bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Samuel 16
2 Samuel 16
Igbo 2006
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 17 →
1
Devid we gabiga elu nrigo nke-ntà, ma, le, Ziba, onye nējere Mefiboshet ozi, zutere ya, chiri inyinya-ibu abua ejikwara ejikwa, ọgu ob͕e achicha iri di kwa n'elu ha, na ọgu uyọkọ nkpuru-vine amiri ami ise, na ọgu nkpuru mb͕e okpom-ọku ise, na otù karama-akpukpọ manya-vine.
2
Eze we si Ziba, Gina ka i gēji ihe ndia me? Ziba we si, Inyinya-ibu ndia bu ka ndi ulo eze we nọkwasi ha; achicha na nkpuru mb͕e okpom-ọku bu ka umu-okorọbia we rie ha; manya-vine bu ka ndi nāda mbà nọzara we ṅua.
3
Eze we si, Ma òle ebe nwa onye-nwe-gi nọ? Ziba we si eze, Le, ọ nānọ na Jerusalem: n'ihi na ọ siri, Ta ka ulo Israel gēnyeghachim ala-eze nnam.
4
Eze we si Ziba, Le, gi gēnwe ihe nile Mefiboshet nwere. Ziba we si, Anamakpọ isi ala; ka m'huta amara n'iru gi, onye-nwem, bú eze.
5
Eze, bú Devid, we biarute Bahurim, ma, le, otú nwoke nke sitere n'ab͕uru ulo Sọl nēsi n'ebe ahu puta, aha-ya bu Shimai, nwa Gira: ọ nāputa, nākọcha ka ọ nāputa.
6
Ọ tua Devid nkume, tu kwa ndi-orù nile nke eze, bú Devid: ndi Israel nile na ndi-dike nile di kwa n'aka-nri-ya na n'aka-ekpe-ya.
7
Ma otú a ka Shimai siri mb͕e ọ nākọcha, Pua, pua, gi nwoke ọbara na nwoke jọb͕uru onwe-ya:
8
Jehova eweghachiwo n'isi-gi ọbara nile nke ulo Sọl, onye i buworo eze n'ọnọdu ya; Jehova enyewo kwa ala-eze n'aka Absalom, bú nwa-gi: ma, le, n'ihe ọjọ gi ka ejideworo gi, n'ihi na nwoke ọbara ka i bu.
9
Abishai nwa Zeruaia we si eze, N'ìhi gini ka nkita nka nke nwuru anwu nākọcha onye-nwem, bú eze? biko, ka m'gabiga, wezuga isi-ya.
10
Eze we si, Gini ka mu na unu nwekọrọ umu Zeruaia? mb͕e ọ nākọcha, mb͕e Jehova siwo-kwa-ra ya, Kọcha Devid; ònye gāsi kwa, Gini mere i meworo otú a?
11
Devid we si Abishai, si kwa ndi-orù-ya nile, Le nwam, nke siri n'afọm puta, nāchọ ndum: onye Benjamin nka, ò gēsi kwa aṅa ghara ichọkari ya ub͕u a? ka ọ nọduru onwe-ya, ka ọ kọcha kwa; n'ihi na Jehova siworo ya, Kọcha.
12
Eleghi anya Jehova gēlekwasi nwedam anya, Jehova gēnyeghachikwam ezi ihe n'ọnọnọdu nkọcha-ya ta.
13
Devid na ndikom-ya we je n'uzọ ahu: Shimai nēje kwa n'akuku ugwu na ncherita-iru ya, ọ nēje ije we kọcha, tu kwa nkume na ncherita-iru ya, kpoli kwa ájá.
14
Eze na ndi nile ndi ya na ha yikọrọ je, we biarue Ayefim; o we turu ndu n'ebe ahu.
15
Absalom na ndi nile, bú ndikom Israel, we ba na Jerusalem, Ahitofel so-kwa-ra ya ba.
16
O rue, mb͕e Hushai, bú onye-Akait, bú eyì Devid, biakutere Absalom, na Hushai siri Absalom, Ka eze di ndu, ka eze di ndu.
17
Absalom we si Hushai, Ọ̀ bu nka bu ebere i nēmere eyi-gi? n'ìhi gini ka i nēsoghi eyì-gi je?
18
Hushai we si Absalom, É-è, kama onye Jehova na ndi nka na ndikom nile nke Israel rọputaworo, ya ka m'gādiri, ọ bu kwa n'aka-ya ka m'gēbiri.
19
Ọzọ kwa, ònye ka mu onwem gēfè òfùfè? Ọ̀ bughi n'iru nwa-ya? dika m'fèworo òfùfè n'iru nna-gi, otú a ka m'gābu n'iru gi.
20
Absalom we si Ahitofel, Duanu ọdu n'onwe-unu ihe ayi gēme.
21
Ahitofel we si Absalom, Bakuru ndi-iko nna-gi ndinyom, ndi o mere ka ha nọdu iche ulo; Israel nile gānu kwa na i nēsi nna-gi ísì ọjọ: aka ndi nile gi na ha nọ gādi kwa ike.
22
Ha we b͕asara Absalom ulo-ikwū n'elu ulo; Absalom we bakuru ndi-iko nna-ya ndinyom n'anya Israel nile.
23
Ọdu Ahitofel, nke ọ duru na mb͕e ahu, di ka agāsi na ajuru ase n'okwu Chineke: otú a ka idu-ọdu nile nke Ahitofel di, ma n'ebe Devid nọ ma n'ebe Absalom nọ.
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 17 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24