bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Proverbs 25
Proverbs 25
Igbo 2006
← Chapter 24
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 26 →
1
Ndia bu kwa ilu Solomon turu, nke ndi Hezekaia, bú eze Juda, deputara n'akwukwọ.
2
Ọ bu nsọpuru Chineke izobe okwu: Ma nsọpuru ndi-eze bu igwuputa ala okwu.
3
Elu-igwe n'idi-elu-ya, na ala n'omimi-ya, Na obi ndi-eze, ọ dighi ngwuputa di ha.
4
Wepu afuru-uzu n'ọla-ọcha, Ihe ewe putara onye nānucha ọla:
5
Wepu onye nēmebi iwu n'iru eze, Oche-eze-ya ewe guzosie ike n'ezi omume.
6
Asọpurula onwe-gi n'iru eze, Eguzo-kwa-la n'ọnọdu ndi uku:
7
N'ihi na ọ di nma ka asi gi, Rigota ebe a; Kari ka eme ka i di ala n'iru onye amara aha-ya, Onye anya-gi abua huworo.
8
Apula ngwa ngwa ise okwu, Ka o we ghara ibu na i maghi ihe i gēme n'ikpe-azu-ya, Mb͕e madu-ibe-gi etiyewo gi n'ọnọdu-ihere.
9
Gi na madu-ibe-gi kwurita okwu-ikpe-gi, Ekpughe-kwa-la izù nzuzo nke onye ọzọ:
10
Ka onye nke nānu ya we ghara ikwulu gi, Akukọ ihe ọjọ gi ewe ghara isi n'ebe i nọ laghachi.
11
Nkpuru-osisi apple ọla-edo nime nkata ọla-ọcha Ka okwu ekwuru na mb͕e kwesiri ya bu.
12
Nb͕a-aka ọla-edo na ihe-ichọ-nma nke ọla-edo ọma Ka onye nāba nba nke mara ihe bu na nti nke nānu ihe.
13
Dika oyi snow n'ubọchi owuwe-ihe-ubi, Otú a ka ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi diri ndi nēziga ya; Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-nwe-ya ka ọ nēwelata.
14
Igwe-oji na ifufe nke miri-ozuzo nādighi Ka onye nke nānya isi n'onyinye okwu-ugha bu.
15
Site n'eweghi iwe ọsọsọ ka anāràye onye-isi, Ire nrò nānyaji kwa ọkpukpu.
16
Ọ̀ bu manu-aṅu ka i chọtaworo? racha nke gēzuru gi; Ka i we ghara iriju ya afọ, we b͕ọ ya.
17
Me ka ukwu-gi kọ ukọ n'ulo madu-ibe-gi; Ka ihe-gi we ghara iju ya afọ, o we kpọ gi asì.
18
Otùtù-agha na mma-agha na àkú di nkọ Ka onye nke nāb͕a àmà okwu-ugha megide madu-ibe-ya bu.
19
Ezé nyajiri anyaji na ukwu chikwa-puru echikwapu Ka itukwasi onye-nghọb͕u obi n'ubọchi ahuhu bu.
20
Dika onye nēyipu uwe n'ubọchi oyi, dika manya b͕ara uka n'elu akanwu, Otú a ka onye nābùru obi jọrọ njọ abù di.
21
Ọ buru na agu nāgu onye nākpọ gi asì, gi me ka o rie nri; Ọ buru kwa na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri:
22
N'ihi na icheku nēre ọku ka i nāgukwasi n'isi-ya, Jehova gākwughachi kwa gi.
23
Ifufe Ugwu nāmuputa oké miri-ozuzo: Ọ bu kwa iru oké iwe ka iré nēkwu okwu-azu nāmuputa.
24
Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo, Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.
25
Dika miri oyi si adiri nkpuru-obi nāda #mbà, Otú a ka okwu ọma anuru site n'ala di anya di.
26
Isi-iyi azọtọrọ azọtọ na ebe-nsuputa-miri bibiri ebibi Ka onye ezi omume nke anēwezuga n'ọnọdu-ya n'iru onye nēmebi iwu bu.
27
Iracha manu-aṅu ri nne adighi nma: Otú a ọ buru na madu egwuputa ala nsọpuru-ha ọ bughi nsọpuru.
28
Obodo etikpọrọ etikpọ nke mb͕idi nādighi Ka onye ọ bula nke nādighi-ebọchi mọ-ya bu.
← Chapter 24
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 26 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31