bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
2 Corinthians 1
2 Corinthians 1
Igbo 1988
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 2 →
1
Akwụkwọ ozi a sitere nꞌaka m Pọl onye Chineke họpụtara ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst na site nꞌaka nwanna anyị bụ Timoti. Ọ bụ unu ndị chọọchị Chineke dị na Kọrint ka anyị na-edere akwụkwọ a, na ụmụ Chineke nile nọ na Griis.
2
Ka amara na udo na-esite nꞌebe Chineke Nna anyị, na nꞌebe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ, dịrị unu.
3
Ka anyị nye Chineke Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele nꞌihi na ọ bụ Nna nke obi ebere, bụrụkwa Chineke onye inyeaka anyị na-esite nꞌaka ya abịa.
4
Ọ na-enyere anyị aka nꞌime nsogbu anyị nile, ka anyị site nꞌụzọ dị otu a nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na nsogbu dị iche iche aka. Inyere ha aka dị ka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nꞌaka Chineke.
5
Nꞌihi na dị ka anyị si eketa oke nꞌime ọtụtụ ahụhụ nke Kraịst, otu a ka Chineke si na-akasị anyị obi nꞌime Kraịst.
6
Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ ka a kasie unu obi, na ka a zọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, e sikwa ụzọ dị otu a enyere unu aka, nꞌihi na a na-enye unu ike na ume iji ntachi obi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa.
7
Anyị nwere olileanya na ọ bụrụ na unu enwee nsogbu dị ka anyị nwere, Chineke ga-akasị unu obi, ma nyekwara unu aka dị ka o si nyere anyị aka nꞌime nsogbu anyị.
8
Anyị chọrọ ka unu mara ụmụnna m, ihe banyere nsogbu e sogburu anyị nꞌEsia. Nꞌezie, nsogbu ahụ karịrị anyị ike, mee ka anyị hapụ inwekwa olileanya na anyị ga-emesị dịrị ndụ.
9
Ee, ọ dị nnọọ nꞌoge ahụ, dị ka a ga-asị na a mara anyị ikpe ọnwụ. Ma anyị maara na o si otu a mee ka anyị nwee ike ịmụta na o kwesịghị ka anyị tụkwasị obi nꞌike nke aka anyị, kama ka anyị nwee olileanya nꞌime Chineke, onye pụrụ ime ka ndị nwụrụ anwụ si nꞌọnwụ bilie.
10
Ọ bụ Chineke bụ onye dọpụtara anyị site nꞌime oke ọnwụ dị otu a. Ọ bụ Chineke ga-adọpụtakwa anyị nꞌoge dị nꞌihu. Anyị nwekwara ntụkwasị obi na ọ ga-aga nꞌihu na-adọpụtakwa anyị.
11
Ma unu onwe unu nwere ike inyere anyị aka site nꞌikpere anyị ekpere. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ anọgide na-ekpere anyị ekpere, ọtụtụ mmadụ ga-ekelekwa Chineke ekele nꞌihi ngọzi ọ na-agọzi anyị na nꞌihi nchebe ọ na-echebe ndụ anyị.
12
Nꞌihi na otu ihe anyị ji na-anya isi, nke akọnuche anyị na-agwakwa anyị na ọ bụ eziokwu, bụ na mmeso anyị na-emeso ndị ọzọ, karịsịa mmeso anyị na-emeso unu, bụ mmeso nke obi ịdị ọcha na ikwu eziokwu site na ndabere anyị nꞌime Onyenwe anyị. Anyị emeghị nke a site nꞌamamihe ụwa a, kama site nꞌamara Chineke.
13
Anyị na-edere unu nanị ihe anyị maara na unu nwere ike ịgụ ma ghọtakwa. Mgbe anyị na-edere unu akwụkwọ anyị, ọ dịghị ihe zoro ezo ọzọ anyị dere, bụ nke anyị na-achọghị ka unu ghọta.
14
Ọ bụ ezie na unu amaghị anyị nke ọma ugbu a, ma enwere m olileanya na ụbọchị ahụ Onyenwe anyị Jisọs ga-abịa ọzọ, anyị ga-abụ ihe unu ga-eji nyaa isi, dị ka unu onwe unu ga-esi bụrụkwa ihe anyị ga-eji nyaa isi.
15
Ọ bụ nꞌihi ntụkwasị obi m nwere na unu ga-aghọta, ka m ji zubekwa na mbụ ịbịakwute unu.
16
Ebu m ya nꞌobi na m ga-akwụsị hụ unu mgbe m na-agafe ịga Masidonia. Ebukwa m ya nꞌobi na mgbe m si Masidonia na-alaghachi na m ga-akwụsịkwa ileta unu, ka m si otu a bụrụ ngọzi nye unu ugboro abụọ, ka unu nweekwa ike inyere anyị aka mgbe anyị bidoro ịlaghachi Judia.
17
Ùnu chere na mgbe m zubere ime nke a, na ihe m zubere ime edoghị m anya? Ka ùnu chere na mgbe m zubere nke a, na m zubere ime ya dị ka onye ụwa, nke na-asị, ee, mgbe ihe o bu nꞌobi bụ é,è?
18
Mbaa! Dị ka Chineke si bụrụ onye kwesịrị ntụkwasị obi, abụghị m onye na-ekwu otu ihe mee ihe ọzọ. Nꞌihi na ee m bụ ee! Ọ dịghị m, bụkwa ọ dịghị.
19
Nꞌihi na Jisọs Kraịst Ọkpara Chineke, onye e sitere nꞌọnụ Sailas na Timoti na mụ onwe m bụ Pọl kwusaa abụghị onye na-asị ee, mgbe ihe o bu nꞌobi bụ ọ dịghị, kama Kraịst bụ onye na-eme ihe o kwuru.
20
Nꞌihi na nkwa nile Chineke kwere mezuru nꞌime Jisọs Kraịst. Ọ bụ nꞌihi nke a ka anyị ji na-enye Chineke otuto a site nꞌaha Jisọs Kraịst.
21
Ọ bụ Chineke nꞌonwe ya mere ka anyị na unu guzosie ike nꞌime Kraịst. O meela ka anyị bụrụ ndị e doro iche nye ya.
22
Chineke akakwasịla anyị akara ya igosi na anyị bụ ndị nke ya. O nyekwala anyị Mmụọ Nsọ ya nꞌime obi anyị dị ka ihe akaebe na anyị ga-anata ihe nile o zubere inye anyị.
23
Chineke bụ onye akaebe m, nꞌihi na ọ maara obi m, ọ maara na ekpebiri m ịhapụ ịbịa Kọrint nꞌihi na achọghị m ime ka obi jọọ unu njọ site na mba nke m bu nꞌobi ịbara unu.
24
Ọbịbịa m ga-abịa abụghị ka m gwa unu ihe unu na-aghaghị ikwere, nꞌihi na okwukwe unu siri ike. Kama, ihe m chọrọ bụ ime ka ọṅụ unu dịwanye ukwuu.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13