bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Samuel 22
2 Samuel 22
Igbo 2006
← Chapter 21
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 23 →
1
Devid we gwa Jehova okwu nile nke abù a n'ubọchi Jehova naputara ya n'ọbu-aka ndi-iro-ya nile na n'ọbu-aka Sọl:
2
ọ we si, Jehova bu oké nkumem, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka m'b͕apu, Onye m'nwere;
3
Ọ bu Chineke nke oké nkumem, anamab͕abà nime Ya; Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum, na ebe-nb͕alagam; Onye-nzọputam, I nāzọputam n'ihe-ike.
4
Onye-anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova, Ewe zọputam n'aka ndi-irom.
5
N'ihi na ebili-miri nke ọnwu b͕aram buruburu, Miri-iyi nile nke jọb͕uru onwe-ya nēme ka m'tua egwu.
6
Udọ̀ nile nke ala-mọ dim buruburu; Ọnyà nile nke ọnwu biara n'irum.
7
Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam, Ọ bu Chinekem ka m'nākpọku: O we si n'ulo uku Ya nu olum, Nkpu m'tikuru Ya ba-kwa-ra na nti-Ya abua.
8
Ala we me nkpatu ma kwa jijiji, Nto-ala nile nke elu-igwe nāma jijiji, Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku.
9
Anwuru-ọku rigoro n'imi-Ya, Ọku nēsi kwa n'ọnu-Ya ripia: Afunwuru icheku site na ya.
10
O rulata-kwa-ra elu-igwe, rida; Oké ọchichiri di kwa n'okpuru ukwu-Ya abua.
11
O we nọkwasi n'elu cherub dika inyinya, we fere: Ewe hu Ya n'elu nkù ìfùfè.
12
O we do ọchichiri buruburu Ya ka ọ buru ulo-ntu, Bú nchikọta miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé.
13
Site n'onwunwu nke nēnwu n'iru Ya Afunwuru icheku ọku.
14
Jehova si n'elu-igwe nāma éb͕è-elu-igwe, Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa-ka olu-Ya da.
15
O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa; Àmùmà kwa, O we chusa ha.
16
Ewe hu ebe osimiri si erù, Anēkpughe ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi, N'ibasi-nba-ike nke Jehova, Site n'ume nke iku-ume nke imi-Ya.
17
O si n'elu zìe, kurum, Dọputam n'ọtutu miri;
18
Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike, N'aka ndi nākpọm asì; n'ihi na ha nwere ume karim
19
Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam: Ma Jehova burum ihe-ndabere.
20
O we me ka m'puta rue ebe sara mbara: Ọ nādọputam, n'ihi na ihem tọrọ Ya utọ.
21
Jehova nēnyeghachim dika ezi ọmumem si di: Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka Ọ nēmeghachim ọzọ.
22
N'ihi na edebewo uzọ nile nke Jehova, Emebighkwam iwu n'ipu n'aka Chinekem.
23
N'ihi na ikpé-Ya nile di n'irum: Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga onwem n'ebe ha di.
24
M'we zue okè n'ebe Ọ nọ, Edebe-kwa-ram onwem pua n'ajọ omumem.
25
Jehova we meghachim dika ezi omumem si di; Dika idi-ọcham n'anya-Ya si di.
26
N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere, N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè;
27
N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha; Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi Onye-nb͕á.
28
I gāzọputa kwa ndi ewedara n'ala: Ma anya-Gi abua dikwasi ndi di elu, ka I we me ka ha di ala.
29
N'ihi na Gi onwe-gi bu oriọnam, Jehova: Jehova nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu.
30
N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe: Anamesite na Chinekem wubiga mb͕idi.
31
Chineke, uzọ-Ya zuru okè: Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha; Ọta ka ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.
32
N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova? Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi?
33
Chineke bu ebem siri ike nke di ike nke-uku: Ọ nākwazu kwa uzọm.
34
O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele: N'elu ebem di elu ka Ọ nēguzokwam.
35
O nēzí akam abua ibu agha; Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.
36
I nyewokwam ọta nzọputa-Gi: Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.
37
I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum, Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.
38
Ka m'chua ndi-irom, we kpochapu ha; Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.
39
M'we me ka ha gwusia, anamamapú kwa ha, ha agaghi-ebili kwa: Ha we da n'okpuru ukwum abua.
40
I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha: I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.
41
Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha, Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.
42
Ha nāgha anya, ma ọ dighi onye nāzọputa ha; N'ebe Jehova nọ ka ha nāgha anya, ma Ọ zaghi ha.
43
Anamesu kwa ha me ka ha di ka ájá ala, Anamegwe ha me ka ha di ka apiti èzí, anametisa ha.
44
I we me ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim; I nēdebem ka m'buru isi mba nile ọzọ: Ndi m'nāmaghi gēfèm òfùfè.
45
Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum: Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti.
46
Ndi ala ọzọ nāta aru, Ke onwe-ha ihe-ọkiké, si n'ebe-nmechibido-ha puta.
47
Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa; Chineke nke oké nkume nzọputam di kwa elu:
48
Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀, Onye nēme kwa ka ndi di iche iche rida n'okpurum,
49
Onye nēme kwa ka m'si n'aka ndi-irom pua: I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem: I nānaputam n'aka madu nēme ihe ike.
50
N'ihi nka ka m'gēkele Gi, Jehova, n'etiti mba ọzọ, Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma.
51
Ọ nēme ka nzọputa eze-Ya di uku: Ọ nēme-kwa-ra onye nke Ya etere manu ebere, Bú Devid, Ọ nēme-kwa-ra nkpuru-ya ebere rue mb͕e ebighi-ebi.
← Chapter 21
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 23 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24