bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Deuteronomy 28
Deuteronomy 28
Igbo 2006
← Chapter 27
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 29 →
1
Ọ gēru kwa, ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu nke Jehova, bú Chineke-gi, ilezi anya ime ihe nile O nyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, na Jehova, bú Chineke-gi, gēme gi ka i kachasia mba nile nke uwa elu:
2
ngọzi ndia nile gābiakwasi kwa gi, we rue gi aru, mb͕e i gēge nti olu Jehova, bú Chineke-gi.
3
Onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu n'obodo, onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu kwa n'ọhia.
4
Ihe agọziri agọzi ka ọ gābu, bú nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, na nkpuru nke anu-ulo-gi, bú umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu gi.
5
Ihe agọziri agọzi ka abọ-gi na ihe-gi iji agwọ achicha gābu.
6
Onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu na nbata-gi, onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu kwa n'ọpupu-gi.
7
Jehova gēme ka etib͕ue n'iru gi ndi-iro-gi ndi nēbili imegide gi: n'otù uzọ ka ha gāpukuru gi, ma n'uzọ asa ka ha gāb͕alaga n'iru gi.
8
Jehova gēnye ngọzi-Ya iwu n'ebe i nọ n'ọba-gi nile, na nime nseti aka-gi nile; Ọ gāgọzi kwa gi n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.
9
Jehova gēme ka i guzosiere Ya ike ibu ndi nsọ, dika Ọ ṅuru gi iyi; mb͕e i gēdebe ihe nile Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, mb͕e i gēje kwa ije n'uzọ-Ya nile.
10
Ndi nile nke uwa gāhu kwa na ọ bu aha Jehova ka anākpọkwasi gi; ha gātu kwa egwu gi.
11
Jehova gēme kwa ka i babiga uba okè bayere ezi ihe, nime nkpuru nke afọ-gi, na nime nkpuru nke anu-ulo-gi, na nime nkpuru nke ala-ubi-gi, n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi.
12
Jehova gēmeghere gi ezi ulo-àkù-Ya, bú elu-igwe, inye miri-ozuzo nke ala-gi na mb͕e-ya, na igọzi omume nile nke aka-gi; i gēbinye kwa ọtutu mba ihe, ma gi onwe-gi agaghi-ebiri ihe.
13
Jehova gēme kwa gi isi, ọ bughi ọdudu; i gādi nání n'elu, i gaghi-adi kwa n'okpuru; mb͕e i gēge nti ihe nile Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, idebe na ime ha;
14
ma ewezugala onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe n'okwu nile ọ bula nke mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ijeso chi di iche iche ọzọ ifè ha òfùfè.
15
Ma ọ gēru, ọ buru na i geghi nti olu Jehova, bú Chineke-gi, ilezi anya ime ihe nile O nyere n'iwu na ukpuru-Ya nile nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta; na nkọcha nile ndia gābiakwasi gi, we rue gi aru.
16
Onye anābu ọnu ka i gābu n'obodo, onye anābu ọnu ka i gābu kwa n'ọhia.
17
Ihe anābu ọnu ka abọ-gi na ihe-gi iji gwọ achicha gābu.
18
Ihe anābu ọnu ka ọ gābu, bú nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi.
19
Onye anābu ọnu ka i gābu na nbata-gi, onye anābu ọnu ka i gābu kwa n'ọpupu-gi.
20
Jehova gēzikwasi gi ọbubu-ọnu, na ob͕ub͕a-aghara, na ibasi-nba-ike, nime nseti aka-gi nile nke i nēme, rue mb͕e agēkpochapu gi, ru kwa mb͕e i gāla n'iyì ngwa ngwa; n'ihi ihe ọjọ nke omume-gi nile nke i ji rapum.
21
Jehova gēme ka ajọ ọria nke nēfe efe rapara n'aru-gi, rue mb͕e Ọ gēme ka i gwupu n'elu ala ahu, ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.
22
Jehova gēwere ọtita-aru, were kwa aru-ọku, were kwa nruru-ọku, were kwa oké okpom-ọku, were kwa mma-agha, were kwa nchakpọ, were kwa ọmuma-ebù, tib͕ue gi; ha gāchu kwa gi rue mb͕e i gāla n'iyì.
23
Elu-igwe-gi nke di n'elu isi-gi gābu kwa ọla, ala nke di n'okpuru gi gābu kwa ígwè.
24
Jehova gēme ka miri-ozuzo nke ala-gi buru uzuzu na ájá: ọ gēsi n'elu-igwe dakwasi gi, rue mb͕e agēkpochapu gi.
25
Jehova gēme ka etib͕ue gi n'iru ndi-iro-gi: n'otù uzọ ka i gāpukuru ha, ma n'uzọ asa ka i gāb͕alaga n'iru ha: i gāghọ-kwa-ra ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.
26
Ozu-gi gābu-kwa-ra anu-ufe nile nke elu-igwe, bu-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri, onye-nchuli adighi kwa.
