bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Deuteronomy 26
Deuteronomy 26
Igbo 2006
← Chapter 25
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 27 →
1
Ọ gēru kwa, mb͕e i gābà n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi n'ihe-nketa, mb͕e i gēnweta kwa ya, we biri nime ya;
2
na i gēwere ufọdu nime nkpuru mbu nke nkpuru nile nke ala-ubi, nke i gēsi n'ala-gi nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi webata; i gētiye kwa ya n'abọ, jerue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu.
3
I gābiakute kwa onye-nchu-àjà nke gānọ na mb͕e ahu, si ya, Egosiwom Jehova, bú Chineke-gi, ta, na abatawom n'ala ahu nke Jehova ṅuru nna-ayi-hà iyi inye ayi.
4
Onye-nchu-àjà gānara abọ ahu n'aka-gi, dọba ya n'iru ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi.
5
I gāza kwa, si n'iru Jehova, bú Chineke-gi, Onye Siria nke nāla n'iyì ka nnam bu, o we rida n'Ijipt, nọ dika ọbìa n'ebe ahu, ya na ndikom ole-na-ole; o we ghọ mba n'ebe ahu, nke di uku, di kwa ike, ba kwa uba:
6
ndi Ijipt we mejọ ayi, weda ayi n'ala, tukwasi ayi òfùfè siri ike:
7
ayi we tikue Jehova, bú Chineke nke nna-ayi-hà, Jehova we nu olu-ayi, hu kwa nweda-n'ala-ayi, na ndọb͕u ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu, na nmeb͕u-ayi:
8
Jehova we were aka di ike, na ogwe-aka esetiri eseti, na egwu uku, na ihe-iriba-ama di iche iche, na ihe-ebube di iche iche, me ka ayi si n'Ijipt puta:
9
O we me ka ayi bata n'ebe a, O we nye ayi ala nka, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.
10
Ma ub͕u a, le, ewetawom nkpuru mbu nke nkpuru ala-ubi nke I nyeworom, Jehova. I gādọba kwa ya n'iru Jehova, bú Chineke-gi, kpọ isi ala n'iru Jehova, bú Chineke-gi:
11
i gāṅuri kwa ọṅu n'ezi ihe nile Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi, nye kwa ulo-gi, gi onwe-gi, na onye Livai, na ọbìa nke nọ n'etiti gi.
12
Mb͕e i gēnyebìwori otù uzọ n'uzọ iri nile nke ihe-ọmume-gi n'arọ nke-atọ, bú arọ nke inye otù uzọ n'uzọ iri, i gēnye kwa ya onye Livai, nye kwa ọbìa, nye kwa nwa-nb͕ei, nye kwa nwayi di-ya nwuru, ka ha we rie nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, afọ ewe ju ha;
13
i gāsi kwa n'iru Jehova, bú Chineke-gi, Ekpochapuwom ihe nsọ ahu n'ulom, ọzọ kwa, enyewom ya ndi Livai, nye kwa ọbìa, nye kwa nwa-nb͕ei, nye kwa nwayi di-ya nwuru, dika ihe nile I nyere n'iwu si di nke I nyerem n'iwu: agabigaghm ihe nile I nyere n'iwu, echezọghkwam:
14
erighm ihe sitere na ya n'iru-újúm, ekpochapughkwam ihe sitere na ya n'adighi-ọcha, enyeghkwam ihe sitere na ya bayere onye nwuru anwu: egewom nti olu Jehova, bú Chinekem, emewom dika ihe nile si di nke I nyeworom n'iwu.
15
Si n'ebe-obibi nsọ Gi, si n'elu-igwe, le anya, gọzie ndi-Gi, bú Israel, na ala-ubi ahu nke I nyeworo ayi, dika I ṅuru nna-ayi-hà iyi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.
16
Ubọchi ta ka Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi iwu ime ukpuru ndia na ikpé ndia: i gēwere kwa obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, debe ha, me kwa ha.
17
Jehova ka i meworo ka Ọ si ta na Ọ gāburu gi Chineke, na i gēje kwa ije n'uzọ-Ya nile, debe kwa ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile, ge kwa nti olu-Ya:
18
Jehova emewo kwa ka i si ta na i gāburu Ya ndi nke aka Ya, dika Ọ gwaworo gi okwu, na i gēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu;
19
na Ọ gēme kwa gi ka i kachasia mba nile O meworo elu, ibu otuto, ibu kwa aha, ibu kwa ihe mara nma; ka i we buru-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ndi nsọ, dika O kwuworo.
← Chapter 25
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 27 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
Recommended Reading
Commentary
Deuteronomy Commentaries
→
Devotional
Deuteronomy Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→