bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Proverbs 16
Proverbs 16
Igbo 2006
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 17 →
1
Madu nwe ido obi n'usoro: Ma n'aka Jehova ka ọziza ire sitere.
2
Uzọ nile nke onye ọ bula di ọcha n'anya-ya: Ma Onye nātùzi mọ nile nke madu ka Jehova bu.
3
Turu ọlu-gi nile rue Jehova aru, Èchìchè-gi nile ewe guzosie ike.
4
Ihe nile ka Jehova kpuru n'ihi Onwe-ya: E, ọbuná onye nēmebi iwu nāluru ubọchi ihe ọjọ ọlu.
5
Ihe-árú n'anya Jehova ka onye ọ bula bu nke obi-ya di elu: Site n'aka rue aka, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.
6
Eji ebere na ezi-okwu ekpuchi ajọ omume: Ọ bu kwa egwu Jehova ka madu ji esi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya.
7
Mb͕e uzọ nile nke onye ọ bula nātọ Jehova utọ, Ọ nēme ọbuná ndi-iro-ya ka ha na ya di n'udo.
8
Ọ di nma inwe ihe ntà n'ezi omume, Kari inwe ọtutu ihe-omume ma ikpé ziri ezi adighi ya.
9
Obi madu nēchè uzọ-ya: Ma Jehova nēme ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.
10
Ọjuju-ase di n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke eze: Mb͕e ọ nēkpe ikpe ọnu-ya adighi-emekpu emekpu.
11
Ihe-ọtùtù na ihe-osìsì ziri ezi diri Jehova: Ọlu-Ya ka nkume-osìsì nile nke akpa bu.
12
Ọ buru ndi-eze ihe-árú ime nmebi-iwu: N'ihi na ezi omume ka oche-eze ji eguzosi ike.
13
Ihe nātọ ndi-eze utọ ka eb͕ub͕ere-ọnu ezi omume bu; Ọ bu kwa onye nēkwu ihe ziri ezi ka ha nāhu n'anya.
14
Ọnuma eze bu ndi-ozi ọnwu: Ma onye mara ihe gēkpuchi ya.
15
N'ìhè iru eze ka ndu di; Mb͕e ihe madu nātọ ya utọ, ọ di ka igwe-oji nke miri-ozuzo ikpe-azu.
16
Inweta amam-ihe, le ka o si di nma nke-uku kari ọla-edo ọma! Inweta nghọta kwa, le ka o si buru ihe anārọputa nke-uku kari ọla-ọcha!
17
Uzọ atuliri atuli nke ndi ziri ezi bu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha: Onye nēdebe nkpuru-obi-ya nēche uzọ-ya.
18
N'iru ntipia ka npako nāga, Ọ bu kwa n'iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga.
19
Ọ di nma inwe mọ di ala n'etiti ndi ewedara n'ala, Kari isoro ndi-npako kesa ihe akwatara n'agha.
20
Onye nwere uche n'okwu Chineke gāchọta ezi ihe: Ọzọ, onye nātukwasi Jehova obi, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.
21
Onye obi-ya mara ihe, agākpọ ya onye-nghọta: Ọzọ, utọ eb͕ub͕ere-ọnu nātukwasiri nmuta ihe.
22
Isi-iyi nke ndu ka ezi uche bu n'ebe ndi-nwe-ya nọ: Ma idọ-aka-na-nti nke ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ bu uche b͕agọrọ ab͕agọ.
23
Obi onye mara ihe nēme ka ọnu-ya nwe uche, Ọ nātukwasi-kwa-ra eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua nmuta.
24
Ub͕ub͕ọ-manu-aṅu ka okwu-ọnu utọ nile bu, Nke nātọ nkpuru-obi utọ, buru kwa ihe nāgwọ ọkpukpu n'ọria.
25
Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu, Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu.
26
Ọchichọ-nkpuru-obi nke onye nādọb͕u onwe-ya n'ọlu adọb͕uworo ya onwe-ya n'ọlu; N'ihi na ọnu-ya erugidewo ya.
27
Onye jọb͕uru onwe-ya nēgwuputa ihe ọjọ: Ọ bu kwa n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka ihe dika ọku nāru aru di.
28
Onye nāb͕akuta Chineke azu nēzisa ise-okwu: Ọzọ, onye nēkwu okwu-azu nēkewa ezi eyì.
29
Onye nēme ihe-ike nārà madu-ibe-ya urà, Nēme kwa ka o je ije n'uzọ nādighi nma.
30
Onye nātachi anya-ya abua ichè èchìchè ib͕akuta Chineke azu, Onye nātabi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, o mezuwo ihe ọjọ.
31
Okpu-eze nke mara nma ka isi-awọ bu, N'uzọ ezi omume ka agāhu ya.
32
Ọ di nma, bú onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, kari dike: Ọ di kwa nma, bú onye nāchi mọ-ya, kari onye nēwere obodo n'agha.
33
Anēfe nzà, Ma n'aka Jehova ka ikpé-ya nile sitere.
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 17 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31