27
Jehova gēwere ihe-ofifi Ijipt, were kwa emerod, were kwa àb͕à, were kwa ọkọ, tib͕ue gi, nke anāpughi ime ka aru-gi di nma na ya.
28
Jehova gēwere ara-ọwiwi, were kwa ikpu-ìsì, were kwa ihe ngbu nke obi, tib͕ue gi:
29
i gāsọghari kwa ìsì n'etiti ehihie, dika onye-ìsì nāsọghari n'ọchichiri, i gaghi-eme kwa ka ije-gi ọ bula ga nke-ọma: i gābu kwa nání onye anēmeb͕u na onye anānapu ihe-ya n'ike ubọchi nile, onye-nzọputa adighi kwa.
30
I gēkwe nkwa ilu nwunye, ma ya na nwoke ọzọ gēdina: i gēwu ulo, ma i gaghi-ebi nime ya: i gāku ubi-vine, ma i gaghi-eme ka ọ pua na nsọ anāsọ ya.
31
Agēb͕u ehi-gi n'anya-gi, ma i gaghi-eri nime anu-ya: agānapu gi inyinya-ibu-gi n'iru gi, ma agaghi-eweghachiri gi ya: agēnye ndi-iro-gi ìgwè ewu na aturu-gi, ma i gaghi-enwe onye-nzọputa.
32
Agēnye ndi ọzọ umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ma anya-gi ganēle, we dala n'isi n'ichọ ha ogologo ubọchi nile: ma ọ dighi ihe gādiri ike aka-gi.
33
Nkpuru ala-ubi-gi na ndọb͕u-n'ọlu-gi nile ka otù ndi nke i nāmaghi gēri; ma i gābu nání onye anēmeb͕u emeb͕u na onye anāzọpia azọpia ubọchi-gi nile:
34
i we buru onye nāwi ara n'ihi ihe-ọhuhu anya-gi abua, nke i gāhu.
35
Jehova gēwere ihe-otiti ọjọ, nke anāpughi ime ka aru-gi di nma na ya, tie gi n'ikperè-ukwu-gi abua na n'ogwe-ukwu-gi abua, site n'ọbu-ukwu-gi we rue opu-n'isi-gi.
36
Jehova gēme ka gi na eze-gi, nke i gēguzo ka ọ buru eze-gi, jerue otù mba nke i nāmaghi, ma gi onwe-gi ma nna-gi-hà; i gēfè kwa chi di iche iche ọzọ n'ebe ahu, bú osisi na nkume.
37
I gāghọ kwa ihe-iju-anya, na ilu, na ihe-àkùkù, n'etiti ndi ahu nile ebe Jehova gēdu gi je.
38
I gēwere ọtutu nkpuru-ọghigha pua je n'ubi, ma ọ bu nwantī ka i gāchikọta; n'ihi na igurube gērichapu ya.
39
I gāku ubi-vine di iche iche, lu kwa ha, ma ọ dighi manya-vine i gāṅu, i gaghi-aghọ kọta kwa nkpuru-vine; n'ihi na ikpuru gēri ha.
40
I gēnwe osisi olive n'ókè-ala-gi nile, ma ọ dighi manu i gēte; n'ihi na nkpuru olive gi gādakwosi.
41
I gāmu umu-ndikom na umu-ndinyom, ma ha agaghi-abu nke gi; n'ihi na agādọta ha n'agha.
42
Osisi-gi nile na nkpuru ala-ubi-gi ka ndi ọzọ gēnweta.
43
Ọbìa ahu nke nọ n'etiti gi gārigo n'elu kari gi, nārigo, nārigo; ma gi onwe-gi ganārida ala ala.
44
Onye ahu gēbinye gi ihe, ma gi onwe-gi agaghi-ebinye ya: onye ahu gābu isi, ma gi onwe-gi gābu ọdùdù.
45
Ọbubu-ọnu nile ndia gābiakwasi gi, chu kwa gi, we rue gi aru, rue mb͕e agēkpochapu gi; n'ihi na i geghi nti olu Jehova, bú Chineke-gi, idebe ihe nile O nyere n'iwu na ukpuru-Ya nile nke O nyere gi n'iwu:
46
ha gādikwasi kwa gi ibu ihe-iriba-ama na ibu ihe-ebube, dikwasi kwa nkpuru-gi-rue mb͕e ebighi-ebi:
47
n'ihi na i fèghi Jehova, bú Chineke-gi, òfùfè n'ọṅu, na n'obi-utọ, n'ihi iba-uba nke ihe nile:
48
i gēfè kwa ndi-iro-gi, ndi Jehova gēzì megide gi, n'agu, na n'akpiri-ikpọ-nku, na n'ib͕a-ọtọ, na n'ukọ ihe nile: ọ gētiye kwa yoke ígwè n'olu-gi, rue mb͕e ọ gēkpochapu gi.
