bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Deuteronomy 6
Deuteronomy 6
Igbo 2006
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 7 →
1
Ma nka bu ihe ahu enyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke Jehova, bú Chineke-unu, nyere iwu ka ezí unu, ka unu we me ha n'ala ahu ebe unu onwe-unu nāgabiga inweta ya;
2
ka i we tua egwu Jehova, bú Chineke-gi, idebe ukpuru-Ya nile na ihe nile O nyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye gi n'iwu, gi onwe-gi, na nwa-gi, na nwa nwa-gi, ubọchi nile nke ndu-gi; ka ubọchi-gi we di kwa anya.
3
I gānu kwa, Israel, lezi kwa anya ime ya; ka o we diri gi nma, ka unu we ba kwa uba nke-uku, dika Jehova, bú Chineke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu, n'ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.
4
Nuru, Israel; Jehova, bú Chineke-ayi, Jehova bu otù:
5
i gēwere kwa obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, were kwa ike-gi nile, hu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya.
6
Okwu ndia, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, gādikwasi kwa n'obi-gi:
7
i gējisi kwa ike izí ha-umu-gi, i gēkwu kwa okwu bayere ha mb͕e i nānọdu n'ulo-gi, na mb͕e i nēje ije n'uzọ, na mb͕e i nēdina ala, na mb͕e i nēbili ọtọ.
8
I gēke kwa ha n'elu aka-gi ka ha buru ihe-iriba-ama, ha gābu kwa nkpọ-n'iru n'etiti anya-gi abua.
9
I gēdekwasi kwa ha n'awara-uzọ abua nke ulo-gi, na n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.
10
O gēru kwa, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka i ba n'ala ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà, bú Abraham, na Aisak, na Jekob, iyi, inye gi; obodo uku di iche iche ma-kwa-ra nma, nke i nēwughi,
11
na ulo juputara n'ezi ihe nile, nke i nēmejughi, na olùlù-miri egwuwara egwuwa, nke i nēgwuwaghi, na ubi-vine na osisi olive, nke i nākughi, mb͕e i gēri kwa, afọ eju kwa gi;
12
gi lezie onwe-gi anya, ka i ghara ichezọ Jehova, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, si kwa n'ulo ndi-orù, puta.
13
Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; ọ bu kwa Ya ka i gēfè òfùfè, ọ bu kwa aha-Ya ka i gēwere ṅu iyi.
14
Unu ejesola chi ọzọ, ndi sitere na chi nke ndi ahu ndi nọ unu buruburu;
15
n'ihi na Chineke ekworo ka Jehova, bú Chineke-gi, bu n'etiti gi; ka iwe Jehova, bú Chineke-gi, we ghara idi ọku megide gi, O we kpochapu gi n'elu ala.
16
Unu anwala Jehova, bú Chineke-unu, dika unu nwara Ya nime Masa.
17
Unu gējisi ike idebe ihe ahu nile nke Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, unu gēdebe kwa ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, nke O nyeworo gi n'iwu.
18
I gēme kwa ihe ziri ezi na nke di nma n'anya Jehova: ka o we diri gi nma, ka i we ba kwa, nweta ezi ala ahu, nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi inye ha,
19
ikwapu ndi-iro-gi nile n'iru gi, dika Jehova kwuworo.
20
Mb͕e nwa-gi gāju gi n'ọdi-n'iru, si, Gini bu isi ihe-àmà ndia, na ukpuru ndia, na ikpé ndia, nke Jehova, bú Chineke-ayi, nyeworo unu n'iwu?
21
i gāsi kwa nwa-gi, Ayi buru Fero ndi-orù n'Ijipt; Jehova we were aka di ike me ka ayi si n'Ijipt puta:
22
Jehova we tiyekwasi ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche, di uku jọ kwa njọ, n'aru Ijipt, na n'aru Fero, na n'aru ulo-ya nile, n'anya-ayi:
23
ọ bu kwa ayi ka O mere ka ayi si n'ebe ahu puta, ka O we me ka ayi ba nime, ka O we nye ayi ala ahu nke Ọ ṅuru nna-ayi-hà iyi inye ha.
24
Jehova we nye ayi iwu ime ukpuru ndia nile, itu egwu Jehova, bú Chineke-ayi, ka o we diri ayi nma ubọchi-ayi nile, ka O we debe ayi ndu, otú ọ di ta.
25
Ezi omume ka ọ gābu-kwa-ra ayi, mb͕e ayi gēlezi anya ime ihe a nile enyere n'iwu n'iru Jehova, bú Chineke-ayi, dika O nyere ayi iwu.
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 7 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34