bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Hebrews 6
Hebrews 6
Igbo 1988
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 7 →
1
Ya mere ka anyị hapụtụ ozizi ndị ahụ a na-ezi ndị kweere na Kraịst ọhụrụ, ma ka anyị lenye anya nꞌokwu ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ. Ọ kwesịghị ka anyị malitekwa tọwa ntọ ala gbasara inwe okwukwe na Chineke, na inwe nchegharị site na ndụ ọjọọ ndị ahụ na-eweta ọnwụ.
2
Ọ dịghị mkpa na a ga-akụziri unu ihe banyere ime baptizim, onyinye nke Mmụọ Nsọ, mbilite nꞌọnwụ na ikpe ebighị ebi.
3
Site nꞌike Chineke, anyị ga-aga nꞌihu ikwu ihe ọzọ.
4
Ọ bụ ihe rara ahụ ime, ka ụfọdụ laghachikwute Chineke, ma ọ bụrụ na ha aghọtala ozi ọma ahụ, detụkwa onyinye ahụ si nꞌigwe ire. Ọ bụrụ na ndị a eketakwala oke nꞌime Mmụọ Nsọ.
5
Ma ọ bụrụ na ha anụrụla ụtọ nke okwu Chineke, na ebube ọ dị bụ ike nke ụwa gaje ịbịa.
6
Ọ bụrụ na ndị dị otu a ajụ Chineke, ọ rara ahụ imekwa ka ha chegharịa. Ọ pụghị ime! Ihe ha mere mgbe ha jụrụ Chineke, bụ ịkpọgide Ọkpara Chineke nꞌobe ọzọ, na imekwa ya ihe ihere nꞌihu ọha.
7
Mgbe mmiri zokwasịrị ubi mmadụ, nke mere ka ubi ahụ mịa ezi mkpụrụ, Chineke agọziela ubi ahụ.
8
Ma ọ bụrụ na ubi ahụ epuo nanị ogwu na ahihia, kama ịmị mkpụrụ, ubi a abaghị uru. Ihe a ga-eme ya bụ ịkpọ ya ọkụ.
9
Ma echeghị m na ọ bụ unu ka okwu a dịrị ụmụnna m. Unu bụ ndị kwere ekwe, ya mere unu na-amị ezi mkpụrụ nke ya na nzọpụta unu so bịa.
10
Nꞌihi na Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi. Olee otu ọ ga-esi chefuo ọrụ nile unu rụụrụ ya? Olee otu ọ ga-esi chefuo ịhụnanya unu gosiri nꞌihi ya site nꞌinyere ibe unu ndị kwere ekwe aka?
11
Anyị chọrọ ka unu nọgide na-eme ka ịnụ ọkụ nꞌobi unu dịgide na-aga nꞌihu tutuu ruo ọgwụgwụ ndụ. Unu ga-anata ụgwọ ọrụ unu nke zuru ezu.
12
Anyị achọghị ka unu bụrụ ndị umengwụ, kama na-adịnụ ka ndị ahụ ji okwukwe na ntachi obi na-anata ihe ọ bụla Chineke kwere na nkwa.
13
Ihe ịma atụ bụ nkwa nke Chineke kwere Eberaham. Mgbe Chineke kwere Eberaham nkwa, ọ ṅụrụ iyi. O jiri aha ya, Chineke, ṅụọ iyi, nꞌihi na ọ dịghị onye ọzọ dị ukwuu karịa ya.
14
Ọ ṅụrụ iyi sị “Nꞌezie aga m agọzi gị. Aga m eme ka ị ghọọ nna nke mba dị ukwuu.”
15
Eberaham jiri ntachi obi chere tutuu Chineke emezuo nkwa ya. Eberaham nwetara nwa nwoke.
16
Anyị na-eji ndị dimkpa ṅụọ iyi ka anyị mezuo nkwa anyị kwere. Nkwa e kwere nꞌụzọ dị otu a enweghị ịrụ ụka.
17
Chineke jiri ịṅụ iyi kee onwe ya agbụ, ka ndị nile nwere nkwa ya hapụ inwe obi abụọ. Ha agaghị eche na Chineke ga-agbanwe ihe o zubere ime.
18
Ugbu a Chineke ji ụzọ ihe abụọ nke na-enweghị mgbanwe kee onwe ya agbụ ime ka nkwa ya guzosie ike. Ọ bụ ihe na-apụghị ime eme na Chineke ga-ekwu okwu ụgha. Ya mere, anyị nwere oke ntụkwasị obi na ọ ga-echebe anyị mgbe anyị gbakwuuru ya,
19
Ntụkwasị obi nchebe ebighị ebi a nke guzo chịm bụ ebe mkpụrụ obi anyị na-adabere nꞌime olileanya. Ntụkwasị obi a dị ka eriri nke jikọtara anyị na Chineke.
20
Jisọs eburula anyị ụzọ laa nꞌeluigwe. Ebe ahụ ka ọ na-arịrịọ anyị arịrịọ dị ka onyeisi nchụaja anyị ruo mgbe ebighị ebi. Ọnọdụ ya dịkwa dị ka nke Melikizedeki.
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 7 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13