49
Jehova gēsi n'ebe di anya bulie otù mba imegide gi, site na nsọtu uwa, dika ugo si efe; bú mba nke i nānughi asusu-ya;
50
mba nke nwere iru di egwu, nke nāhughi okenye iru-ọma, nke nēmeghi kwa nwata amara:
51
ọ gēri kwa nkpuru nke anu-ulo-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, rue mb͕e agēkpochapu gi: ọ gaghi-ekwe kwa ka ọka, na manya-vine ọhu, na manu, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi, fọduru gi, rue mb͕e ọ gēme ka i la n'iyi.
52
Ọ gānọchigide kwa gi n'agha n'ọnu-uzọ-ama-gi nile, rue mb͕e mb͕idi-gi nile gāda, bú mb͕idi ahu di elu nke ewusi-kwa-ra ike, nke gi onwe-gi nātukwasi obi na ha, n'ala-gi nile: ọ gānọchigide kwa gi n'agha n'ọnu-uzọ-ama-gi nile n'ala-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.
53
I gēri kwa nkpuru nke afọ-gi, bú anu-aru umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ndi Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi; nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke ndi-iro-gi nākpab͕u gi.
54
Nwoke nke di nro n'etiti gi, nke di kwa pekepeke nke-uku, anya-ya gājọ njọ n'aru nwa-nne-ya, na n'aru nwunye nke obi-ya, na n'aru umu-ya fọduru nke ọ kwere ka ha fọdu:
55
ọ we ghara inye onye ọ bula nime ha ufọdu nime anu-aru umu-ya nri ọ ga-eri, n'ihi na ọ dighi ihe ọ bula fọduru ya; nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke onye-iro-gi nākpab͕u gi n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.
56
Nwanyi nke di nro n'etiti gi, nke di kwa pekepeke, nke nādighi-anwa iguzo ọbu-ukwu-ya n'ala n'ihi idi-pekepeke na n'ihi idi-nro, anya-ya gājọ njọ n'aru di nke obi-ya, na n'aru nwa-ya nwoke, na n'aru nwa-ya nwayi;
57
na n'aru ichi-ya nke nēsi apata ukwu-ya puta, na n'aru umu-ya nke ọ nāmu; n'ihi na ọ gēri ha na nzuzo n'ukọ ihe nile: nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke onye-iro-gi nākpab͕u gi n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.
58
Ọ buru na i lezighi anya ime okwu nile nke iwu a nke edeworo n'akwukwọ a, ka i we tua egwu aha nka nke di nsọpuru di kwa egwu, JEHOVA, bú CHINEKE-GI;
59
Jehova gēme kwa ka ihe-otiti-gi nile na ihe-otiti nile nke nkpuru-gi di ebube, ha gābu ihe-otiti uku, nke nānọgide kwa anọgide, na ọria ọjọ, nke nānọgide kwa anọgide.
60
Ọ gēme kwa ka nriaria nile nke Ijipt biaghachi n'aru gi, bu nke i turu ujọ; ha gārapara kwa n'aru gi.
61
Ọria ọ bula kwa, na ihe-otiti ọ bula, nke anēdeghi n'akwukwọ iwu a, ha ka Jehova gēme ka ha rigo n'aru gi, rue mb͕e agēkpochapu gi.
62
Unu gāfọdu kwa ndikom ole-na-ole, n'ebe unu diri ka kpakpando elu-igwe n'uba; n'ihi na i geghi nti olu Jehova, bú Chineke-gi.
63
Ọ gēru kwa, na dika obi tọrọ Jehova utọ n'aru unu ime unu nma, na ime ka unu ba uba; otú a ka obi gātọ Jehova utọ n'aru unu ime ka unu la n'iyì, na ikpochapu unu; ewe ropu unu n'elu ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.
64
Jehova gēme kwa ka i b͕asa n'etiti ndi nile, site n'otù nsọtu uwa we rue nsọtu uwa nke-ọzọ; i gēfè kwa chi di iche iche ọzọ òfùfè n'ebe ahu, nke i nāmaghi, ma gi onwe-gi ma nna-gi-hà, bú osisi na nkume.
65
Ma i gaghi-enwe atughi-ujọ n'etiti mba ndia, ọbu-ukwu-gi agaghi-enwe kwa izu-ike: ma Jehova gēnye gi n'ebe ahu obi nāma jijiji, na ndala-n'isi nke anya, na ọtita-aru nke nkpuru-obi:
66
ndu-gi ganākwu kwa èfè n'iru gi; i gātu kwa oké egwu abali na ehihie, i gaghi-eji kwa ndu-gi aka:
67
I gāsi n'ututu, Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ọ bu anyasi! i gāsi kwa n'anyasi, Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ọ bu ututu! n'ihi oké egwu nke obi-gi nke i gātu, na n'ihi ihe-ọhuhu anya-gi nke i gāhu.
68
Jehova gēme kwa ka i were ub͕ọ laghachi n'Ijipt, n'uzọ nke m'siri gi, I gaghi-ahu kwa ya ọzọ ma-ọli: unu gēwere kwa onwe-unu renye ndi-iro-unu n'ebe ahu ibu orù-ndikom na ibu ndinyom nēje ozi, ma onye-ọb͕ub͕a agaghi-adi.
← Chapter 27
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 29 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34