bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Deuteronomy 29
Deuteronomy 29
Igbo 2006
← Chapter 28
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 30 →
1
Ndia bu okwu ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Jehova nyere Moses n'iwu ka ya na umu Israel b͕a n'ala Moab, nāgughi ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Ya na ha b͕ara nime Horeb.
2
Moses we kpọ Israel nile òkù, si ha, Unu onwe-unu ahuwo ihe nile nke Jehova mere Fero, me kwa ndi-orù-ya nile, me kwa ala-ya nile, n'anya-unu n'ala Ijipt;
3
ọnwunwa uku nile nke anya-gi huru, ihe-iriba-ama nile, na ihe-ebube uku ahu nile:
4
ma Jehova enyeghi unu obi imara ama, na anya ihu ahu, na nti inu anu, rue ta.
5
Emewokwam ka unu je ije ọgu arọ abua n'ọzara: uwe-unu akapughi nká n'aru unu, akpukpọ-ukwu-gi akapughi nká n'ukwu-gi.
6
Ọ dighi achicha unu riworo, ọ dighi kwa manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya unu ṅuworo: ka unu we mara na mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
7
Unu we biarue ebe a, Saihon, bú eze Heshbon, na Og, bú eze Beshan, we puta izute ayi ibu agha, ayi we tib͕ue ha:
8
ayi we were ala-ha, were ya nye ndi Reuben, nye kwa ndi Gad, nye kwa nkera ebo Manase, n'ihe-nketa.
9
Debe-kwa-nu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, me kwa ha, ka unu we nwe uche n'ihe nile nke unu nēme.
10
Unu onwe-unu nēguzo ta, unu nile, n'iru Jehova, bú Chineke-unu; ndi-isi-unu, na ebo nile unu, na ndi-okenye-unu, na ndi-odozi-okwu-unu, bú nwoke ọ bula nke Israel,
11
umu-ntakiri-unu, na ndinyom-unu, na ọbìa-gi nke nọ n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-gi nile, site n'onye nāwa nkú-gi rue onye nēsere miri-gi:
12
ka i we gabiga ba n'ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-gi, na n'iṅu-iyi-Ya, nke gi na Jehova, bú Chineke-gi, nāb͕a ta:
13
ka O we me ka i guzosiere Ya ike ta ibu otù ndi, ka Ya onwe-ya we buru-kwa-ra gi Chineke, dika Ọ gwara gi, na dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob.
14
Ọ bughi kwa nání unu ka mu onwem nāb͕a ọb͕ub͕a-ndu a na iṅu-iyi a nye;
15
kama ọ bu onye nọ n'ebe a n'etiti ayi nēguzo ta n'iru Jehova, bú Chineke-ayi, ọ bu kwa onye nānọghi n'ebe a n'etiti ayi ta:
16
(n'ihi na unu onwe-unu mara otú ayi biri n'ala Ijipt; na otú ayi gabigara n'etiti mba nile nke unu gabigara agabiga;
17
unu ahuwo kwa ihe-árú nile ha, na arusi nile ha, bú osisi na nkume na ọla-ọcha na ọla-edo, nke di n'etiti ha:)
18
ka nwoke, ma-ọbu nwayi, ma-ọbu ab͕uru, ma-ọbu ebo, we ghara idi n'etiti unu, nke obi-ya nēchigharí pua ta n'ebe Jehova, bú Chineke-ayi, nọ, ije ifè chi nile nke mba ahu nile òfùfè; ka nkpọrọgwu nke nāmi ńsí na wormwood we ghara idi n'etiti unu;
19
o we rue, mb͕e ọ gānu okwu nile nke ọb͕ub͕a-iyi a, na ọ gāgọzi onwe-ya n'obi-ya, si, Udo ka m'gēnwe, ọ bu ezie na n'isi-ike nke obim ka m'nēje ije, ka m'we were iṅubiga-ihe-okè tukwasi n'akpiri-ikpọ-nku:
20
Jehova agaghi-ekwe ib͕aghara ya, kama mb͕e ahu iwe Jehova na ekworo-Ya gākwu anwuru-ọku imegide nwoke ahu, ọb͕ub͕a-iyi nile edeworo n'akwukwọ a gāmakpu kwa n'aru ya, Jehova gēhichapu kwa aha-ya n'okpuru elu-igwe.
21
Jehova gākpaputa kwa ya n'ebo nile nke Israel rue ihe ọjọ, dika ọb͕ub͕a-iyi nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke edeworo n'akwukwọ iwu a.
22
Ọb͕ọ ahu nke di n'iru, bú umu-unu ndi gēbili inọchi unu, na onye ala ọzọ nke gēsi n'ala di anya bia, gāsi, mb͕e ha nāhu ihe-otiti nile nke ala ahu, na ọria nile ya, nke Jehova jiworo me ka ọ nāria ọria;
23
mb͕e ha nāhu kwa na ala-ya nile bu brimstone, na nnú, na orire-ọku, na adighi-agha ya nkpuru, na ọ dighi-eme kwa ka ihe pue, na ọ dighi kwa ihe-ọkukú ọ bula nētolite nime ya, dika nkwatu Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, nke Jehova kwaturu n'iwe-Ya na n'ọnuma-Ya:
24
ọbuná mba nile ahu gāsi, N'ìhi gini ka Jehova meworo ala nka otú a? gini bu isi idi-ọku iwe uku a?
25
Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, nke Ya na ha b͕ara mb͕e O mere ka ha si n'ala Ijipt puta;
26
ha we je fè chi ọzọ òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ha, bú chi nke ha nāmaghi, nke Ọ nēkèghi n'òkè nye ha:
27
iwe Jehova we di ọku megide ala nka, ime ka nkọcha nile nke edeworo n'akwukwọ a biakwasi ya:
28
Jehova we ropu ha n'ala-ha n'iwe, na'ọnuma, na n'oké iwe, we tubà ha n'ala ọzọ, otú ọ di ta.
29
Ihe nile ezoro ezo diri Jehova, bú Chineke-ayi: ma ihe nile ekpughere ekpughe diri ayi, di-kwa-ra umu-ayi rue mb͕e ebighi-ebi, ka ayi we me okwu nile nke iwu a.
← Chapter 28
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 30 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34