bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Deuteronomy 14
Deuteronomy 14
Igbo 2006
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 15 →
1
Unu onwe-unu buru Jehova, bú Chineke-unu, umu: unu ebìla onwe-unu mma, unu eme-kwa-la isi-nkwọcha n'etiti anya-unu abua n'ihi onye nwuru anwu.
2
N'ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi, ọ bu kwa gi ka Jehova rọputaworo iburu Ya ihe nke aka Ya, kari ndi nile ndi nọ n'elu ala.
3
Erila ihe-árú ọ bula.
4
Ndia bu anumanu nke unu gēri: ehi, na aturu, na ewu,
5
na ele, na mb͕ada, na ob͕o-miri, na ewu ọhia, na atu, na anigọ, na uturu.
6
Anumanu ọ bula nke ukwu-ya wara njakpa, nke ukwu-ya wara-kwa-ra awara abua, nke nātaghari kwa ọnu, n'etiti anumanu, nke ahu ka unu gēri.
7
Otú ọ di, ndia ka unu nāgaghi-eri n'etiti ihe nātaghari ọnu, ma-ọbu n'etiti ndi ukwu-ha wara njakpa: camel, na hare, na coney, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ha bu, ma ha abughi ihe ukwu wara njakpa, ihe ruru árú ka ha buru unu:
8
ezì kwa, n'ihi na ihe ukwu-ya wara njakpa ka ọ bu, ma ọ bughi ihe nātaghari ọnu, ihe ruru árú ka ọ buru unu: unu erila ihe sitere n'anu-ha, unu emetu-kwa-la ozu-ha aka.
9
Ndia ka unu gēri n'etiti ihe nile nke di na miri: ihe ọ bula nke nwere ntù na akpilikpa ka unu gēri:
10
ma ihe ọ bula nke nēnweghi ntù na akpilikpa, unu erila ya; ihe-árú ka ọ buru unu.
11
Nnunu ọ bula nke di ọcha ka unu gēri.
12
Ma ndia bu nnunu unu agaghi-eri ihe sitere n'anu-ha: ugo, na ugo-agwọ, na ugo-azù;
13
na udele, na agu-nkwọ, na ndab͕u di iche iche;
14
na ugolo-ọma ọ bula di iche iche;
15
na enyi-nnunu, na eb͕e-abali, na nnunu oké osimiri, na eb͕e di iche iche;
16
na okwukwu ntà, na okwukwu uku, na okwukwu nwere mpi;
17
na okwolo, na udele, na cormorant;
18
na ub͕ala, na utù di iche iche, na hoopoe, na usu.
19
Anu-ufe ọ bula nke nēnuputa enuputa, ihe-árú ka ọ buru unu; agaghi-eri ha.
20
Anu-ufe ọ bula nke di ọcha ka unu gēri.
21
Unu erila ihe nwuru onwe-ya: ọ bu ọbìa nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula ka i gēnye ya, ka ọ we rie ya; ma-ọbu i gērenye ya onye ala ọzọ: n'ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi. Esila nwa-ewu nime miri-ara nke nne-ya.
22
I ghaghi inye otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-ọmume nile nke nkpuru-gi, bú ihe nke nēsi n'ubi-gi puta kwa-arọ.
23
I gēri kwa ihe n'iru Jehova, bú Chineke-gi, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-gi na nke ìgwè ewu na aturu-gi; ka i we muta itu egwu Jehova, bú Chineke-gi, ubọchi-gi nile.
24
Ma mb͕e uzọ ahu gādikari gi anya, i we ghara ipu ibū ya, n'ihi na ebe ahu dipuru anya n'ebe i nọ, bú ebe nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa itiye aha-Ya n'ebe ahu, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi:
25
i gēnye kwa ya n'ego, ke ego ahu n'aka-gi, jerue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa:
26
i gēnye kwa ego ahu n'ihe ọ bula nke agu ya nāgu nkpuru-obi-gi, n'ìgwè ehi, ma-ọbu n'ìgwè ewu na aturu, ma-ọbu na manya-vine, ma-ọbu n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, ma-ọbu n'ihe ọ bula nkpuru-obi-gi nāriọ n'aka-gi: i gēri kwa ihe n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ṅuri kwa ọṅu, gi onwe-gi na ulo-gi:
27
ma onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula, arapula ya; n'ihi na ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa o soro gi nwe.
28
N'ọgwugwu arọ atọ i gēweputa otù uzọ n'uzọ iri nile nke ihe-ọmume-gi n'otù arọ ahu, dọba kwa ya nime ọnu-uzọ-ama-gi nile:
29
onye Livai gābia kwa, (n'ihi na ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa o soro gi nwe), ya na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, ha gēri kwa ihe, afọ gēju kwa ha; ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi n'omume nile nke aka-gi nke i nēme.
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 15 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34