bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Hebrews 2
Hebrews 2
Igbo 1988
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 3 →
1
Anyị anụla akụkọ nzọpụta a Jisọs wetaara anyị. Ka anyị ṅazie ntị nke ọma jidesiekwa ihe anyị nụrụ ike ka anyị hapụ ikwe ka ha si nꞌobi anyị pụọ.
2
Iwu ahụ ndị mmụọ ozi nyere Mosisi bụ ezi iwu. Onye ọ bụla nupụrụ isi nꞌiwu ahụ, natara ahụhụ nꞌihi nnupụ isi ya. Egeghị ntị ọ bụla natakwara ntaramahụhụ dị ka o si kwesị.
3
Ndị nupụrụ isi natara ntaramahụhụ kwesịrị ihe ọjọọ ha mere. Ọ bụrụ na a tara ha ahụhụ nꞌihi ihe ọjọọ ha mere, anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị elefuo oke nzọpụta ahụ anya, bụ nke Kraịst wetara? Ọ dịghị! anyị apụghị ịgbanarị ahụhụ. Onyenwe anyị nꞌonwe ya kwuru okwu nzọpụta a. Ndị na-eso ụzọ ya, bụ ndị nụrụ okwu ya kwukwara ya, gosi anyị na ọ bụ eziokwu.
4
Chineke nꞌonwe ya tụkwasịrị akaebe nke ya iji kwagide na okwu ndị a bụ ezie, site nꞌịrụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịba ama, na ọrụ ịtụnanya dị iche iche. Chineke kesakwara ọtụtụ onyinye Mmụọ Nsọ, dị ka o siri dị ya mma.
5
Ọ dịghị mgbe Chineke nyere ndị mmụọ ozi ike ịchị elu ụwa a. Anyị na-ekwu karịsịa ihe banyere ụwa gaje ịbịa abịa.
6
Otu onye nꞌime ndị dere ihe nꞌakwụkwọ nsọ, chere echiche banyere ihe ndị a sị, “Chineke, gịnị mere i ji gụọ mmadụ na-abụghị ihe ọ bụla dị ka ihe? Gịnị mere i ji enwe obi ọcha nꞌebe mmadụ nọ? Gịnị mere gị na nwa nke mmadụ ji enwe mmekọ?
7
Nꞌihi na ọ bụ ezie na nwa ntịntị oge i mere mmadụ ka ọ dị ala karịa ndị mmụọ ozi. Ma ugbu a i werela ịma mma kpube ya nꞌisi dị ka okpueze. I werekwala ihe nile mee ha ka ha bụrụ ebe mgbakwasị ụkwụ ya.”
8
Chineke edoola ihe nile nꞌokpuru ụkwụ Jisọs. Ọ dịghị ihe ọ bụla na-adịghị nꞌokpuru ụkwụ ya. Ma anyị adịghị ahụ ka ihe ndị a mezuru ugbu a. Ma anyị ga-ahụ ha mgbe Jisọs ga-abịa ịbụ eze.
9
Ma anyị na-ahụ Jisọs, onye e mere ka ọ dị ala nanị otu mgbe. Onye e mere ka ndị mmụọ ozi dị elu karịa ya, ka ọ hụọ ahụhụ nwụọkwa nꞌihi mmadụ nile. Nꞌihi ọnwụ ọ nwụrụ, Chineke ewerela nsọpụrụ kpube ya nꞌisi dị ka okpueze.
10
E mere ka ọ bụrụ ihe ziri ezi nꞌanya Chineke, onye kere ihe nile, na Jisọs ga-ahụ ahụhụ. Nꞌihi na Chineke sitere nꞌọnwụ ya mee ka ọtụtụ mmadụ bịaruo nso nzọpụta. Ma ahụhụ Jisọs hụrụ mere ya ka ọ bụrụ onyeisi zuru oke nke nwere ike iduba ndị ya na mmeri nke nzọpụta.
11
Jisọs na-eme ụmụ mmadụ ka ha dị ọcha site na mmehie ha. Nꞌezie, onye na-eme ụmụ mmadụ ka ha dị nsọ, na ndị a e mere ka ha dị nsọ nwere Chineke dị ka Nna ha. Nke a mere ihere adịghị eme Jisọs ịkpọ ha ụmụnna ya.
12
Jisọs sitere nꞌọnụ onye dere akwụkwọ Abụ Ọma sị, “Aga m agwa ụmụnna m ihe banyere Chineke bụ Nna m. Anyị nile ga-eji otu olu too ya. Aga m ekwuwa aha Chineke nꞌọgbọ ọha.”
13
Nꞌebe ọzọ nꞌakwụkwọ nsọ, o sitere nꞌọnụ onye ọzọ kwuokwa sị “Aga m eji obi m nile kwere na Chineke. Olileanya nke m, na nke ụmụ Chineke nyere m ga-adịgide nꞌime gị Chineke.” Nꞌebe ọzọ kwa nꞌakwụkwọ nsọ o kwukwara sị “Lee mụ na ụmụ nke Chineke nyere m.”
14
Anyị bụ ụmụ Chineke ka e jiri ọbara na anụ ahụ mee. Jisọs gbokwasịrị onwe ya ụdị dị otu a. A mụrụ ya dị ka mmadụ efu. Nꞌihi na ọ bụ nanị dị ka mmadụ ka ọnwụ ya pụrụ ịdị ire. Site nꞌọnwụ ọ nwụrụ, ọ lara ike ajọ onye ahụ bụ ekwensu nꞌiyi. Ekwensu ahụ nwere ike ọnwụ.
15
Jisọs mere nke a, ka ọ dị mfe ịtọpụ ụmụnna ya site nꞌagbụ. Ha nọ nꞌagbụ nke ụjọ ọnwụ.
16
Jisọs abịaghị ịzọpụta ndị mmụọ ozi. Kama ọ bịara inyere ụmụ ụmụ Eberaham aka.
17
Ọ dị mkpa na Jisọs bịara nꞌụdị anyị bụ ụmụnna ya. Nꞌihi na ọ bụ nanị site nꞌụzọ dị otu a, ka ọ pụrụ ịbụ onyeisi nchụaja nwere obi ebere nꞌebe anyị nọ, na onyeisi nchụaja kwesịrị ntụkwasị obi nꞌihu Chineke, ikwuchitere anyị ọnụ anyị nꞌihi mgbaghara mmehie anyị.
18
Nꞌihi na ebe ya onwe ya hụrụ ahụhụ, ọ pụrụ inyere ndị na-ahụ ahụhụ aka. Ihe banyere ọnwụnwa doro ya anya. Nꞌihi nke a ọ maara ihe bụ nsogbu anyị mgbe anyị dabara nꞌọnwụnwa. Ọ pụkwara inyere anyị aka.
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13