bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Deuteronomy 27
Deuteronomy 27
Igbo 2006
← Chapter 26
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 28 →
1
Moses na ndi-okenye Israel we nye ndi Israel iwu, si, Debe ihe nile enyere n'iwu, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta.
2
Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu mb͕e unu gāgabiga Jọdan rue ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, na i gēguzoro onwe-gi nkume uku ọtọ, were ihe-ntechi techie ha:
3
i gēdekwasi kwa ha okwu nile nke iwu a, mb͕e i gabigasiri; ka i we ba n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, dika Jehova, bú Chineke nke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu.
4
Ọ gēru kwa, mb͕e unu gabigasiri Jọdan, na unu gēguzo nkume ndia ọtọ, nke mu onwem nēnye unu n'iwu, n'ugwu Ibal, i gēwere kwa ihe-ntechi techie ha.
5
I gēwu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, bú ebe-ichu-àjà nkume: emela ka ihe-ọlu ígwè ga n'elu ha.
6
I gēji nkume zuru okè wue ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi: i gēsure-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, àjà-nsure-ọku n'elu ya:
7
i gāchu kwa àjà-udo, ri kwa ihe n'ebe ahu; i gāǹuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi.
8
I gēdekwasi kwa na nkume ndia okwu nile nke iwu a, agātu akika ha nke-ọma.
9
Moses na ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, we gwa Israel nile okwu, si, Nọdu du, ge kwa nti, Israel; ubọchi ta ka i ghọworo Jehova, bú Chinek-gi, otù ndi.
10
I gēge kwa nti olu Jehova, bú Chineke-gi, me ihe nile O nyere n'iwu, na ukpuru-Ya nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta.
11
Moses we nye ndi Israel iwu n'ubọchi ahu, si,
12
Ndia gēguzo n'elu ugwu Geraizim igọzi ndi Israel, mb͕e unu gabigasiri Jọdan; Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Josef, na Benjamin:
13
ndia gēguzo kwa n'ugwu Ibal bayere nkọcha; Reuben, na Gad, na Asha, na Zebulun, na Dan, na Naftali.
14
Ndi Livai gēwere olu di elu za, si ndikom nile nke Israel,
15
Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēme arusi apiri api ma-ọbu arusi awuru awu, bu ihe-árú nke Jehova, ọlu aka nke onye nātu akika, we tiye ya n'ebe nzuzo. Ndi Israel nile gāza kwa, si, Amen.
16
Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēlelì nna-ya ma-ọbu nne-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
17
Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēwezuga ókè-ala ab͕ata-obi-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
18
Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēme onye-ìsì ka ọ jehie n'uzọ. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
19
Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēwezuga ikpé nke ọbìa, na nke nwa-nb͕ei, na nke nwayi di-ya nwuru. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
20
Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nwunye nna-ya nēdina; n'ihi na o kpughewo uwe kpuchiri ọtọ nna-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
21
Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na anumanu ọ bula nēdina. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
22
Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nwa-nne-ya nwayi nēdina, bú nwa-nwayi nke nna-ya, ma-ọbu nwa-nwayi nke nne-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
23
Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nne-nwunye-ya nēdina. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
24
Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nētib͕u madu-ibe-ya na nzuzo. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
25
Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nānara ihe-iri-ngo itib͕u madu, bú iwusi ọbara nke onye nēmeghi ihe ọjọ. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
26
Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēmeghi ka okwu nile nke iwu a guzosie ike, ime ha. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
← Chapter 26
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 28 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34