bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Proverbs 11
Proverbs 11
Igbo 2006
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 12 →
1
Ihe-osìsì aghughọ bu ihe-árú n'anya Jehova: Ma nkume-isì-ihe zuru ezu bu ihe nātọ Ya utọ.
2
Nganga bia, nlelì abia kwa: Ma n'ebe ndi di ume-ala n'obi nọ ka amam-ihe di.
3
Izu-okè nke ndi ziri ezi nēdu ha: Ma omume b͕agọrọ nke ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēmebi ha.
4
Àkù adighi-aba urù n'ubọchi nke nrubiga-ókè nke iwe: Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu.
5
Ezi omume nke onye zuru okè gēme ka uzọ-ya zie ezi: Ma nmebi-iwu nke aka ya ka onye nēmebi iwu gēji da.
6
Ezi omume nke ndi ziri ezi gānaputa ha: Ma n'ọchichọ nke ha nāchọsi ike ka agānwude ndi nāghọb͕u aghọb͕u.
7
Mb͕e madu nke nēmebi iwu nwuru, olile-anya-ya gāla n'iyì: Ọzọ, nchere nke ajọ ihe nile alawo n'iyì.
8
Adọputawo onye ezi omume n'ahuhu, Onye nēmebi iwu ba n'ọnọdu ya.
9
Ọnu-ya ka onye emeruru emeru ji ebibi madu-ibe-ya: Ma ihe-ọmuma ka agēji dọputa ndi ezi omume.
10
N'ọdi-nma nke ndi ezi omume obi ndi obodo-ha nātọ ha utọ: Ọzọ, mb͕e ndi nēmebi iwu nāla n'iyì, iti-nkpu-ọṅù di.
11
Eji ngọzi nke ndi ziri ezi bulie obodo: Ma eji ọnu ndi nēmebi iwu akwada ya.
12
Onye nēleda madu-ibe-ya anya, obi amam-ihe kọrọ ya: Ma onye-nghọta nāb͕a nkiti.
13
Onye nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ nēkpughe ìzù nzuzo: Ma onye mọ-ya kwesiri ntukwasi-obi nēkpuchi okwu.
14
Mb͕e ọ nādighi ezi ndum-ọdu ọ bula di, ndi ahu gāda: Ma nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu.
15
Aghaghi imejọ madu, mb͕e ọ nọworo onye ala ọzọ na mbe: Ma onye nākpọ ndi nānara madu n'aka ibu ndi-mbe asì, ọ nọ na ntukwasi-obi.
16
Nwayi amara nējidesi nsọpuru ike: Ndi nēme ka madu ma jijiji nējidesi kwa àkù ike.
17
Onye nēmeso nkpuru-obi-ya ezi ihe ka onye-ebere bu: Ma onye nēmekpa anu-aru nke aka ya aru ka onye nēnweghi obi-ebere bu.
18
Onye nēmebi iwu nāluta ego-ọlu okwu-ugha: Ma onye nāgha ezi omume dika nkpuru nāluta ugwọ-ọlu kwesiri ntukwasi-obi.
19
Onye nēguzosi ike n'ezi omume gēru na ndu: Ma onye nāb͕aso ihe ọjọ gēru n'ọnwu nke aka ya.
20
Ihe-árú n'anya Jehova ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'obi bu: Ma ihe nātọ Ya utọ ka ndi zuru okè n'uzọ-ha bu.
21
Site n'aka rue aka, agaghi-agu onye ọjọ n'onye nēmeghi ihe ọjọ: Ma nkpuru ndi ezi omume gēwepuga onwe-ha.
22
Dika nb͕a-aka ọla-edo n'imi ezì, Otú a ka nwanyi mara nma nke nēsi n'ezi uche wezuga onwe-ya di.
23
Ihe ndi ezi omume nāchọsi ike bu nání ezi ihe: Ma olile-anya nke ndi nēmebi iwu bu nrubiga-ókè nke iwe.
24
O nwere onye nāghasa aghasa, ma anọ̀ nātukwasiri ya ihe kari; O nwe-kwa-ra onye nēb͕ochi eb͕ochi kari nke ziri ezi, ma ọ nēdubà nání n'ikọ-ukọ.
25
Nkpuru-obi nke nāgọzi agọzi ka agēme ka ọ ma abuba: Ọzọ, onye nēme ka ndi ọzọ ṅujue afọ, agēme kwa ka ya onwe-ya ṅujue afọ.
26
Onye nēb͕uchi ọka, ọra madu gākọcha ya: Ma ngọzi n'isi onye nēre ya.
27
Onye nāchọsi ezi ihe ike nāchọ ka ihe-ya nātọ Chineke utọ: Ma onye nāchọ ihe ọjọ, ihe ahu gābiakute ya.
28
Onye nātukwasi obi n'àkù-ya, onye ahu gāda: Ma dika akwukwọ ndu ka ndi ezi omume gēpú.
29
Onye nēmekpa èzí-na-ulo-ya aru gēketa ifufe: Orù ka onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya gābu-kwa-ra onye obi-ya mara ihe.
30
Nkpuru onye ezi omume nāmi bu osisi nēnye ndu; Onye nēnwetara Chineke nkpuru-obi madu ka onye mara ihe bu.
31
Le, agākwughachi onye ezi omume ugwọ n'uwa: Àgēsi kwa aṅa ghara ikwughachi onye nēmebi iwu na onye-nmehie?
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 12 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31