bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Deuteronomy 30
Deuteronomy 30
Igbo 2006
← Chapter 29
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 31 →
1
Ọ gēru kwa, mb͕e ihe ndia nile gābiakwasi gi, bú ngọzi ahu na nkọcha ahu nke m'tiyeworo n'iru gi, mb͕e i gēme kwa ka ha biaghachi n'obi-gi n'etiti mba nile, ebe Jehova, bú Chineke-gi, nupuworo gi,
2
mb͕e i gēwere kwa obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile laghachikuru Jehova, bú Chineke-gi, ge kwa nti olu-Ya dika ihe nile si di nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, gi onwe-gi na umu-gi;
3
na Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka ndi-gi adọtara n'agha lata, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru gi, laghachi, chikọputa gi nime ndi ahu nile, ebe Jehova, bú Chineke-gi, meworo ka i b͕asa.
4
Ọ buru na onye nke gi enupuru enupu anọ na nsọtu elu-igwe, n'ebe ahu ka Jehova, bú Chineke-gi, gāchikọputa gi, n'ebe ahu ka Ọ gēweputa kwa gi.
5
Jehova, bú Chineke-gi, gēme kwa ka i ba n'ala ahu nke nna-gi-hà nwetara, i gēnweta kwa ya; Ọ gēme kwa gi nma, me kwa ka i ba uba kari nna-gi-hà.
6
Jehova, bú Chineke-gi, gēbì kwa n'obi-gi, na obi nkpuru-gi, úgwù, iwere obi-gi nile, na iwere nkpuru-obi-gi nile, hu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, ka i we di ndu.
7
Jehova, bú Chineke-gi, gētiyekwasi ọb͕ub͕a-iyi ndia nile n'isi ndi-iro-gi, na n'isi ndi nākpọ gi asì, ndi churu gi.
8
Gi onwe-gi gālaghachi kwa, ge nti olu Jehova, me ihe nile O nyere n'iwu, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta.
9
Jehova, bú Chineke-gi, gēme kwa ka i babiga uba okè n'omume nile nke aka-gi, nime nkpuru nke afọ-gi, na nime nkpuru nke anu-ulo-gi, na nime nkpuru nke ala-ubi-gi, bayere ezi ihe: n'ihi na obi gātọ kwa Jehova utọ ọzọ n'aru gi ime gi nma, dika obi tọrọ Ya utọ n'aru nna-gi-hà:
10
mb͕e i gēge nti olu Jehova, bú Chineke-gi, idebe ihe nile O nyere n'iwu na ukpuru-Ya nile nke edeworo n'akwukwọ iwu a; mb͕e i were obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, chigharikute Jehova, bú Chineke-gi.
11
N'ihi na ihe a enyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi 'niwu ta, ọ bughi ihe kariri gi ime ka ọ bu, ọ bughi kwa ihe diri gi anya ka ọ bu.
12
Ọ dighi n'elu-igwe, ka i we si, Ònye gārigoro ayi n'elu-igwe, wetara ayi ya, me ka ayi nuru ya, ka ayi we me ya?
13
Ọ dighi kwa n'ofè oké osimiri, ka i we si, Ònye gāgabigara ayi n'ofè oké osimiri, wetara ayi ya, me ka ayi nuru ya, ka ayi we me ya?
14
Kama okwu ahu di gi ezi nso, n'ọnu-gi, na n'obi-gi, ka i we me ya.
15
Le, etiyewom n'iru gi ta ndu na ezi ihe, na ọnwu na ihe ọjọ;
16
n'ihi na mu onwem nēnye gi iwu ta ihu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, na ije ije n'uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, na ukpuru-Ya nile, na ikpé-Ya nile, ka i we di ndu, ba kwa uba, ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzi kwa gi n'ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.
17
Ma ọ buru na obi-gi echigharia, i we ghara inu anu, kama eduhie gi, we kpọ isi ala nye chi ọzọ, we fè ha òfùfè;
18
egosiwom unu ta, na unu aghaghi ila n'iyì; unu agaghi-eme ka ubọchi-unu di anya n'elu ala ahu, ebe gi onwe-gi nāgabiga Jọdan ibà ka i nweta ya.
19
Emewom ka elu-igwe na ala b͕a àmà megide unu ta, na ọ bu ndu na ọnwu, ngọzi ahu na nkọcha ahu, ka m'tiyeworo n'iru gi: gi rọrọ kwa ndu, ka i we di ndu, gi onwe-gi na nkpuru-gi:
20
ihu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, na ige nti olu-Ya, na irapara n'aru Ya: n'ihi na Ya onwe-ya bu ndu-gi, na ogologo nke ubọchi-gi: ka i we biri n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob, inye ha.
← Chapter 29
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 31 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34