bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Hebrews 9
Hebrews 9
Igbo 1988
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 10 →
1
Nꞌime ịgba ndụ nke mbụ, Chineke nyere ụmụ Izirel ụkpụrụ ha ga-eso ife ya ofufe. Ha nwere ụlọ ikwu ebe ha na-efe Chineke.
2
Ụlọ ikwu a nwere ọnụ ụlọ abụọ. Nꞌime ọnụ ụlọ nke mbụ e nwere ebe a na-adọkwasị iheọkụ. Tebulu ebe a na-adọkwasị beredi dị nsọ dịkwa nꞌime ụlọ a. A na-akpọ ọnụ ụlọ nke mbụ a, Ebe Nsọ.
3
Nꞌetiti ọnụ ụlọ nke mbụ na nke abụọ, akwa mgbochi dị. Nꞌazụ akwa mgbochi a, a ga-ahụ ọnụ ụlọ nke ọzọ, nke a na-akpọ Ebe Nsọ kachasị Ebe Nsọ.
4
Nꞌime ụlọ nke abụọ ahụ, ebe ịchụ aja dị ya nke e jiri ọlaedo wuo. Nꞌelu ebe ịchụ aja a ka a na-achụ aja nsure ọkụ. Nꞌebe a kwa ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị. E ji ọlaedo machie ahụ ya. Nꞌime igbe a mbadamba nkume dị ya. Nke a bụ nkume ahụ Chineke dere iwu iri nꞌelu ya. Otu ite ntakịrị e jiri ọlaedo kpụọ dịkwa nꞌime igbe a. Nꞌime ite ahụ, mana dị ya. Mana bụ nri dị iche Chineke jiri zụọ ndị Juu mgbe ha na-aga ije nꞌọzara. Mkpa nꞌaka Erọọn dịkwa nꞌime igbe a. Nke a bụ mkpa nꞌaka ahụ wepụtara ahihia ndụ nꞌọzara.
5
Nꞌime ọnụ ụlọ nke abụọ ahụ, ọ bụrụ na e lee anya nꞌelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, a ga-ahụ ndị mmụọ ozi a kpụrụ akpụ. Ha nwere nku dị ka nnụnụ. Aha ha bụ Cherubim. Ha bụ ndị na-echekwa otuto Chineke. Ma anyị enweghị ike ịkọwacha ihe nile ndị a.
6
Mgbe e doro ihe nile ndị a nꞌusoro, onye nchụaja na-abata. Ọ na-abata mgbe ọ bụla nꞌime ọnụ ụlọ nke mbụ nke ụlọ ikwu a. Nꞌebe a ka ọ na-arụ ọrụ o ketara ịrụ ụbọchị nile nye Chineke.
7
Ma ọ bụ nanị onyeisi nchụaja na-aba nꞌebe ahụ a na-akpọ Ebe Nsọ Kachasị ebe Nsọ. Ọ na-aba nꞌebe ahụ nanị otu mgbe nꞌafọ. Ọ na-ejikwa ọbara na-aba nꞌebe ahụ. Ọbara ọ ga-eji buru ụzọ chụọ aja nꞌihi mmehie nke onwe ya. Mgbe ọ chụchara aja nꞌihi onwe ya, ọ na-achụkwa aja nꞌihi ndị ya nile.
8
Mmụọ Nsọ jiri ihe ndị a nile na-ezi anyị na nꞌime ọnọdụ ọchụchụ aja ochie, mmadụ efu ọ bụla enweghị ike ịba nꞌebe nsọ kachasị ebe nsọ ahụ nꞌihi na ọnụ ụlọ nke mbụ ahụ a na-akpọ ebe nsọ dị ya.
9
Nke a bụụrụ anyị ihe mmụta taa. Nꞌihi na nꞌọnọdụ ochie ahụ, ha na-achụ aja na-enye onyinye, ma aja ha nile emeghị ka ha zuo oke.
10
Nꞌime usoro nke mgbe ochie ahụ, a gwara ha ụdị ihe oriri na ụdị ihe ọṅụṅụ ha kwesịrị iri na ịṅụ. A gwakwara ha ụdị mmemme dị iche iche ha ga-eme nꞌihi ido onwe ha nsọ. Ma enyeghị ha usoro ndị a ka ọ dịrị ruo mgbe ebighị ebi. E nyere ha usoro ndị a ka ọ bụrụ iwu ga-enyere ha aka ife Chineke tutuu ruo mgbe Chineke ga-edozigharị ihe nile.
11
Ma Kraịst abịalarị. Ya onwe ya bụ ezi onyeisi nchụaja nke ọnọdụ ọhụrụ ahụ anyị nwere ugbu a. Ebe ọ na-arụ ọrụ nchụaja ya abụghị nꞌụlọ mmadụ jiri aka wuo. Kama ọ bụ nꞌụlọ nchụaja zuru oke dị nꞌeluigwe.
12
Otu mgbe nanị ka Kraịst bara nꞌebe kachasị nsọ nke ụlọ ikwu ahụ. O jighị ọbara ewu na ọbara ebule chụọ aja. Kama o jiri ọbara nke ya onwe ya. O jiri ọbara ya chụọ aja nanị otu mgbe. O sitere na nke a mee ka anyị nweta nzọpụta ebighị ebi.
