bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Hebrews 11
Hebrews 11
Igbo 1988
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 12 →
1
Gịnị bụ okwukwe? Okwukwe bụ inwe ntụkwasị obi na ihe anyị na-ele anya ya ga-amezu. Ọ bụkwa inwe ntụkwasị obi siri ike banyere ihe anyị na-ahụghị anya.
2
Ọ bụ site nꞌokwukwe ha ka ndị mbụ kweere na Chineke ji nwee nnwapụta ọma ya.
3
Ọ bụ site nꞌokwukwe ka anyị ji mara na e mere ụwa na ihe nile anyị na-ahụ anya site nꞌokwu Chineke. Nꞌihi nke a, ihe anyị na-ahụ anya ugbu a bụ ihe e mere site nꞌihe anyị na-adịghị ahụ anya.
4
Ebel bụ nwoke nwere okwukwe nꞌime Chineke. Ọ chụrụ aja dị mma nye Chineke karịa aja nke nwanne ya Ken chụrụ. Site nꞌokwukwe o nwere nnwapụta Chineke na ọ bụ onye ezi omume. Chineke nabatara Ebel nꞌihi na o nyere onyinye ya site nꞌokwukwe. Ma ugbu a, ọ bụ ezie na Ebel anwụọlarị, anyị nwere ike ịmụta ihe site na ndụ ya banyere inwe okwukwe nꞌime Chineke.
5
Enọọk tụkwasịkwara Chineke obi nꞌụzọ dị otu a. Nꞌihi nke a, Chineke kuuru ya laa nꞌeluigwe na-anwụghị anwụ. Otu mgbe ahụ o furu mgbe Chineke wezụgara ya. Akwụkwọ nsọ gwara anyị na Enọọk mere ihe tọrọ Chineke ụtọ.
6
Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nꞌihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị inwe okwukwe na Chineke dị. Na ọ bụkwa onye na-akwụghachi onye ọ bụla na-achọ ya.
7
Noa bụ otu onye nꞌime ndị nwere okwukwe na Chineke. Chineke dọrọ Noa aka na ntị banyere ihe gaje ime. Noa kweere. Ọ bụ ezie na otu mkpụrụ igwe ojii adịghị nꞌeluigwe, ma na-atụfughị mgbe, Noa wuru ụgbọ mmiri o ji zọpụta onwe ya na ndị ezinụlọ ya. Okwukwe Noa adịghị ka nke ndị ọzọ nọ nꞌụwa nꞌoge ahụ. Ya mere, Noa sitere nꞌokwukwe bụrụ onye nketa alaeze Chineke.
8
Site nꞌokwukwe, Eberaham rubeere Chineke isi. Chineke gwara ya ka ọ hapụ ala ya gaa nꞌala ọzọ dị anya Chineke ga-egosi ya. Ọ bụ nanị ala e kwere na nkwa! Ma Eberaham biliri gaa, ma ọ mataghị ebe ọ na-aga.
9
Site nꞌokwukwe Eberaham biri nꞌala ahụ Chineke kwere ya na nkwa. Ma ọ bụ ọbịa nꞌebe ahụ. Otu aka ahụ Jekọb na Aizik bikwara nꞌebe ahụ dị ka ndị ọbịa. Ma Chineke kwere ha nkwa na ha ga-enwe ala ahụ.
10
Eberaham mere nke a nꞌihi na ọ na-ele anya ala eluigwe ahụ. Ọ tụkwasịrị Chineke onye wuru obodo ahụ obi na ọ ga-akpọbata ya nꞌala ahụ.
11
Sera emeela agadi ịmụta nwa. Ma ọ tụkwasịrị obi na Chineke ga-edebezu nkwa ya. Nꞌihi nke a Chineke nyere ya ike ịmụta nwa.
