bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Hebrews 5
Hebrews 5
Igbo 1988
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 6 →
1
Nꞌihi na a na-esite nꞌetiti ndị mmadụ họpụta onyeisi nchụaja. A na-ahọpụta onye ahụ ka ọ bụrụ onye na-anọchite anya mmadụ ibe ya nꞌihu Chineke. Ọ na-achụkwa aja, na-enye Chineke onyinye nꞌihi mmehie ndị ya.
2
Onyeisi nchụaja esi otu a họpụta na-enwe ọmiko nꞌahụ ndị ya. Ọ maara ndị na-amaghị ihe nꞌetiti ha. Ọ maara ndị na-adịghị ejezi ije. Ọ makwaara na dị ka ha, ya onwe ya nwere ọrụ.
3
Nꞌihi ọrụ nke ya onwe ya nwere, aja mbụ ọ na-achụrụ Chineke bụ nꞌihi ya onwe ya. Emesịa, ọ na-achụ aja ọzọ nꞌihi ndị ya.
4
Mmadụ ọ bụla apụghị ime onwe ya onye nchụaja. Ọ bụ nanị Chineke pụrụ ime mmadụ ka ọ bụrụ onye nchụaja. Cheta na ọ bụ Chineke mere Erọọn ka ọ bụrụ onye nchụaja.
5
Otu a kwa Kraịst emeghị onwe ya onye nchụaja, ọ bụ Chineke mere ya onye nchụaja. Chineke gwara ya okwu sị “Nwa m, taa ebuliela m gị elu.”
6
Mgbe ọzọ kwa Chineke gwara Kraịst okwu sị ya “Dị ka Melikizedeki, ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.”
7
Mgbe Jisọs nọ nꞌụwa, o kpere ekpere nye Chineke. Mgbe ụfọdụ nꞌọnọdụ ekpere ahụ, ọ na-akwa akwa. Mgbe ọzọ kwa, anya mmiri na-ejupụta ya nꞌanya. O kpere ekpere ya nye Chineke nꞌihi na ọ maara na Chineke pụrụ ịzọpụta ya site nꞌọnwụ. Chineke nụkwara ekpere ya, nꞌihi na Jisọs bụ onye nchụaja na-erube isi.
8
Jisọs bụ Ọkpara Chineke, ma ọ hụrụ ahụhụ. Nꞌime ahụhụ a nile, ọ mụtara irube isi site nꞌihe nile dakwasịrị ya.
9
Ma Kraịst sitere nꞌahụhụ ghọọ onye zuru oke. Ọ ghọrọ ụzọ nzọpụta zuru oke, nye mmadụ nile bụ ndị na-erubere ya isi.
10
Cheta na Chineke gụrụ ya onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi. O yiri Melikizedeki. Cheta na o siteghị nꞌagbụrụ ndị nchụaja. Ma Chineke mere ya onyeisi nchụaja pụrụ iche.
11
Ọ dị ọtụtụ ihe ọzọ m nwere ikwu banyere Kraịst na otu o siri bụrụ onye nchụaja. Ma ọ rara ahụ ịkọwa ya nꞌụzọ unu ga-aghọta ya. Ọ dị ka ịghọta eziokwu nke ime mmụọ adịghị ekwe unu.
12
Lee kemgbe unu kweere na Kraịst! Unu kwesịrị izi ndị ọzọ ihe ugbu a, ma unu nọrịrị na-ele anya ka ndị ọzọ bịa zie unu, dị ka unu bụ ọbịa nꞌokwu Chineke. Ụfọdụ nꞌime unu enwebeghị ike ịghọta ozizi dị mfe dị nꞌime akwụkwọ nsọ. Ndị a dị ka ụmụ ọhụrụ. Ha na-achọ ihe dị mfe, ihe na-esighị ike, dị ka ịṅụ ara.
13
Ma onye ọ bụla na-aṅụ ara, bụ nwa ọhụrụ, ee, nwa ọhụrụ nꞌime Kraịst. Ọ dị ka onye nke Kraịst na-enweghị ike ịkọwa ihe dị iche nꞌetiti ezi ihe na ihe ọjọọ. Ọ bụkwa nwa ọhụrụ nꞌime Kraịst.
14
Nri dị ike dị ka ụtara dịrị ndị Kraịst katara ahụ. Anyị chọrọ dimkpa nꞌokwu Chineke. Ha pụrụ ịmata ihe dị iche nꞌetiti ezi ihe na ajọ ihe.
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 6 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13