13
Na mgbe ochie, ọ bụrụ na ọbara ewu na nke ehi, ya na ntụ e wetara site nꞌebe a kpọrọ anụ ndị a ọkụ, nke e fekwasịrị ndị rụrụ arụ, pụrụ ihicha mmehie, meekwa ka ha dị ọcha,
14
ọbara Kraịst ọ̀ pụghị ime ka anyị dị ọcha karịa? Nꞌezie ọbara ya zubigara oke ịsachpụ mmehie anyị nile, nꞌihi na Kraịst sitere na Mmụọ nke na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi were onwe ya nye na-enweghị ntụpọ. Ọbara ya zubigara oke ịsacha obi anyị na ime anyị ka anyị dị ọcha site nꞌajọ ọrụ nile, bụ ọrụ nke na-eweta ọnwụ. Aja o jiri onwe ya chụọ, mere ka anyị nwere onwe anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke onye dị ndụ.
15
Kraịst wetara ọgbụgba ndụ ọhụrụ a ka ndị nile Chineke kpọrọ bịaruo nso iketa nkwa ebighị ebi Chineke kwere ha. Ugbu a ndị nile Chineke kpọrọ nwere ike ịbịaru ya nso, nꞌihi na Kraịst nwụrụ gbapụtakwa ha site nꞌikpe ọmụma dịrị ha nꞌihi mmehie nile ha mehiere nꞌọnọdụ ọgbụgba ndụ ochie ahụ.
16
Mmadụ ọ bụla nwere ike idepụta ihe ọ chọrọ ka onye ọzọ keta nꞌime ihe nile o nwere mgbe ọ nwụrụ. A gaghị ekenye onye ọ bụla ihe onye ahụ nwere tutuu ruo mgbe onye depụtara ihe ahụ nwụrụ. Nꞌihi na a gaghị eke ihe o nwere mgbe ọ dị ndụ.
17
Ọ bụrụ na ọ nwụghị, ihe nile o nwere ga-adị otu ahụ. Ndị nketa ga-echekwa ruo mgbe ọ nwụrụ.
18
Nke a mere e jiri were ọbara mesie ọgbụgba ndụ ochie ahụ ike.
19
Nꞌihi na mgbe Mosisi nyechara ndị Juu iwu Chineke ahụ, o weere ọbara ewu na nke ehi tinyere mmiri, fesaa ya nꞌelu akwụkwọ iwu Chineke na nꞌelu mmadụ nile nọ nꞌebe ahụ nꞌoge ahụ. Ọ bụ alaka osisi hisọpụ na akpụkpọ aji nwa atụrụ na-acha odo odo ka o ji fesaa ọbara na mmiri ahụ.
20
Mgbe ọ na-eme ihe ndị a ọ gwara ndị mmadụ sị, “Ọbara a bụ ihe na-emesi ọgbụgba ndụ ahụ ike, bụ ọgbụgba ndụ dị nꞌetiti unu na Chineke. Ọ bụkwa Chineke nyere m iwu ka unu debe ọgbụgba ndụ a.”
21
Mgbe o kwuchara nke a o fesakwara ọbara ahụ nꞌelu ụlọ ikwu na nꞌelu ihe nile dị nꞌụlọ ikwu, bụ ihe e ji efe Chineke.
22
Nke a na-ezipụta otu ihe: na nꞌọnọdụ ochie ahụ, a na-eji ọbara mee ka ihe nile dịrị ọcha. Nke a na-ezikwa anyị na a sị rịị na a wụsịghị ọbara mgbaghara mmehie agaraghị adị.
23
Nke a na-ezipụta na ụlọ ikwu ahụ na ihe nile dị nꞌime ya bụ ụdị ihe nile dị nꞌeluigwe. Nꞌihi nke a, ọ dị mkpa na ihe nile dị nꞌime ụlọ ikwu a na ụlọ ikwu nꞌonwe ya kwesịrị ka e were ọbara mee ka ha dị ọcha. Otu aka ahụ, ihe nile dị nꞌeluigwe, bụ ihe ahụ ụlọ a dị nꞌụwa yiri, ka e mere ka ha dịkarịa ọcha site nꞌịta dị oke ọnụ ahịa bụ obara Kraịst.
24
Nꞌihi na Kraịst abanyeghị nꞌụlọ nsọ dị nꞌụwa, nke mmadụ wuru. Kama o rigooro nꞌeluigwe ebe ọ nọ ugbu a na-ekwuchitere anyị ọnụ anyị nꞌihu Chineke nꞌonwe ya.
25
Ma Kraịst ejighị onwe ya chụọ aja ọtụtụ mgbe dị ka onyeisi nchụaja ndị Juu na-eji ọbara ewu na-abanye nꞌebe nsọ ahụ afọ nile.
26
A sịkwarị na ọ bụ ihe dị mkpa na Kraịst kwesịrị iji onwe ya chụọ aja ọtụtụ mgbe ọ gaara na-anwụ site nꞌoge ruo nꞌoge kemgbe ụwa bidoro. Ma o sighị otu a dị! Kama Kraịst bịara nanị otu ugboro mgbe ọgwụgwụ ihe nile dị nso, iwepụ mmehie site nꞌiji onwe ya chụọ aja.
27
Nꞌihi na dị ka o si bụrụ ihe a kwadobeere mmadụ na ọ ga-anwụ nanị otu ugboro, ma nke a gasịa ikpe eso ya,
28
otu a kwa, Kraịst nwụrụ nanị otu ugboro, dị ka aja a chụrụ nꞌihi mmehie mmadụ nile. Ọ nwụrụ ma Chineke mere ka o site nꞌọnwụ bilie. Ọ ga-abịa ọzọ! Ma ọ bụghị maka ịchụ aja ọzọ nꞌihi mmehie anyị, kama ọ ga-abịa iwetara ndị nile ji okwukwe na olileanya na-eche ọbịbịa ya nzọpụta.
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 10 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13