12
Site nꞌotu nwa a Eberaham ghọrọ nna mba dị ukwuu. Ndị mmadụ chere na Eberaham na Sera emeela agadi ịmụta nwa. Ma taa, site nꞌotu nwoke a bụ Eberaham e nwere ụmụ ụmụ ya dị ukwuu dị ka kpakpando eluigwe. Ha dị ukwuu dị ka aja dị nꞌakụkụ osimiri.
13
Ndị a nile bụ ndị nwere okwukwe nꞌime Chineke. Ma ha nwụrụ na-ele anya nkwa Chineke kwere ha. Ha ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi nke a, na-aghọtakwa na ha bụ ndị ọbịa nꞌụwa.
14
Nꞌezie, ndị a nile gụrụ onwe ha dị ka ndị ọbịa nꞌụwa lere anya ala ọzọ. Ha na-ejikere maka ụlọ ha dị nꞌeluigwe.
15
Nꞌihi nke a, ha achọghị ile anya nꞌazụ nꞌihe ụwa ha hapụrụ. Ha gaara alaghachi azụ ịchọ ọganihu ụwa. Ma ha dabeere na-ele anya ngọzi sị nꞌeluigwe nke Chineke na-enye.
16
Nke a bụ nꞌihi na ha chọrọ ibi nꞌụlọ ha dị nꞌeluigwe. Nꞌihi nke a Chineke naara ha dị ka ụmụ ya. Ihere ha emeghị ya. Nꞌihi na o dozielara ha ebe obibi nꞌeluigwe.
17
Ọ bụ okwukwe Eberaham nwere nꞌime Chineke mere o ji kwere iwere nwa ya Aizik chụọ aja mgbe Chineke nwara ya ọnwụnwa. Eberaham bụ onye Chineke kwere nkwa ma o kwadoro iji nwa ahụ ọ mụrụ nanị ya chụọra Chineke aja.
18
Nꞌezie, Eberaham kwadoro igbu Aizik, onye ahụ Chineke sị na a ga-esite nꞌaka ya kpọọ Eberaham nna ọtụtụ mba!
19
Nꞌime nke a Eberaham tụkwasịrị Chineke obi. O nwere okwukwe na a sịkwa na Aizik anwụọ na Chineke ga-eme ka ọ dị ndụ ọzọ. Ee, Chineke anọghị nꞌụra! O chebere ndụ Aizik.
20
Ọ bụ okwukwe ka Aizik jiri nye Jekọb na Ịsọ ngọzi banyere ihe dị nꞌihu.
21
Ọ bụ okwukwe ka Jekọb ji gọzie ụmụ Josef tupuu ọ nwụọ. Ọ kpọrọ isi ala nye Chineke mgbe ọ na-adabere na mkpa nꞌaka ya.
22
Josef gosiri okwukwe tupuu ọ nwụọ. O kwuru okwu banyere otu ndị Izirel ga-esi hapụ ala Ijipti, nye ndụmọdụ banyere ịchịkọta ọkpụkpụ ya.
23
Nne na nna Mosisi zipụtara okwukwe mgbe ha mụrụ Mosisi. Ha zoro ya ọnwa atọ nꞌihi na ọ bụ nwa mara mma. Ha atụkwaghị egwu iwu nke eze ala Ijipti bụ Fero nyere.
24
Mosisi nwere okwukwe mgbe o toro ghọọ dimkpa. O kweghị ka a kpọọ ya nwa ada Fero.
25
Ọ họọrọ isoro ụmụ Chineke takọọ ahụhụ karịa inwe anụrị nke mmehie. Ọ jụrụ ibi na mmehie jụkwa akụ na ụba nke Ijipti. Ọ matara na ihe ndị a agaghị adịgide ruo ebighị ebi. Nꞌihi nke a ọ họọrọ isoro ụmụ Izirel ịhụ ahụhụ.
