bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Hebrews 7
Hebrews 7
Igbo 1988
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 8 →
1
Melikizedeki a bụ eze obodo Salem. Ọ bụkwa onye nchụaja Chineke onye kachasị ihe nile elu. Ọ bụ ya zutere Eberaham mgbe Eberaham si nꞌogbugbu ndị eze iri ahụ na-alọghachi. Ọ gọziri Eberaham.
2
Eberaham kewapụtara otu ụzọ nꞌụzọ iri nke ihe nile ọ dọtara nꞌagha nye ya. Otu ụzọ nꞌụzọ iri a bụ onyinye ọchụchụ aja nꞌomume ndị na-efe Chineke. Ugbu a ihe aha a bụ Melikizedeki pụtara bụ Eze ezi omume. Aha obodo ya bụ Salem pụtara Udo. Nꞌihi nke a, a kpọkwara Melikizedeki Eze Udo.
3
Eze a enweghị nna, o nwekwaghị nne, o nweghị akụkọ e dere banyere nna nna ya ha. O nweghị mmalite nke ụbọchị a mụrụ ya, ma ọ bụ ọgwụgwụ ndụ. Ma e mere ya dị ka Ọkpara Chineke. Ọ na-anọgide bụrụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.
4
Leenụ ka Melikizedeki si dị ukwuu! Ọ bụladị Eberaham, nna mbụ nke ụmụ Izirel, nyere ya onyinye ọchụchụ aja! O nyere ya otu ụzọ nꞌime ụzọ iri nke ngwa kachasị mma ọ kwatara nꞌagha!
5
Ọ bụ ihe a maara nke ọma na ndị sitere nꞌezinụlọ Livayị bụ ndị e nyere iwu pụrụ iche ịnakọta onyinye otu ụzọ nꞌụzọ iri site nꞌaka ndị obodo ha. Ụmụnna ha nyere ha onyinye otu ụzọ nꞌụzọ iri a nꞌihi na ọ bụ ihe Chineke nyere nꞌiwu.
6
Ma lee onye a na-abụghị onye Juu, onye a na-esiteghị nꞌagbụrụ Livayị pụta! Ya onwe ya naara Eberaham onyinye otu ụzọ nꞌụzọ iri! Mgbe o mesiri nke a, o sitere na ya tụkwasịrị Eberaham ngọzi!
7
Anyị maara na onye karịrị ukwuu bụ onye na-agọzi onye dịkarịrị nta.
8
Ndị nchụaja na-anata otu ụzọ nꞌụzọ iri ga-anwụ, mgbe oge ọnwụ ha ruru. Ma akwụkwọ nsọ kwuru na Melikizedeki na-adị ndụ na-aga nꞌihu.
9
Livayị onye bụ nna ndị nchụaja, ndị na-anata onyinye otu ụzọ nꞌụzọ iri a sitere nꞌagbụrụ Eberaham. O ziri ezi ma ọ bụrụ na anyị asị na Livayị nꞌonwe ya kwụrụ Melikizedeki otu ụzọ nꞌụzọ iri nke ya site nꞌokpuru Eberaham.
10
Nꞌihi na ọ bụ ezie na a mụbeghị Livayị nꞌoge a, ma mkpụrụ afọ Livayị nọ rị nꞌime Eberaham mgbe Eberaham kwụrụ Melikizedeki ụgwọ a.
11
Ugbu a ọ bụrụ na a pụrụ isite nꞌọrụ ọtụtụ ndị nchụaja zọpụta mmadụ, gịnị mere Chineke jiri zite Kraịst? Olee uru ọ bara inwe onye nchụaja dị ka Melikizedeki? Chineke gaara ezite onye nchụaja dị ka Erọọn! Ma ọ bụ nꞌihi na ọ dịghị onye nchụaja ọ bụla e sitere nꞌaka ya mee ka onye ọ bụla zuo oke. Ọ dịghị onye ọ bụla e mere ka ọ bụrụ onye ezi omume site nꞌaka ndị nchụaja nile a. Ndị nchụaja nile a batara nꞌọrụ ha site nꞌusoro iwu.
12
Ebe Chineke gbanwere ọnọdụ ndị nchụaja, nꞌotu aka ahụ ọ ghaghị ịgbanwekwa iwu.
13
Ebe Jisọs, onye a ghọrọ onye nchụaja ọhụrụ, na-esiteghị nꞌagbụrụ Livayị, o megidere iwu ochie ma ọ bụrụ na ọ rụọ ọrụ nchụaja ya nꞌebe ịchụ aja ndị Juu.
14
Ọ bụ ihe a maara nke ọma na Jisọs si nꞌagbụrụ Juda pụta, agbụrụ nke dị iche nꞌagbụrụ Livayị ebe ndị nchụaja na-aesite apụta. Mosisi ekweghị ka ebo Juda bụrụ ndị nchụaja.
