bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Proverbs 21
Proverbs 21
Igbo 2006
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 22 →
1
Iyi di iche iche nke juputara na miri ka obi eze bu n'aka Jehova: N'ebe ọ bula nke nātọ Ya utọ ka Ọ nēwezuga ya.
2
Uzọ ọ bula nke onye ọ bula ziri ezi n'anya-ya abua: Ma onye nātùzi obi nile ka Jehova bu.
3
Ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe Bu ihe Jehova nārọputa kari àjà.
4
Anya npako na obi di nganga, Ọbuná oriọna nke ndi nēmebi iwu, bu nmehie.
5
Èchìchè nile nke onye di nkọ nēdubà nání n'urù: Ma èchìchè nile nke onye ọ bula nke nēme ngwa nēdubà nání n'ikọ-ukọ.
6
Ikpa àkù site n'ire okwu-ugha Bu otù nku-ume anēfesa n'ifufe; ndi nāchọ àkù ahu nāchọ ọnwu.
7
Ipunara-madu-ihe nke ndi nēmebi iwu gēkpochapu ha; N'ihi na ha juru ime ihe ekpere n'ikpe.
8
Ihe b͕agọrọ ab͕agọ nke-uku ka uzọ onye ikpe mab͕uru ya bu: Ma onye di ọcha n'obi, ọlu-ya ziri ezi.
9
Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo, Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.
10
Nkpuru-obi nke onye nēmebi iwu nāchọsi ihe ọjọ ike: Madu-ibe-ya abughi onye imere amara n'anya-ya.
11
Mb͕e anēri onye nākwa emò nra, anēme ka onye nēnweghi uche mara ihe: Ọzọ, mb͕e anēme ka onye nke mara ihe nwe uche, ọ nānara ihe-ọmuma.
12
Onye ezi omume nēnwe uche n'imeso ulo nke onye nēmebi iwu; Ọ nēkpù ndi nēmebi iwu iru n'ihi ihe ọjọ ha.
13
Onye nēkwuchipu nti-ya n'iti-nkpu nke onye nēnweghi ike, Ya onwe-ya gākpọ kwa nkpu, ma agaghi-aza ya.
14
Onyinye enyere na nzuzo nādaju iwe, Iri-ngo ezobere n'uwe-obi nādaju kwa ọnuma siri ike.
15
Ọ buru onye ezi omume ọṅù ime ihe ekpere n'ikpe; Ma nbibi diri ndi nālu ajọ ihe.
16
Madu nke nēsi n'uzọ ezi uche akpafu, Nime nkpọkọta nke ndi nādighi ndu ka o gēzu ike.
17
Onye ihe kọrọ ka onye nāhu ọṅù n'anya gābu: Onye nāhu manya-vine na manu n'anya agaghi-abu ọgaranya.
18
Ihe-nb͕aputa ib͕aputa onye ezì omume ka onye nēmebi iwu bu; Ọzọ, n'ọnọdu ndi ziri ezi ka onye nāghọb͕u aghọb͕u nọ.
19
Ọ di nma inọ n'ala bú nání ọzara, Kari inọyere nwayi nēse okwu nākpasu kwa iwe.
20
Àkù anāchọsi ike na manu di n'ebe-obibi nke onye mara ihe; Ma madu nzuzu nēloda ya.
21
Onye nāb͕aso ezi omume na ebere Nāchọta ndu, na ezi omume, na nsọpuru.
22
Obodo ndi-dike ka onye nke mara ihe rigobàworo, O we me ka ike nke ikwesi-ntukwasi-obi-ya rida.
23
Onye nēdebe ọnu-ya na ire-ya Nēdebe nkpuru-obi-ya ka ọ pua n'ahuhu nile.
24
Onye-nganga na onye-npako, onye nākwa emò bu aha-ya, Ọ nālu ọlu n'iwe nērubiga ókè nke nganga.
25
Ọchichọ siri ike nke onye-ume-ngwu nēme ka ọ nwua; N'ihi na aka-ya abua juru ilu ọlu.
26
Ogologo ubọchi nile ka ọ chọsiworo ihe ike nke-uku: Ma onye ezi omume nēnye, ọ dighi-eb͕ochi kwa aka-ya inye ihe.
27
Àjà nke ndi nēmebi iwu bu ihe-árú: O gēsi kwa aṅa ghara ibu ihe-árú kari, mb͕e o ji nzube ọjọ weta ya?
28
Onye-àmà okwu-ugha gāla n'iyì: Ma onye nānu, rue mb͕e ebighi-ebì ka o gēkwu.
29
Onye nēmebi iwu emewo ka iru-ya sie ike: Ma onye ziri ezi, onye ahu nēdozi uzọ-ya nile.
30
Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di, Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.
31
Inyinya bu ihe anēdoziri ubọchi agha: Ma Jehova nwe nzọputa.
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 22 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31