26
O kpebiri na ọ bụ ihe karịchara mma ịhụ ahụhụ nꞌihi Kraịst, onye e kwere nkwa ya, kama inweju akụ nile nke Ijipti afọ. Nꞌihi na ọ na-ele anya na Chineke ga-akwụghachi ya.
27
Okwukwe ka Mosisi ji hapu Ijipti. Ọ tụghị egwu iwe eze nꞌihi na ọ dị ka ọ na-ahụ Chineke anya, na Chineke nọnyere ya mgbe nile.
28
O sitekwara nꞌokwukwe debe mmemme ngabiga. O fesara ọbara ka mmụọ ozi ahụ Chineke zipụrụ igbu ụmụ ndị Ijipti nile e buru ụzọ mmụọ, hapụ imetụ ụmụ ndị Izirel aka.
29
Osimiri uhie ka ụmụ Izirel gafere dị ka a ga-asị na ọ bụ ala efu. Ma ndị Ijipti nwara ime nke a ka mmiri gbagburu nꞌime osimiri a.
30
Mgbidi Jeriko dara mgbe ụmụ Izirel jiri okwukwe gaa ya gburugburu ụbọchị asaa.
31
Rehaab (nwanyị akwụla), esoghị ndị na-ekweghị ekwe lakọọ nꞌiyi nꞌobodo Jeriko nꞌihi na ọ bụ site nꞌokwukwe ka o jiri lekọtaa ndị Izirel ledoro obodo Jeriko anya.
32
Ọ dịkwa ọtụtụ ndị ọzọ bụ ndị biri ndụ okwukwe. Ma enweghị m oge ikwu ihe banyere ha. Ndị dị ka Berak, Samsin, Jefta, Devidi, Samuel na ndị amụma.
33
Okwukwe ka ha jiri merie mba dị iche iche. Okwukwe ka ha jiri bie ndụ ezi omume, nata nkwa dị iche iche. Okwukwe ka ha jiri meekwa ka ike ọdụm ghara ịdị ire.
34
Ọ bụkwa okwukwe ka ha jiri nọọ nꞌime ọkụ na-enweghị mmerụ ahụ. Okwukwe ka ọtụtụ jiri gbanarị ọnwụ. Okwukwe ka ndị dara mba jiri dịrị ike, meekwa ka ụmụ ndị iro dị ike gbalaga.
35
Site nꞌokwukwe ụmụ nwanyị ụfọdụ ka e nyeghachiri ụmụ ha site nꞌọnwụ. Ndị ọzọ naara ntaramahụhụ nꞌihi na ha sitere nꞌokwukwe jụ ịgọnarị Chineke. Ha kweere na Chineke ga-enye ha mbilite nꞌọnwụ kachasị mma ma ọ bụrụ na ha nọgide bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi.
36
E mere ụfọdụ ihe ọchị, tiekwa ha ihe otiti. A tụrụ ndị ọzọ mkpọrọ. Ma ha nọgidesịrị ike bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi.
37
A tụrụ ụfọdụ nkume, kwọbie ụfọdụ abụọ. Ụfọdụ bụkwa ndị dara ụkpa, bụrụ ndị a na-amaghị ama. A kpagbukwara ụfọdụ.
38
Ha wagharịrị nꞌọzara na nꞌugwu, nꞌọnụ nkume na nꞌọnụ ala. Agụụ, ahụ ọkụ, na mmekpa ahụ dị iche iche dịgidere ha nꞌahụ. Nꞌanya ụwa a gụrụ ha nꞌihe efu.
39
Ma lee! ndị a nile natara ezi ọgbụgba ama site nꞌokwukwe ha, ma ha anataghị nkwa ahụ Chineke kwere ha.
40
Ha enwetaghị nkwụghachi okwukwe ha nꞌihi na Chineke pịara na ha ga-echere soro anyị keta ihe nketa kachasị mma nke Chineke kwadooro anyị.
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 12 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
Recommended Reading
Commentary
Hebrews Commentaries
→
Devotional
Hebrews Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→