bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Hebrews 8
Hebrews 8
Igbo 1988
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 9 →
1
Ihe anyị na-ekwu bụ nke a, anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a. Ọ na-anọdụkwa nꞌebe nsọpụrụ dị elu nꞌakụkụ aka nri Chineke onye dị ukwuu, nꞌeluigwe.
2
Jisọs na-arụkwa ọrụ ya dị ka onyeisi nchụaja nꞌebe kachasị nsọ nke eluigwe. Ọ bụkwaghị nꞌụlọ nsọ nke mmadụ jiri aka wuo, kama nꞌụlọ nsọ ahụ Chineke nꞌonwe ya wuru.
3
Onyeisi nchụaja ọ bụla a họpụtara na-achụ aja na-enyekwa onyinye. Nꞌihi nke a Kraịst kwesịkwara ịchụ aja.
4
A sịkwarị na Kraịst nọ nꞌụwa, a garaghị anabata ya dị ka onye nchụaja nꞌihi na e nwere ndị nchụaja na-achụ aja dị ka usoro ọchụchụ aja ndị Juu si dị.
5
Ma ọrụ nile ndị nchụaja na-arụ bụ nanị onyinyo banyere ihe nke dị nꞌeluigwe. Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka Chineke jiri gosi Mosisi mgbe ọ na-akwado iwuru ya ebe a ga-anọ fee ya ofufe nꞌọzara, otu ọ ga-esi wuo ụlọ ahụ. Chineke gwara ya okwu sị, “Lezie anya hụ na i mere ihe nile nꞌusoro dị ka m si gosi gị nꞌelu ugwu.”
6
Ma ọrụ nchụaja nke Chineke nyere Jisọs karịrị nke ndị nchụaja ndị Juu mma. Otu a kwa, ọgbụgba ndụ Kraịst mere ka ọ dịrị nꞌetiti Chineke na mmadụ dabeere na nkwa dị mma karịa nkwa ọgbụgba ndụ ochie ahụ.
7
O nweghị oge Chineke nwapụtara na ọgbụgba ndụ ochie ahụ zuru oke. A sịkwarị na ọgbụgba ndụ ochie ahụ juru afọ, Chineke agaraghị ekwe nkwa iwere ọgbụgba ndụ ọhụrụ dochie nke ochie ahụ.
8
Ma Chineke nꞌonwe ya sitere nꞌọnụ Jeremaya onye amụma kwuo okwu banyere ezughị oke nke ọgbụgba ndụ ochie ahụ sị “Lezienụ anya! Oge ga-adị mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ guzosie ike nꞌetiti mụ onwe m na ụlọ Izirel na ndị Juda nile.
9
Ọgbụgba ndụ ọhụrụ a agaghị adị dị ka nke mụ na nna nna unu ochie ha gbara nꞌime ọzara. Nꞌoge ahụ, eji m aka m dupụta ha site nꞌala Ijipti, ma ha edebeghị ọgbụgba ndụ ahụ. Nꞌihi nke a mụ onwe m hapụrụ ha.
10
Ma otu a ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ga-esi dịrị nꞌetiti mụ onwe m na ụmụ Izirel. Aga m etinye iwu m nile nꞌime mmụọ ha ka ha nwee ike ịmata ihe m chọrọ ka ha mee. Aga m edekwa iwu m nile nꞌime obi ha ka ha hapụ ichefu iwu m nile. Aga m akpọbata ha dị ka ụmụ nke m. Mụ onwe m ga-abụ Chineke ha.
11
Ọ dịkwaghị onye ọ bụla nꞌetiti ha ga-ezi ibe ya ma ọ bụ zisaa ozi ọma nye nwanne ya, ma ọ bụ gwa onye agbata obi ya okwu sị, ‘O kwesịrị ka ị mata Chineke!’ Nꞌihi na onye ọ bụla nꞌime ha, onye ukwu na onye nta, ga-amata m, sọpụrụ m site nꞌobi ha nile.
12
Mgbe ahụ, aga m enwe obi ebere banyere amaghị ihe ha. Aga m agbaghara ha mmehie ha nile. Agaghị m echetakwa mmehie ha nile ọzọ.”
13
Okwu a Chineke kwuru banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ a na-egosi na ọgbụgba ndụ ochie agabigala. Ọ dị ka akwa ochie dọkara adọka, nke e tufuru ruo mgbe ebighị ebi.
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 9 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13