15
Ọ pụtala ìhè na Chineke agbanweela iwu! Onye nchụaja ọhụrụ, nke yiri Melikizedeki abịala!
16
Kraịst abụghị onye nchụaja site nꞌọmụmụ nke a mụrụ ya nꞌezinụlọ ndị nchụaja. Ọ bụkwaghị onye nchụaja site na nhọpụta nke iwu. Kama ọ bụ onye nchụaja site nꞌike ịdị ndụ nke na-enweghị ọgwụgwụ!
17
Abụ ọma isi narị na iri kwuru banyere Kraịst sị “Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi. Ị dịkwa nꞌoyiyi Melikizedeki.”
18
A kagbuola ọnọdụ nchụaja ochie ahụ. Nꞌihi na ọ dịghị ike ọ bụla o nwere. O nwekwaghị onye ọ bụla ọ zọpụtara.
19
Ọ dịghị mgbe ọ bụla e sitere nꞌiwu mee mmadụ ọ bụla ka ọ bụrụ onye ya na Chineke ga-adị na mma. Ma ugbu a Kraịst ewetala ụzọ kachasị mma, nke anyị ga-eji nwee olileanya. Ọ na-eme ka anyị bụrụ ndị Chineke ga-anabata. Ọ na-emekwa anyị ka anyị bịaruo Chineke nso.
20
Chineke aṅụghị iyi ọ bụla nye ndị nchụaja ndị Juu. Kama ndị nchụaja na-aṅụ iyi. Ọ bụ nanị Kraịst ka Chineke ṅụrụ iyi nye. Chineke kwuru sị, “Onyenwe gị aṅụọla iyi, ọ dịkwaghị mgbe ọ ga-agbanwe uche ya. Ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.”
21
Chineke emeela ka ọnọdụ nchụaja Kraịst guzosie ike site nꞌịṅụ iyi.
22
Nꞌihi iyi a Chineke ṅụrụ, Kraịst pụrụ ime ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ a guzosie ike. Ọ bụkwa ezi ọgbụgba ndụ nke ga-adịgide na-enweghị mgbanwe. Chineke aṅụọla iyi na ọ ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
23
Nꞌọnọdụ omenala ochie ahụ, e nwere ọtụtụ ndị nchụaja dị iche iche. Ndị ochie aghaghị ịnwụ anwụ. O kwesịrị ekwesị na a ga-enwe ndị ọhụrụ nꞌọnọdụ ha.
24
Ma Jisọs ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ gaghị anwụ hapụ gị ka ị chọọ onye nchụaja ọhụrụ ọzọ. Ọnọdụ onye nchụaja o nwere enweghị mgbanwe ruo mgbe nile.
25
Ọ na-azọpụta ruo ọgwụgwụ oge. Ọ ga-azọpụtakwa ndị nile ga-esite nꞌaka ya bịakwute Chineke. O nwere ike ime nke a nꞌihi na ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ na-adị ndụ ka o chetara Chineke na ọ kwụchaala ụgwọ mmehie anyị nile. Ọ na-adịkwa ndụ mgbe nile, na-arịọrọ anyị arịrịọ nꞌihu Chineke.
26
Ọ bụ Jisọs bụ onyeisi nchụaja mmadụ nile kwesịrị inye ndụ ha. Ọ dị nsọ dịkwa ọcha. O nweghị ntụpọ ọ bụla nꞌahụ ya. Ọ dịghị mgbe ọ bụla o mehiere. Ọ dịkwaghị mgbe ọ ga-emehie.
27
Jisọs adịghị ka ndị nchụaja ọzọ. Ọ dịghị mkpa na ọ ga-achụ aja nke ụmụ anụmanụ ụbọchị nile nꞌihi mmehie ya. Ọ dịkwaghị mkpa na ọ ga-achụrụ ndị mmadụ aja nꞌihi mmehie ha. Nanị otu aja karịrị ukwuu ka Jisọs chụrụ. O weere onwe ya chụọ aja nꞌelu obe nꞌihi anyị, ka ọ bụrụ ọgwụgwụ ọchụchụ aja nile, nꞌihi na aja ahụ ọ chụrụ zuru oke ruo mgbe nile.
28
Iwu ochie họpụtara ndị mmadụ mee ha ndị nchụaja. Ma ha adịghị ike nꞌihi na ha na-eme ka iwe wee Chineke. Ma nꞌoge ikpeazụ, Chineke ṅụrụ iyi nke mere ka iwu gwụsịa. Iyi a Chineke ṅụrụ họpụtara Jisọs Ọkpara Chineke. Ya ka Chineke wusiri ike dị ka onyeisi nchụaja zuru oke ruo mgbe ebighị ebi.
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 8 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13