bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Proverbs 20
Proverbs 20
Igbo 2006
← Chapter 19
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 21 →
1
Onye nākwa emò ka manya-vine bu, onye-nkpọtu ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya bu; Onye ọ bula nke nāwaghari site na ya amaghi ihe.
2
Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka oké ujọ anātu eze bu: Onye nākpasu Ya iwe nke nērubiga ókè nēmehie megide ndu nke aka ya.
3
Ọ buru madu nsọpuru ikwusi ilu ọ̀gù: Ma onye ọ bula nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ganālusi ọ̀gù ike.
4
N'ihi na ọ bu mb͕e oyi nātu, onye-ume-ngwu agaghi-alu ọlu ubi; Ọ gāriọ aririọ na mb͕e owuwe-ihe-ubi, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe.
5
Miri nke miri emi ka ndum-ọdu n'obi madu bu; Ma onye-nghọta gādọputa ya.
6
Ọtutu madu nākpọsa, onye ọ bula ebere nke aka ya: Ma onye kwesiri ntukwasi-obi, ònye gāchọputa ya?
7
Onye ezi omume nke nējeghari n'izu-okè-ya, Ndi ihe nāgara nke-ọma ka umu-ya nke gānọchi ya gābu.
8
Eze nke nānọkwasi n'oche ikpé Ji anya-ya abua afuchapu ihe ọjọ nile.
9
Ònye gāsi, Emewom ka obim di ọcha, Aghọwom onye di ọcha pua na nmehiem?
10
Uzọ nkume-isì-ihe abua, na uzọ ephah abua, Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù.
11
Ọbuná nwata nēme ka amata ya site n'omume-ya nile, Ma ọlu-ya di ọcha, ma o zi-kwa-ra ezi.
12
Nti nke nānu ihe, na anya nke nāhu uzọ, Jehova emewo ọbuná ha abua.
13
Ahula urá n'anya, ka ewe ghara inapu gi ihe nile; Meghe anya-gi abua, rijue nri afọ.
14
Ọ jọrọ njọ, ọ jọrọ njọ, ka onye nāzù azù nāsi: Ma mb͕e ọ laworo n'ulo-ya, mb͕e ahu ka ọ nānya isi.
15
Ọla-edo di, na ọtutu ruby: Ma ihe di oké ọnu-ahia ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu ihe-ọmuma bu.
16
Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe; N'ọnọdu ndi mba ọzọ nara ya onwe-ya n'ihe-ibe.
17
Ọ nātọ madu utọ, bú nri okwu-ugha; Ma emesia nkpuru-ájá gēju ya ọnu.
18
Èchìchè nile nēji ndum-ọdu guzosi ike: Gi were kwa ezi ndum-ọdu bue agha.
19
O nēkpughe ìzù nzuzo, bú onye nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ. Agwakọta-kwa-la onwe-gi n'onye ji eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua arafu madu.
20
Onye nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, Oriọna-ya gānyu na nb͕achi nke ọchichiri.
21
Ihe-nketa nke anānara ọsọsọ na mbu; Agaghi-agọzi kwa ikpe-azu-ya.
22
Asila, M'gākwughachi ugwọ ihe ọjọ: Le anya Jehova, Ọ gāzọputa kwa gi.
23
Ihe-árú n'anya Jehova ka uzọ nkume-isì-ihe abua bu; Ihe-osìsì aghughọ adighi kwa nma.
24
N'aka Jehova ka nzọ-ukwu nile nke madu nēsite; Màdu gēsi kwa aṅa ghọta uzọ-ya?
25
Ọnyà mara madu ma ọ buru na o were ọsọsọ si, Ọ di nsọ, Ma mb͕e ọ kwesiri nkwa o we ju ajuju.
26
Ọ nāfuchapu ndi nēmebi iwu, bú eze mara ihe, Ọ nēme kwa ka wheel nsucha-ọka laghachi n'elu ha.
27
Oriọna Jehova ka ume ndu madu bu, Nēgwuputa ime-ime-ala afọ nile.
28
Ebere na ezi-okwu nēchebe eze: O ji kwa ebere akwagide oche-eze-ya.
29
Ima-nma umu-okorọbia ka ike-ha bu: Ihe-nsọpuru ndi-okenye ka isi-awọ bu kwa.
30
Ufiri-utali nke nēmeru aru nēchichapu ihe ọjọ: Iti-ihe nēru kwa ime-ime-ala afọ.
← Chapter 19
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 21 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31