bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Deuteronomy 2
Deuteronomy 2
Igbo 2006
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 3 →
1
Ayi we che iru, bulie ije ba n'ọzara n'uzọ Oké Osimiri Uhie, dika Jehova gwaram okwu: ayi we je ugwu Sia buruburu ọtutu ubọchi.
2
Jehova we gwam okwu, si,
3
O zuworo unu, bú ije ugwu a buruburu: chenu iru n'Ugwu n'onwe-unu.
4
Gi nye kwa ndim iwu, si, Unu onwe-unu nāgabiga n'ókè-ala umu-nne-unu, bú umu Isọ, ndi bi na Sia; ha gātu kwa egwu unu: ma unu gēlezi onwe-unu anya nke-uku:
5
unu alusola ha ọ̀gù; n'ihi na M'gaghi-enye unu ala sitere n'ala-ha, ọbuná rue ebe nzọkwasi ọbu-ukwu-unu: n'ihi na ọ bu Isọ ka M'nyeworo ugwu Sia, ka ọ buru ihe-nnweta.
6
Unu gēwere ego zuru ihe-oriri n'aka-ha, ka unu we rie; ọzọ kwa, unu gēwere ego zuru miri n'aka-ha, ka unu we ṅua.
7
N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, agọziwo gi n'omume aka-gi nile: Ọ mawo ije-ije-gi n'ọzara uku a: ọgu arọ abua ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi; ọ dighi ihe kọrọ gi.
8
Ayi we si n'ala umu-nne-ayi, bú umu Isọ, ndi bi na Sia, gabiga, site n'uzọ Araba, site n'Ilat, site kwa n'Ezion-geba. Ayi we che iru, gabiga n'uzọ ọzara Moab.
9
Jehova we sim, Akpab͕ula Moab, aluso-kwa-la ha ọ̀gù n'agha: n'ihi na M'gaghi-enye gi ala sitere n'ala-ya ibu ihe-nnweta; n'ihi na umu Lot ka M'nyeworo ya ka ọ buru ihe-nnweta.
10
(Imim biri nime ya na mb͕e gara aga, ndi di uku, di kwa ọtutu, di kwa ogologo, dika ndi Anak;
11
Refaim ka anāgu kwa ndia, dika ndi Anak; ma ndi Moab nākpọ ha Imim.
12
Ọ bu kwa na Sia ka ndi Hoa bi na mb͕e gara aga, ma umu Isọ napuru ha ala-ha; ha we kpochapu ha n'iru ha, bichie n'ọnọdu ha; dika umu Israel mere ala nke ihe-nnweta-ya, nke Jehova nyere ha.)
13
Ub͕u a, bilienu, gabiga miri-iyi Zered n'onwe-unu. Ayi we gabiga miri-iyi Zered.
14
Ubọchi nile nke ayi siri na Kedesh-banea je ije, rue mb͕e ayi gabigara miri-iyi Zered, di orú arọ na iri na asatọ; rue mb͕e ọb͕ọ nile nke ndikom agha si n'etiti ọmuma-ulo-ikwū gwusia, dika Jehova ṅuru ha iyi.
15
Ọzọ kwa, aka Jehova digidere ha, ikpochapu ha n'etiti ọmuma-ulo-ikwū, rue mb͕e emere ka ha gwusia.
16
Ọ we rue, mb͕e ndikom agha ahu nile nwupusiri n'etiti ndi Israel,
17
na Jehova gwaram okwu, si,
18
Gi onwe-gi nāgabiga ya, bu ókè-ala Moab, ta:
19
ma mb͕e i nābiaru nso ncherita-iru umu Amon, akpab͕ula ha, aluso-kwa-la ha ọ̀gù: n'ihi na M'gaghi-enye gi ala sitere n'ala umu Amon ka ọ buru ihe-nnweta: n'ihi na umu Lot ka M'nyeworo ya ibu ihe-nnweta.
20
(Ala Refaim ka agu-kwa-ra nke ahu: Refaim biri nime ya na mb͕e gara aga; ma ndi Amon nākpọ ha Zamzumim;
21
ndi di uku, di kwa ọtutu, di kwa ogologo, dika ndi Anak; ma Jehova kpochapuru ha n'iru ha; ha we napu ha ala-ha, bichie n'ọnọdu ha:
22
dika ihe O mere nye umu Isọ, ndi bi na Sia, mb͕e o kpochapuru ndi Hoa n'iru ha; ha we napu ha ala-ha, bichie n'ọnọdu ha rue ta:
23
ma Avim ndi bi n'obodo ntà rue Geza, Kaftorim, ndi si na Kaftoa puta, kpochapuru ha, bichie n'ọnọdu ha.)
24
Bilienu, bulie ije, gabiga ndagwurugwu Anon: le, enyewom Saihon onye-Amorait, bú eze Heshbon, na ala-ya, n'aka-gi: malite inweta ya, luso kwa ya ọ̀gù n'agha:
25
Ta ka M'gāmalite itiyekwasi ujọ-gi na egwu-gi n'iru ndi nile n'okpuru elu-igwe nile, ndi gānu akukọ-gi, ma kwa jijiji, ọ gēb͕u kwa ha nb͕u n'ihi unu.
26
M'we si n'ọzara Kedimot zigara Saihon, bú eze Heshbon, ndi-ozi izì okwu udo, si,
27
Ka m'gabiga n'ala-gi: n'uzọ n'uzọ ka m'ganēje, m'gaghi-ewezuga onwem n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe.
28
N'ego ka i gērenyem ihe-oriri, ka m'we rie; n'ego ka i gēnyekwam miri, ka m'we ṅua: nání kwe ka m'gabiga n'ukwum;
29
dika umu Isọ ndi bi na Sia, na ndi Moab ndi bi na ya merem; rue mb͕e m'gāgabiga Jọdan, ba n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-ayi, nēnye ayi.
30
Ma Saihon, bú eze Heshbon, achọghi ka ayi gabiga n'ala-ya: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, mere mọ-ya ka ọ di ike, b͕a kwa obi-ya ume, ka O we nye ya n'aka-gi, otú ọ di ta.
31
Jehova we sim, Le, amalitewom irara Saihon na ala-ya nye n'iru gi: malite inweta, ka i we nweta ala-ya.
32
Saihon we puta izute ayi, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha, rue Jehaz.
33
Jehova, bú Chineke-ayi, we rara ya nye n'iru ayi, ayi we tib͕ue ya, na umu-ya ndikom, na ndi-ya nile.
34
Ayi we were obodo-ya nile na mb͕e ahu, wezuga obodo ndikom ọ bula, ya na ndinyom na umu-ntakiri, ka ebibie ha; ọ dighi onye fọduru ayi rapuru:
35
nání anu-ulo ka ayi lutara n'agha n'onwe-ayi, ha na ihe-nkwata obodo nile nke ayi were.
36
Site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo ahu nke di na ndagwurugwu ahu, we rue Gilead, ọ dighi obodo nke kariri ayi elu: ihe nile ka Jehova, bú Chineke-ayi, rara nye n'iru ayi:
37
nání, i biarughi nso ala umu Amon; akuku nile nke miri-iyi Jabok, na obodo nile nke ugwu, na ebe ọ bula Jehova, bú Chineke-ayi, nyere ayi iwu bayere ya.
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34