bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Proverbs 26
Proverbs 26
Igbo 2006
← Chapter 25
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 27 →
1
Dika snow na mb͕e okpom-ọku, na dika miri-ozuzo na mb͕e owuwe-ihe-ubi, Otú a nsọpuru amaghi nma nye onye-nzuzu.
2
Dika nnunu na nfeghari-ya, dika eleke n'ofufe-ya, Otú a nkọcha adighi-abia n'efu.
3
Utari diri inyinya, bridle diri inyinya-ibu, Nkpa-n'aka di-kwa-ra azu ndi-nzuzu.
4
Azala onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di, Ka i we ghara idi ka ya, ọbuná gi onwe-gi.
5
Za onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di, Ka o we ghara ibu onye mara ihe n'anya-ya.
6
Onye nēbipu ukwu onwe-ya na onye nāṅu ime-ihe-ike dika miri Ka onye ahu bu nēzi ozi site n'aka onye-nzuzu.
7
Ogwe-ukwu abua nke onye-ngwurọ nākwu efe: Otú a ka ilu di n'ọnu ndi-nzuzu.
8
Dika akpa nkume di iche iche nke di oké ọnu-ahia n'obo nkume, Otú a ka onye nēnye onye-nzuzu nsọpuru di.
9
Dika ogwu nke dumiworo n'aka onye nāṅubiga manya ókè, Otú a ka ilu n'ọnu ndi-nzuzu di.
10
Onye-ọ̀kà nākpu ihe nile, Ma onye nēgo onye-nzuzu ilu ọlu di ka onye nēgo ndi nāgabiga agabiga.
11
Dika nkita nke chighariworo ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ, Otú a ka onye-nzuzu di nke nēme kwa ihe uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ọzọ.
12
Ì huwo onye ọ bula nke bu onye mara ihe n'anya-ya? Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.
13
Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'uzọ; Ọdum di n'amá.
14
Dika ibo-ọnu-uzọ si emeghari n'ihe-nkoye-ya, Otú a ka onye-ume-ngwu nēmeghari n'ihe-ndina-ya.
15
Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa; Ọ nāgwu ya ike iweghachi ya n'ọnu-ya.
16
Onye-ume-ngwu bu onye mara ihe n'anya-ya Kari madu asa ndi nāzaghachi okwu n'ezi uche.
17
Onye nējide nkita na nti ka ọ bu, Bú onye nāgabiga, nēwebiga iwe ókè n'ihi ise-okwu nābughi nke ya.
18
Dika onye-ará nke nātu àkú nēre ọku, Na àkú, na ọnwu;
19
Otú a ka onye ahu di nke ghọb͕uworo madu-ibe-ya, We si, Ọ̀ bughi egwú ka m'nēgwu?
20
Mb͕e nkú nādighi ọku gānyu: Otú a mb͕e ọ dighi onye nēkwu okwu-azu, ise-okwu gādaju.
21
Dika icheku si di n'ebe icheku nēre ọku di, na dika nkú si di n'ebe ọku di; Otú a ka onye nēse okwu di ime ka ilu-ọ̀gù nwuru ọku.
22
Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri di iche iche nātọ utọ nke-uku, Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ.
23
Ejùjù nke amachitaworo n'afuru-uzu ọla-ọcha Ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēre ọku na obi ọjọ bu.
24
Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka onye nke nākpọ asì nēji buru onye-iru-abua, Ma nime onwe-ya ka ọ nētiye aghughọ:
25
Mb͕e olu-ya nēkwu amara, ekwela ya; N'ihi na ihe-árú asa di n'obi-ya.
26
Ọ bu ezie na ikpọ-asi-ya ji nrafu ekpuchi onwe-ya, Ma agēkpughe ihe ọjọ ya nime nkpọkọta ndi-ya.
27
Onye nēgwu olùlù, nime ya ka ọ gādabà: Ọzọ, onye nākpọre nkume, ya ka ọ gālaghachikuru.
28
Ire okwu-ugha nākpọ ndi o gwepiaworo asì; Ọzọ, ọnu nke nēkwu ire-utọ nākpata nnuda.
← Chapter 25
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 27 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31