bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Proverbs 14
Proverbs 14
Igbo 2006
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 15 →
1
Nwanyi ọ bula nke mara ihe ewuwo ulo-ya: Ma nwanyi nke b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ji aka-ya abua akwada ya.
2
Onye nēje ije n'izi-ezi-ya nātu egwu Jehova: Ma onye nēsihie n'uzọ-ya nile nēleda Ya anya.
3
N'ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ome npako di: Ma eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe gēdebe ha.
4
Mb͕e ehi nādighi, ulo anāzù ehi nādi ọcha: Ma ihe-omume riri nne nēsite n'ike ehi.
5
Onye-àmà nke kwesiri ntukwasi-obi adighi-ekwu okwu-ugha: Ma onye-àmà okwu-ugha nēkupu okwu-ugha dika ume.
6
Onye nākwa emò achọwo amam-ihe, ma ọ hughi ya: Ma ihe-ọmuma diri onye-nghọta nfe.
7
Je na ncherita-iru onye-nzuzu, I gaghi-amata kwa eb͕ub͕ere-ọnu ihe-ọmuma n'aru ya.
8
Amam-ihe onye nwere ezi uche bu ighọta uzọ-ya: Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu aghughọ.
9
Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ikpe-ọmuma nākwa emò ha: Ma n'etiti ndi ziri ezi ka ihe nātọ Chineke utọ di.
10
Obi mara ilu nke aka ya; Ọ bu kwa n'ọṅù-ya ka onye nke nābughi nke ya nādighi-agwakọta onwe-ya.
11
Ulo nke ndi nēmebi iwu, agēme ka ọ tọb͕orọ n'efu: Ma ulo-ikwū nke ndi ziri ezi gāma akwukwọ dika ihe akuku aku.
12
Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu, Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu.
13
Ọbuná n'ọchì ka ihe nēb͕u obi nb͕u; Ọzọ, ikpe-azu ọṅù bu iru-újú.
14
Site n'uzọ nile nke aka ya ka afọ gēju onye laghachiworo azu n'obi: Ma ọ bu site n'onwe-ya ka afọ gēju ezi madu.
15
Onye nēnweghi uche nēkwere okwu nile ọ bula: Ma onye nwere ezi uche nāghọta ije-ukwu-ya.
16
Onye mara ihe nātu egwu, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya: Ma onye-nzuzu nēwebiga iwe ókè, we nātukwasi obi.
17
Onye nēwe iwe ọsọsọ gēme ihe nke uche b͕agọrọ ab͕agọ: Ọzọ, onye ọbula nke nēzu nzube ọjọ di iche iche, anākpọ ya asì.
18
Ndi nēnweghi uche eketawo uche b͕agọrọ ab͕agọ: Ma ndi nwere ezi uche ka anēkpube ihe-ọmuma n'isi.
19
Ndi ọjọ erudawo ala n'iru ndi ezi madu; Ndi nēmebi iwu kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke onye ezi omume.
20
Ọbuná onye-ab͕ata-obi nke ob͕eye nākpọ ya asì: Ma ndi nāhu ọgaranya n'anya di ọtutu.
21
Onye nēleda madu-ibe-ya anya nēmehie: Ma onye nēmere ndi ewedara n'ala amara, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.
22
Hà adighi-akpafu, bú ndi nēchèputa ihe ọjọ? Ma ebere na ezi-okwu gādiri ndi nēchèputa ezi ihe.
23
Na ndọb͕u nile nke madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu urù di ya: Ma okwu eb͕ub͕ere-ọnu nēdubà nání n'ihe-ikọ-ukọ.
24
Okpu-eze nke ndi mara ihe bu àkù-ha: Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu nání uche b͕agọrọ ab͕agọ.
25
Onye nānaputa nkpuru-obi di iche iche ka onye-àmà nke nēkwu ezi-okwu bu: Ma onye nēkupu ọtutu okwu-ugha dika ume nāghọ aghughọ.
26
N'egwu Jehova ka ntukwasi-obi siri ike di: Umu-Ya gēnwe kwa ebe-nb͕abà.
27
Egwu Jehova bu isi-iyi nke ndu, Isi n'ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi.
28
N'uba nke ndi ọ bula ka ima-nma eze di: Ma n'ukọ mba ọ bula ka nbibi onye-isi di.
29
Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nwere ọtutu nghọta: Ma onye nwere obi ọku nēbuli uche b͕agọrọ ab͕agọ.
30
Ndu nke anu-aru ka obi agwọrọ ọria-ya bu: Ma ire-ure nke ọkpukpu nile ka ekworo bu.
31
Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike nāta Onye kèworo ya uta: Ma onye nāsọpuru Ya ka onye nēme ob͕eye amara bu.
32
Anenupu onye nēmebi iwu n'ihe ọjọ ya: Ma onye nwere ebe-nb͕abà n'ọnwu-ya ka onye ezi omume bu.
33
N'obi onye-nghọta ka amam-ihe nānọgide: Ma n'etiti ndi-nzuzu ka ọ nēme ka amara ya.
34
Ezi omume nēbuli mba: Ma ihe-ihere nke ndi nile di iche iche ka nmehie bu.
35
Ihe orù nwere uche nātọ eze utọ: Ma nrubiga-ókè nke iwe-Ya gādi n'aru onye nēweta ihere.
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 15 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31