bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Deuteronomy 11
Deuteronomy 11
Igbo 2006
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 12 →
1
I gāhu kwa Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, debe ihe-ndebe-Ya, na ukpuru-Ya nile, na ikpé-Ya nile, na ihe nile Ọ nyere n'iwu, ubọchi-gi nile.
2
Ma unu amawo ta: n'ihi na ọ bughi umu-unu ka m'nāgwa okwu, bú ndi nāmaghi, ndi nāhughi kwa idọ-aka-na-nti nke Jehova, bú Chineke-unu, na idi-uku-Ya, na aka-Ya di ike, na ogwe-aka-Ya esetiri eseti,
3
na ihe-iriba-ama-Ya nile, na omume-Ya nile, nke Ọ mere Fero eze Ijipt, me kwa ala-ya nile, n'etiti Ijipt;
4
na ihe O mere usu-ndi-agha Ijipt, me kwa inyinya-ha, me kwa ub͕ọ-ala-ha; mb͕e O mere ka miri Oké Osimiri Uhie rukpuchie iru-ha mb͕e ha nāchu unu n'azu, Jehova we me ka ha la n'iyì rue ta;
5
na ihe O mere unu n'ọzara, rue mb͕e unu biaruru ebe a;
6
na ihe O mere Detan na Abairam, umu Eliab, nwa Reuben; mb͕e ala saghepuru ọnu-ya, loda ha, na ezi-na-ulo nile ha, na ulo-ikwū nile ha, na ihe ọ bula di ndu nke di n'ukwu-ha, n'etiti Israel nile:
7
ma ọ bu anya-unu nāhu omume uku nile nke Jehova, nke O meworo.
8
Unu gēdebe kwa ihe nile enyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka unu we di ike, ba nime, nweta ala ahu, ebe unu onwe-unu nāgabiga inweta ya;
9
ka unu we me kwa ka ubọchi-unu di anya n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha, inye kwa nkpuru-ha, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù erù nime ya.
10
N'ihi na ala ahu, ebe gi onwe-gi nābà nime inweta ya, ọ bughi dika ala Ijipt ka ọ bu, ebe unu si puta, ebe i nāgha nkpuru-gi, were ukwu-gi nāb͕a ya miri, dika akwukwọ nri ubi ab͕ara ogige:
11
ma ala ahu, ebe unu nāgabiga inweta ya, bu ala ugwu na ndagwurugwu; site na miri-ozuzo nke elu-igwe ka ọ nāṅu miri:
12
ọ bu ala nke di Jehova, bú Chineke-gi, n'obi; mb͕e nile ka anya Jehova, bú Chineke-gi, nādikwasi ya, site na mb͕e mbu nke arọ we rue mb͕e ikpe-azu nke arọ.
13
O gēru kwa, ọ buru na unu ejisie ike ige nti ihem nile enyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, na iwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile fè Ya òfùfè,
14
na m'gēnye miri-ozuzo ala-unu na mb͕e-ya, miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, ka i we chikọta ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi.
15
M'gēnye kwa anu-ulo-gi ihe-ọkuku n'ubi-gi, i gēri kwa, afọ gēju kwa gi.
16
Lezienu onwe-unu anya, ka ewe ghara irafu obi-unu, unu ewe wezuga onwe-unu, fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha;
17
iwe Jehova we di ọku megide unu, O we b͕ochie elu-igwe, ka miri-ozuzo we ghara idi, ka ala we ghara kwa imi ihe-ọmume-ya; unu we si n'ezi ala ahu, nke Jehova nēnye unu, la n'iyì ngwa ngwa.
18
Unu gēdo kwa okwu ndia n'obi-unu na nime nkpuru-obi-unu; unu gēke kwa ha n'elu aka-unu ka ha buru ihe-iriba-ama, ha gābu kwa nkpọ-n'iru n'etiti anya-unu.
19
Unu gēzí umu-unu ha, n'ikwu okwu bayere ha mb͕e i nānọdu n'ulo-gi, na mb͕e i nēje ije n'uzọ, na mb͕e i nēdina ala, na mb͕e i nēbili ọtọ.
20
I gēdekwasi kwa ha n'awara-uzọ abua nke ulo-gi, na n'ọnu-uzọ-ama-gi nile:
21
ka ubọchi-unu we ba uba, ha na ubọchi umu-unu, n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha, dika ubọchi elu-igwe nke di n'elu uwa.
22
N'ihi na ọ buru na unu ejisie ike idebe ihe nile a enyere n'iwu nke mu onwem nēnye unu n'iwu, ka unu we me ya; ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, ije ije n'uzọ-Ya nile, na irapara n'aru Ya;
23
Jehova gānapu kwa mba ndia nile ala-ha n'iru unu, unu gēnweta kwa mba di iche iche di uku di kwa ike kari unu.
24
Ebe ọ bula nke ọbu-ukwu-unu gāzọkwasi ka unu gēnwe: site n'ọzara, na Lebanon, site n'osimiri ahu, bú osimiri Yufretis, we rue oké osimiri nke di n'azu, gābu ókè-ala unu.
25
Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru unu: ujọ-unu na egwu-unu ka Jehova, bú Chineke-unu, gātukwasi n'iru ala ahu nile nke unu gāzọkwasi, dika Ọ gwaworo unu okwu.
26
Le, mu onwem nētiye n'iru unu ta ngọzi na nkọcha;
27
ngọzi ahu, ma asi na unu ege nti ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye unu n'iwu ta:
28
ma nkọcha ahu, ma ọ buru na unu egeghi nti ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, ma unu ewezuga onwe-unu n'uzọ ahu nke Mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ka unu we jeso chi di iche iche ọzọ, nke unu nāmaghi.
29
Ọ gēru kwa, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka i ba n'ala ahu, ebe gi onwe-gi nābà nime inweta ya, na i gētiye ngọzi ahu n'elu ugwu Geraizim, tiye kwa nkọcha ahu n'elu ugwu Ibal.
30
Ugwu ndia, hà adighi n'ofè Jọdan, n'azu uzọ ọdida-anyanwu, n'ala ndi Kenean ndi bi n'Araba, na ncherita-iru Gilgal, n'akuku osisi terebinth nke More?
31
N'ihi na unu onwe-unu nāgabiga Jọdan ibà nime inweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye unu, unu gēnweta kwa ya, biri nime ya.
32
Unu gēlezi kwa anya ime ukpuru nile na ikpé nile nke mu onwem nētiye n'iru unu ta.
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 12 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34