ bu n'udo ka i nọ, nwa-nnem? Joab we were aka-nri-ya jide Amasa n'afu-ọnu isutu ya ọnu.
10
Ma Amasa elezighi anya na mma-agha nke di n'aka Joab: o we were ya tie ya n'okpuru ọgiriga nke-ise, wusi ngiri-afọ-ya n'ala, ma o tighi kwa ya ọzọ; o we nwua. Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, we chua Sheba nwa Bikri n'azu.
11
Ma otù nwoke n'etiti umu-okorọbia Joab guzoro n'akuku ya, si, Onye ọ bula ihe Joab nātọ utọ, na onye ọ bula diri Devid, ya so Joab n'azu.
12
Ma Amasa nāturu n'ọbara n'etiti uzọ atuliri atuli. Nwoke ahu we hu na ndi Israel nile guzoro, o we bupu Amasa n'uzọ atuliri atuli chigharia n'ọhia, tukwasi uwe n'elu ya, mb͕e ọ huru na onye ọ bula nke biara n'ebe ọ di guzoro.
13
Mb͕e ebupusiri ya n'uzọ atuliri atuli, ndikom nile gabigara iso n'azu Joab, ichu Sheba nwa Bikri n'azu.
14
O we gabiga n'ebo nile nke Israel rue Ebel, na Bet-meaka, na ndi Bia nile: ewe kpọkọta ha, ha we bia so kwa ya n'azu.
15
Ha we bia nọchigide ya n'agha n'Ebel Bet-meaka, wukọta ihe-ntukọba imegide obodo ahu, o we guzo nime ékpè: ndi nile soro Joab nēbibimb͕idi, ime ka ọ da.
16
Otù nwayi nke mara ihe we si n'obodo ahu kpọ òkù, si, Nurunu, nurunu; biko, sinu Joab, Biarue nso n'ebe a, ka m'gwa gi okwu.
17
O we biarue ya nso; nwayi ahu we si, Gì onwe-gi bu Joab? Ọ si, Mu onwem bu ya. Nwayi ahu we si ya, Nuru okwu nile nke orù-gi nwayi. Ọ si Anamanu nọ̄.
18
Nwayi ahu we kwue, si, Ha nēkwu ekwu na mbu, si, Ha aghaghi iju ase n'Ebel: otú a ka ha kwuzu-kwa-ra okwu.
19
Mu onwem bu otù onye nime ndi-udo ndi kwesiri ntukwasi-obi n'Israel: gi onwe-gi nāchọ ime ka otù obodo na otù nne n'Israel nwua: n'ìhi gini ka i gēloda ihe-nketa Jehova?
20
Joab we za, si, Ya burum ihe-árú, ya burum ihe-árú; m'gaghi-eloda ma-ọli, m'gaghi-ebibi kwa ma-ọli.
21
Ọ bughi otú a ka okwu a di: kama otù nwoke nke sitere n'ugwu Efraim, Sheba nwa Bikri bu aha-ya, o weliri aka-ya imegide eze, bú imegide Devid: nyenum ya, nání ya, ka m'si n'obodo a la. Nwayi ahu we si Joab, Le, agātuputara gi isi-ya nime mb͕idi.
22
Nwayi ahu we biakute ndi obodo ahu nile n'amam-ihe-ya. Ha we bipu isi Sheba nwa Bikri, tupuru ya Joab. O we fùa opì-ike, ha we si n'obodo ahu b͕asa, nwoke ọ bula ọ la n'ulo-ikwū-ya. Joab we lata na Jerusalem jekuru eze.
23
Ma Joab bu onye-isi usu-ndi-agha nile nke Israel: Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret, bu kwa onye-isi ndi Pelet:
24
Adoram bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè: Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta:
25
Sheva bu ode-akwukwọ: Zedok na Abaiata bu ndi-nchu-àjà.
26
ọzọ kwa, Ira onye Jaia buru Devid onye-isi n'ije ozi.
← Chapter 19
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 21 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24