bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Hebrews 4
Hebrews 4
Igbo 1988
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 5 →
1
Ma nkwa dịkwara anyị ugbu a ịbanye ndụ ebighị ebi, ebe izuike nke Chineke. Ya mere, ka anyị lezie anya nke ọma, ka a hapụ ịchọta onye ọ bụla nꞌetiti anyị nke na-agaghị abanye.
2
E kwusaalara anyị ozi ọma a. Ha onwe ha nụkwara ya. Ma ozi ọma ahụ ha nụrụ enyereghị ha aka. Nꞌihi na ha ejighị okwukwe nara ya, ha egekwaghị ntị.
3
Ma ọ bụ nanị anyị onwe anyị ndị kwere ga-aba nꞌebe izuike Chineke. Ma banyere ndị na-ekweghị ekwe ka Chineke sịrị “Dị ka m ṅụrụ iyi nꞌiwe m, ha agaghị aba nꞌebe izuike m ma ọlị.” Ọ bụ ezie na ọ bụ Chineke kwuru okwu a, ma malite na mgbe ụwa bidoro, Chineke ejikerelarị na-eche ha.
4
Anyị maara na Chineke ejikerela ugbu a na-eche anyị. Akwụkwọ nsọ kpugheere anyị nke a site nꞌụbọchị asaa nke okike. Nꞌụbọchị nke asaa Chineke zuru ike site nꞌọrụ ya.
5
Ma nꞌebe ọzọ, Chineke kwuru okwu banyere ụfọdụ ndị Juu a sị “Ha agaghị aba nꞌebe izuike m.”
6
Nꞌihi nke a anyị na-ahụ na ozuzu ike dị nꞌihu nye ụfọdụ. Ọ bụ ezie na ndị mbụ nụrụ ozi ọma a abanyeghị nꞌebe izuike ahụ. Ha abanyekwaghị nꞌihi na ha erubeghị isi nꞌokwu Chineke site na-ekweghị ekwe ha.
7
Ma mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, Chineke kwuru okwu. Nꞌoge Devidi, Chineke kwuru okwu ọzọ banyere ozuzu ike. Ọ dọrọ ha aka na ntị sị “Gee ntị nꞌolu ya taa ụnu emekwala ka obi unu sie ike dị ka ndị ahụ mere ka iwe wee m.”
8
Nꞌoge gara aga, Joshua nyeere ụmụ Izirel aka ịchọta otu ụdị ezumike. Ma ala ahụ Chineke kwere ha na nkwa enyezughị ha ezumike zuru oke. Nꞌihi na a sị na ezumike ahụ zuru oke, Chineke agaraghị ekwukwa okwu banyere ụbọchị ọzọ.
9
Nke a na-egosi anyị na ndị Chineke nile na-ele anya ezumike zuru oke nꞌebe Chineke nọ, ezumike ga-adị ka ezumike Chineke nꞌụbọchị nke asaa.
10
Nꞌihi na onye ọ bụla banyere nꞌezumike Chineke esitela nꞌọrụ nwee izuike, dị ka Chineke siri banye nꞌizuike nke ya mgbe o kechara ihe nile.
11
Ya mere, ka anyị mee ka ike anyị ha, ka anyị banye nꞌebe izuike nke eluigwe, ka ọ hapụ ịdịkwa onye ọ bụla nꞌime anyị nke na-agaghị aba nꞌihi ekweghị ekwe dị ka ụmụ Izirel.
12
Nꞌihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọ bụla. Ọ na-adụba ruo nꞌebe mkpụrụ obi na mmụọ kewara onwe ha, na ruo nꞌebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha gbaa nꞌanwụ ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ.
13
Ọ dịghị ihe ọ bụla nꞌime ihe nile e kere eke pụrụ izo onwe ya site nꞌebe Chineke nọ. Ihe nile ghere oghe, gbara ọtọ nꞌihu anya ya. Ọ bụ nꞌihu ya ka anyị nile ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị nile.
14
Ma anyị nwere Jisọs Ọkpara Chineke dị ka onyeisi nchụaja ukwu nke ndụ anyị. Ọ nọ ugbu a nꞌeluigwe nꞌihu Chineke. Nꞌihi nke a ka anyị jidesie okwukwe ahụ anyị kwupụtara aka ike.
15
Nꞌihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara Jisọs ọnwụnwa nꞌụzọ nile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma o meghị mmehie nꞌụzọ ọ bụla mgbe a nwara ya.
16
Ya mere, ka anyị bịaruo oche amara Chineke nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nꞌoge mkpa.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13