bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Hebrews 1
Hebrews 1
Igbo 1988
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 2 →
1
Na mgbe ochie Chineke gwara nna anyị ha okwu nꞌoge dị iche iche. Ọ gwara ha okwu site nꞌọnụ ndị amụma, na site nꞌụzọ ndị ọzọ dị iche iche.
2
Ma nꞌoge ikpeazụ ndị a anyị nọ nꞌime ya Chineke agwala anyị okwu site nꞌọnụ Ọkpara ya bụ Jisọs, onye Chineke nyefere ihe nile nꞌaka. Ọ bụ site nꞌaka Jisọs ka Chineke siri kee ụwa nile na ihe dị nꞌime ya.
3
Jisọs Ọkpara Chineke na-enwụpụta ebube Chineke. Ihe Jisọs bụ na ihe nile o mere gosiri na ọ bụ Chineke nꞌonwe ya. Jisọs na-esite nꞌike aka ya na-achị eluigwe na ụwa nile. Jisọs bụkwa onye ahụ nwụrụ ka ọ sachapụ ma hichapụkwa mmehie anyị nile. Mgbe o mechara nke a, ọ nọdụrụ nꞌebe nsọpụrụ dị elu, nꞌakụkụ Chineke onye dị ukwuu, nꞌeluigwe.
4
Jisọs dị ukwuu karịa ndị mmụọ ozi. Aha ya bụ Ọkpara Chineke gosiri nke a. Ọ bụ Nna ya nyere ya aha a. Aha ahụ dịkwa ukwuu karịa aha ma ọ bụ ọkwa nile nke ndị mmụọ ozi.
5
O nweghị oge Chineke jiri gwa mmụọ ozi ọ bụla okwu sị “Ị bụ Ọkpara m, taa enyela m gị ugwu na nsọpụrụ nke ya na aha ahụ so.” Ma Chineke kwuru okwu dị otu a banyere Jisọs. Nꞌoge ọzọ kwa Chineke kwuru sị, “Abụ m Nna ya, Nwa m ka Jisọs bụkwa.”
6
Ọzọ kwa, mgbe Ọkpara ya bụ Jisọs, onye ọ mụrụ nanị ya bịara nꞌụwa, Chineke nyere iwu sị “Ka ndị mmụọ ozi nile fee ya ofufe.”
7
Mgbe Chineke kwuru okwu banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị na ha bụ ndị na-eje ozi. Ha dị ka ikuku na-efesi ike. Ha na-agakwa ozi ha nile dị ka ọkụ na-enwusi ike.
8
Ma mgbe Chineke kwuru okwu banyere Ọkpara ya ọ sịrị, “Alaeze Gị, Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Mkpa nꞌaka ziri ezi ka mkpa nꞌaka alaeze gị bụ.
9
Ị hụrụ ezi omume nꞌanya ma kpọọ ihe ọjọọ asị. Nꞌihi nke a, Chineke nke bụ Chineke gị, ahọpụtala gị mee ka i nwee ugwu na nsọpụrụ karịa ndị ibe gị nile.”
10
Chineke kpọkwara Jisọs “Onyenwe anyị,” mgbe o kwuru sị “Onyenwe anyị, na mbụ ọ bụ gị kere ụwa. Eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.
11
Ha ga-ala nꞌiyi bụrụ ihe efu. Ma gị onwe gị ga-anọgide ruo mgbe nile ebighị ebi. Eluigwe na ụwa ga-akacha nka dịrị ka akwa ochie,
12
ma otu ụbọchị ị ga-apịakọta ha, gbanwee ha. Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe. Ọnụ ọgụgụ afọ gị agaghị agbanwe ruo mgbe ebighị ebi.”
13
Ò nweela oge Chineke gwara ndị mmụọ ozi okwu, dị ka o siri gwa Ọkpara ya sị “Nọdụ nꞌebe a nꞌakụkụ m, nꞌugwu na nsọpụrụ, tutuu ruo mgbe m ga-egwepịa ndị iro gị nile nꞌokpuru ụkwụ gị?”
14
E, è! O nweghị mmụọ ozi ọ bụla Chineke gwara okwu dị otu a! Nꞌihi na ndị mmụọ ozi ya bụ nanị mmụọ na-eje ozi. Ha bụ ndị a na-ezipụ ka ha nye aka. Ha na-elekọtakwa ndị ahụ ga-anata nzọpụta Chineke.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13